Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?—Agba nke Mbụ: Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?

È Nwere Onye Kere Ihe Niile Ka Ọ̀ Bụ na E Nweghị?—Agba nke Mbụ: Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?

 È nwere Onye kere ihe niile ka ọ̀ bụ na e nweghị?

Ì kweere na Chineke kere ihe niile? Ọ bụrụ na i kweere, mara na i so n’ọtụtụ ndị kweere na Chineke dị. Ma e nwekwara ndị na-asị na o nweghị Onye Okike.

Ị̀ ma na ụfọdụ ndị sị́ na ha kweere na Chineke dị anaghị akọwali ihe mere ha ji kwere, ndị nke na-ekweghị na ọ dị anaghịkwa akọwali ihe mere ha ekweghị?

  • Ụfọdụ ndị mmadụ kweere na e kere ihe niile eke naanị n’ihi na ọ bụ ihe a kụziiri ha na chọọchị.

  • Ọtụtụ ndị mmadụ kweere na o nweghị onye kere ihe niile naanị n’ihi na ọ bụ ihe a kụziiri ha n’ụlọ akwụkwọ.

Isiokwu ndị ga-eleba anya n’okwu a ga-eme ka obi sie gị ike na e nwere Onye kere ihe niile. Ha ga-enyekwara gị aka ịma otú ị ga-esi akọwara ya ndị ọzọ. Ma, ajụjụ dị́ ezigbo mkpa i kwesịrị ịjụ onwe gị bụ:

 Gịnị mere m ji kwere na Chineke dị?

Gịnị mere ị ga-eji jụọ onwe gị ajụjụ a? Ọ bụ n’ihi na Baịbụl gwara gị ka i jiri ‘ike iche echiche gị’ chọpụta ihe bụ́ eziokwu. (Ndị Rom 12:1) Ọ pụtara na ihe mere ị ga-eji kwere na Chineke dị agaghị abụ naanị na

  • ọ bụ ihe obi gị gwara gị (Obi gị na-agwa gị na a ga-enwerịrị onye kacha ihe niile)

  • ọ bụ ihe ndị ọzọ kweere (Ndị niile bí n’ebe i bi kweere na Chineke dị)

  • ị chọghị ịgbapụ iche (Ndị mụrụ gị gwara gị ka i kwere na Chineke dị, ma ọ́ bụghị ya, ụlọ agaghị aba gị na ha)

Kama, i kwesịrị inwe ezigbo ihe mere i ji kwere na Chineke dị.

Ajụjụ bụzi, gịnị mere i ji kwere na Chineke dị? I mee ihe niile a sị gị mee n’isiokwu bụ́ “Olee Ihe Mere Ị Ga-eji Kwere na Chineke Dị?,” nke dị́ n’akwụkwọ a na-akpọ Akwụkwọ Ị Ga-eji Edetu Ihe, obi ga-esikwu gị ike na Chineke dị. Ihe ndị na-eto eto ibe gị ndị ọzọ kwuru n’isiokwu a ga-enyekwara gị aka.

“Mgbe ọ bụla onye nkụzi anyị na-akụziri anyị gbasara otú ahụ́ mmadụ si arụ ọrụ, obi na-esikwu m ike na Chineke dị. Ihe ọ bụla dị anyị n’ahụ́ nwere ihe ọ na-arụ. Ọtụtụ mgbe, anyị anaghịdị ama mgbe ha na-arụ ihe ndị ha na-arụ. Otú e si mee ahụ́ mmadụ dị nnọọ ịtụnanya.”—Teresa.

“Ọ na-abụ m hụ ọmarịcha ụlọ elu dị́ ezigbo ogologo, ọmarịcha ụgbọ mmiri, ma ọ bụ ụgbọala, mụ ajụọ onwe m, sị, ‘Ònye rụrụ ihe a?’ Ama m na ọ bụ naanị ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ ga-emepụtali ụgbọala n’ihi na e nwere ọtụtụ irighiri ihe a na-ejikọta ọnụ tupu ụgbọala ebido rụwa ọrụ. Ebe ọ bụ na e nwere onye mepụtara ụgbọala, e nwekwara onye kere mmadụ.”—Richard.

“Ị mata na o were ndị ọkachamara ọtụtụ narị afọ tupu ha amata ntakịrị ihe ha matara gbasara ihe ndị dị n’ụwa na mbara igwe, ị ga-ekweta na onye sị na ihe ndị ahụ nọkatara dịwa echeghị echiche nke ọma kwuo ya.”—Karen.

“Ka m na-amụkwu sayensị, m bịara na-aghọtakwu na e kere mmadụ eke. Dị ka ihe atụ, m bịara na-ahụ otú ihe niile gbasara ihe ndị dị ndụ si aga n’anya ya n’anya ya, otú anyị bụ́ mmadụ si pụọ iche, otú o si agụ anyị agụụ ịmata ọtụtụ ihe gbasara ụmụ mmadụ, otú anyị si bido dịwa, nakwa ebe anyị na-aga ma anyị nwụọ. Ndị na-ekwu na e keghị ihe eke na-agbalị ịkọwa otú ụmụ anụmanụ si malite ịdị, ma ha enwebeghị ike ịkọwa ihe mere ụmụ mmadụ ji pụọ iche. M ga-asị na e nweghị ezigbo ihe mmadụ ga-eji maka ya kwere na e nweghị Onye Okike, ma e nwere ọtụtụ ihe ga-eme ka mmadụ kwere na e nwere Onye Okike.”—Anthony.

 Otú m ga-esi akọwara mmadụ ihe m kweere

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ụmụ klas unu na-achị gị ọchị na i kweere n’ihe ị na-enweghị ike ịhụ anya? Oleekwa ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ha asị na sayensị ekwuola ihe gosiri na e nweghị Onye Okike?

Burugodị ụzọ mee ka obi sie gị ike na ihe i kweere ziri ezi. Atụkwala ụjọ ma ọ bụ mewe ihere. (Ndị Rom 1:16) A sịdị kwuwe:

  1. Ọ bụghị naanị gị kweere na Chineke dị; ọtụtụ ndị kweere na ọ dị, ma ndị gụrụ oké akwụkwọ, ma ndị ọkachamara. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị sayensị kweere na Chineke dị.

  2. Ụfọdụ ndị na-ekwu na Chineke adịghị n’ihi na ha aghọtaghị ụdị onye ọ bụ. Kama ha ga-ekwu ezigbo ihe mere ha ji chee na Chineke adịghị, ha ana-ekwu na “Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere o ji hapụ ka anyị na-ata ahụhụ?” Ha anaghị agba mbọ ịchọpụta nke bụ́ eziokwu n’okwu a, kama, ha na-ekwu naanị otú ọ dị ha n’obi.

  3. Ọ na-agụ ụmụ mmadụ agụụ igbo “mkpa ime mmụọ” ha. (Matiu 5:3) Ọ na-agụ anyị agụụ ikwere na Chineke dị. Ọ bụrụzie na mmadụ asị na Chineke adịghị, ọ bụghị gịnwa kwesịrị ikwu ihe mere onye ahụ ji kwuo otú ahụ. Ọ bụ onye ahụ kwesịrị ikwu ya.Ndị Rom 1:18-20.

  4. Onye ma ihe na-ekwere na Chineke dị. Otu ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ na a chọpụtala na ihe ọ bụla dị ndụ nwere ihe mere ka ọ dịrị ndụ. O nweghịkwa ihe ọ bụla gosiri na ihe na-adịghị ndụ nwere ike ime ka ihe dịrị ndụ.

Gịnịzi ka ị ga-agwa onye sị na i kwesịghị ikwere na Chineke dị? Lekwa ihe ụfọdụ i nwere ike ịgwa ya.

Ọ bụrụ na mmadụ asị gị: “Ọ bụ naanị ndị itibọrịbọ na-ekwere na Chineke dị.”

I nwere ike ịgwa onye ahụ, sị: “Amaghị m na ị ga-ekweta ụdị ihe a. Mụnwa ekweghị. N’otu nchọpụta e mere, a jụrụ ndị prọfesọ karịrị otu puku na narị isii na-akụzi sayensị na mahadum ndị a ma ama ma hà kweere na Chineke dị? Ihe karịrị narị ise na iri atọ kwuru na ha kweere na Chineke dị. * Ị̀ ga-asị na ndị prọfesọ ndị ahụ bụ ndị itibọrịbọ naanị maka na ha kweere na Chineke dị?”

Ọ bụrụ na mmadụ asị gị: “Ọ bụrụ na Chineke dị, gịnị mere ndị mmadụ ji na-ata ahụhụ ebe niile n’ụwa?”

I nwere ike ịgwa onye ahụ, sị: “Ọ ga-abụ na ihe ị na-ekwu bụ na ị ghọtaghị otú Chineke si eme ihe ya, ma ọ bụkwanụ na i cheghị na o kwesịrị ịgba nkịtị ụmụ mmadụ ana-ata ahụhụ, ọ̀ kwa ya? [Chere ka ọ zaa.] Amatala m ihe mere ụmụ mmadụ ji ata ahụhụ. Ma, amụrụ m Baịbụl nke ọma tupu mụ amata ya. Ị̀ ga-achọ ịmata ihe mere ụmụ mmadụ ji na-ata ahụhụ?”

Isiokwu ọzọ ga-akọwa otú o si bụrụ na ndị na-ekwu na e keghị anyị eke enweghị ezigbo ihe mere ha ji kwuo otú ahụ.

^ para. 32 Ebe e si nweta ihe a e kwuru: Social Science Research Council, “Religion and Spirituality Among University Scientists,” by Elaine Howard Ecklund, February 5, 2007.

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ