Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Ịchụ Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?

Ò Nwere Ihe Dị Njọ n’Ịchụ Nwoke Ma Ọ Bụ Nwaanyị?
  • Gịnị bụ ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị?

  • Gịnị mere ụfọdụ ndị ji eme ya?

  • Gịnị ka ọ na-akpata?

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị bụ ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị?

Ụfọdụ ndị chere na ịchụ nwoke ma ọ nwaanyị bụ mmadụ ịgwa onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya na ya nwere mmasị n’ebe ọ nọ, ma ọ bụkwanụ ịkpasowe onye ahụ agwa gosiri na o nwere mmasị n’ebe ọ nọ. Ọ̀ dị njọ mmadụ igosi na ya nwere mmasị n’ebe onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya nọ? Ọ dịchaghị. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ann kwuru na ọ bụ ụzọ onye chọrọ ịlụ di ma ọ bụ nwunye si achọpụta ma onye o nwere mmasị n’ebe ọ nọ ò nwekwara mmasị n’ebe yanwa nọ.

Ma n’isiokwu a, ihe anyị ga-atụle bụ mmadụ igosi na ya nwere mmasị n’onye ọ na-ebughi n’obi ịlụ.

Otụ nwa agbọghọ aha ya bụ Deanna kwuru, sị: “O nwere ihe dị iche na mmadụ na-eleru onye na-abụghị nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya anya ka ọ mara ma hà nwere ike ịlụ, na mmadụ ịmara ụma na-eme ka à ga-asị na ihe onye ọzọ na-amasị ya ma mechaa kpọpụta onye ahụ n’etiti ụzọ hapụ ya. Nke a nwere ike ime ka obi gbawaa onye o mere ụdị ihe a.”

Gịnị mere ụfọdụ ndị ji eme ya?

Ụfọdụ ndị na-eme ya iji gosi ndị ọzọ na ha ga-emeli ya. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Hailey kwuru, sị: “Ị mata na ị ga-emeli ka ndị ọzọ nwee mmasị n’ebe ị nọ, ị ga na-achọkwu ime ya.”

Mana, ime ka i nwere mmasị n’ebe onye ihe ya na-amasịghị gị nọ, na-egosi na i nwere obi ọjọọ, na ị chọghị ịma otú obi ga-adị onye nke ọzọ. Ọ bụrụ na ị na-eme ya iji gosi na ị ga-emeli ya, o nwere ike igosi na ị maghị ihe. Baịbụl kwuru, sị: “Nzuzu bụụrụ onye na-enweghị uche ịṅụrị ọṅụ.”​—Ilu 15:21.

Ọ bụ ya mere ihe ọzọ Hailey kwuru ji bụrụ eziokwu. Ọ sịrị: “Mmadụ bido ịchụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị, o nwere ike ịdị ya ka ihe na-enweghị ihe o mere, ma ọ na-akpatakarị ọdachi.”

Gịnị ka ọ na-akpata?

  • Ọ na-enye mmadụ aha ọjọọ.

    Otu nwa okorobịa aha ya bụ Jeremy kwuru, sị: “Ndị mmadụ na-ewerekarị onye na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ka onye na-amaghị ihe, anaghikwa atụkwasị ya obi. A na-ewerekarị ya na ihe mere o ji abịa mmadụ nso bụ n’ihi na o nwere ihe ọ chọrọ irite onye ahụ n’aka.”

    Baịbụl kwuru, sị: “Ịhụnanya adịghị . . . achọ ọdịmma nke ya.”​—1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

    Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ọ ga-abụ i mee, ndị mmadụ ewere ya na ị na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị?

  • Ọ na-eme ka obi gbawaa onye nke ọzọ.

    Otu nwaanyị aha ya bụ Jaqueline kwuru, sị: “Anaghị m achọ ka mụ na onye na-achụ nwaanyị na-ekwu okwu. Ọ na-adị m ka naanị ihe mere o ji abịa m nso bụ n’ihi na m bụ nwaanyị. Ụdị ndị a achọghị ịma gbasara onye ọzọ, mkpa ha bụ ihe ga-adị hanwa mma.”

    Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla na-achọ, ọ bụghị uru nke ya, kama nke onye nke ọzọ.”​—1 Ndị Kọrịnt 10:24.

    Ihe ị ga-echebara echiche: Ò nwetụla mgbe ị chere na mmadụ nwere mmasị n’ebe ị nọ, e mechaa gị achọpụta na ihe adịghị otú i si chee ya? Olee otú obi dị gị mgbe ahụ? Gịnị ka ị ga-eme ka ị ghara ime onye ọzọ ụdị ihe ahụ?

  • Ọ ga-eme ka mmadụ ghara ịma mgbe i nwere mmasị n’eziokwu n’ebe ọ nọ.

    Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Olivia kwuru, sị: “O nweghị onye ga-achọ ka ya na onye na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-akpa ma ya fọdụzie ịlụ ya. Ọ nweghị otú mmadụ ga-esi tụkwasị onye ọ ma na ọ na-akpa ụdị agwa a obi.”

    Na Baịbụl, ọbụ abụ bụ́ Devid kwuru, sị: “Mụ na ndị na-ezochi ihe ha bụ adịghị akpakọrịta”—Abụ Ọma 26:4.

    Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ụdị onye ihe onye na-achụ nwoke ma ọ bụ nwaanyị na-amasị? Ị̀ ga-achọ ka ihe gị na-amasị ụdị onye ahụ?

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ