Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Ihe M Ga-eme Ka Ihe Na-adabara Mụ na Onye Nkụzi Anyị Kpọrọ M Asị?

Olee Ihe M Ga-eme Ka Ihe Na-adabara Mụ na Onye Nkụzi Anyị Kpọrọ M Asị?

Buru ụzọ chebara ya echiche!

Chebara ihe mere Rachel echiche. Ọ na-agba onye mbụ ma ọ bụ onye abụọ n’ule. Ma mgbe ọ gafere na klas ọzọ, ihe gbanwere. Rachel kwuru, sị: “Onye nkụzi anyị mere ihe niile o nwere ike ime ka m daa n’ule.” Gịnị mere onye nkụzi ha ji mee ka ọ daa n’ule? Onye nkụzi ahụ gwara Rachel na mama ya hoo haa na ya kpọrọ okpukpe ha asị.

Ị chọọ ịgafe ebe mmiri juru, ịzọ ụkwụ na nkume ndị dị n’ebe ahụ ga-enyere gị aka. Otú ahụ ka ndị nkụzi ga-enyere gị aka ịmụta ihe ma i mee ihe i kwesịrị ime

Olee ihe mechara mee? Rachel kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla onye nkụzi anyị kwadara m n’ule n’ihi na ọ kpọrọ okpukpe anyị asị, mama m na-eso m aga akwụkwọ ka ọ jụọ ya ihe mere. O mechara kwụsị ịkwada m n’ule.

Ọ bụrụ na onye nkụzi unu na-eme gị ụdị ihe a, kọọrọ ya papa gị na mama gị. O doro anya na ha ga-achọ ka ha na onye nkụzi ahụ ma ọ bụ onyeisi ụlọ akwụkwọ unu kwurịta ya ka e nwee ike ịkwụsị ihe ahụ onye nkụzi unu na-eme gị.

Nke bụ́ eziokwu bụ na o nwere ike onye nkụzi ahụ agaghị akwụsịcha ihe ahụ ọ na-eme gị. Mgbe ụfọdụ, naanị ihe i nwere ike ime bụ idi ihe ahụ ọ na-eme gị. (Ndị Rom 12:17, 18) Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tanya kwuru, sị: “Otu onye nkụzi anyị na-emesi anyị ike. Ọ na-akparịkarị anyị, na-akpọkwa anyị ndị iberiibe. Ná mmalite, ihe ahụ ọ na-agwa anyị na-eme ka m bewe ákwá. Ma emechara m mee ka okwu ọjọọ ahụ ọ na-agwa anyị ghara ịna-ewute m. Ihe m mere bụ na a gụsiri akwụkwọ ike ma gee ntị nke ọma mgbe ọ na-akụziri anyị ihe. Nke a mere ka okwu ọjọọ ahụ ọ na-agwa anyị ghara ịna-ewute m. Esokwa m na mmadụ ole na ole mere nke ọma n’ule ya. Mgbe afọ abụọ gachara, a chụrụ ya n’ọrụ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na i kwesịrị ịgbalị mụta idi nsogbu onye nkụzi unu na-enye gị. Ọ ga-abara gị uru ma ọ bụrụ na onye ị ga-arụrụ ọrụ mgbe ị gụchara akwụkwọ enyewe gị ụdị nsogbu ahụ. (1 Pita 2:18) I mechaakwa nwee ezigbo ndị nkụzi, ọ ga-eme ka i jiri ha kpọrọ ihe.