Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ga-enyere M Aka ma Ahụ́ M Gbanwewa?

Gịnị Ga-enyere M Aka ma Ahụ́ M Gbanwewa?

“Ọ naghị adịchara anyị mfe ma anyị ghọwa agbọghọ. Ụfọdụ ihe na-eme n’oge ahụ na-afụ ụfụ, na-asọ oyi, na-agbagwojukwa anya. Ọ na-adị ka otú ihe niile si agbanwe adịghị mma!”—Oksana.

“Obi dịtụ m mma, a nọtụ obere, ya ajọọ m njọ. Amaghị m ma ọ̀ bụ otú o kwesịrị isi na-eme ụmụ okorobịa, ma ọ bụ otú o mere m.”—Brian.

Oge ahụ́ ndị na-eto eto na-agbanwe nwere ike ịdị ka ebe mmadụ nọ n’ihe na-ebugharị mmadụ. Ọ na-atọ ụtọ, na-atụkwa egwu. Gịnị nwere ike inyere gị aka ma ahụ́ gị gbanwewa?

 Gịnị bụ ahụ́ mmadụ ịgbanwe?

E kwuo ya ná nkenke, oge a bụ oge ahụ́ ndị na-eto eto na-amalite ịgbanwe, ha aghọwa agbọghọ ma ọ bụ okorobịa. N’oge a, e nwere ihe ụfọdụ ga-agbanwe n’ahụ́ gị ị ga-ahụ anya, nweekwa ndị nke ị na-aghaghị ahụ anya. Mgbanwe ndị a ga-eme ka i tozuo ihe e ji nwoke eme ma ọ bụ ihe e ji nwaanyị eme, kwadebekwa ahụ́ gị maka ịmụ nwa.

Ma, ọ pụtaghị na i ruola ịbụ nne ma ọ bụ nna. Ahụ́ gị ịgbanwe na-egosi na ị bụghịzi nwata. O nwekwara ike ime gị obi ụtọ na ị bụghịzi nwata ma, obi ọjọọ nwekwara iso ya.

Ajụjụ: N’ime afọ ndị a, olee nke i chere na o kwesịrị ịbụ mmadụ ruo, ahụ́ ya amalitezie ịgbanwe?

  • 8

  • 9

  • 10

  • 11

  • 12

  • 13

  • 14

  • 15

  • 16

Azịza: Ahụ́ mmadụ nwere ike ịmalite ịgbanwe ma onye ahụ ruo afọ nke ọ bụla n’ime ndị a.

Ọ pụtara na i kwesịghị ichegbuwe onwe gị ma ọ bụrụ na i ruola ihe dị ka afọ iri na ise ma ahụ́ gị amalitebeghị ịgbanwe. I kwesịghịkwa ichegbu onwe gị ma ọ bụrụ na ahụ́ gị amalite ịgbanwe mgbe ị na-erubeghị afọ iri. Ọ bụ oge ruo mgbe ahụ́ gị kwesịrị ịgbanwe, ya agbanwewa. E nweghị ihe ị ga-emeli banyere ya.

Oge ahụ́ onye na-eto eto na-agbanwe dị ka ebe mmadụ nọ n’ihe na-ebugharị mmadụ. O nwere ike ịtọ gị ụtọ, ma ọ bụ tụọ gị ụjọ, ma i nwere ike ịmụta ihe ga-enyere gị aka n’oge ahụ

 Mgbanwe a na-ahụ anya

Ọ dị ka ihe a na-akacha achọpụta ma ahụ́ mmadụ gbanwewa bụ na onye ahụ na-etokwu ogologo. Ma nsogbu dị na ya bụ na ọ bụghị akụkụ ahụ́ niile na-eto n’otu mgbe. N’ihi ya, ya ejula gị anya ma ọ bụrụ na otú isi aga ije adịchaghị mma. Obi sie gị ike na ka oge na-aga, ihe niile ga-adị mma.

E nwekwara mgbanwe ndị ọzọ ị ga-ahụ anya.

Ihe ndị na-agbanwe n’ahụ́ ụmụ nwoke:

  • Ihe ha ji bụrụ nwoke ga-ebukwu ibu

  • Ịgba ajị na mkpaabụ, n’akụkụ ihe ha ji bụrụ nwoke, nakwa n’ihu

  • Olu ha ịgbanwe

  • Ihe ha ji bụrụ nwoke nọkata ọ kwụrụ ọtọ nakwa ọbara ọcha ịpụta ha n’ahụ́ n’abalị

Ihe ndị na-agbanwe n’ahụ́ ụmụ nwaanyị:

  • Ịkpụ ara

  • Ịgba ajị na mkpaabụ, nakwa n’akụkụ ihe ha ji bụrụ nwaanyị

  • Ịmalite ịhụ nsọ

Ihe ndị na-agbanwe ma n’ahụ́ ụmụ nwoke ma n’ahụ́ ụmụ nwaanyị:

  • Ahụ́ isi ísì. Ihe na-akpata ya bụ ọsụsọ na nje.

    Ihe ga-enyere gị aka: Ịsa ahụ́ mgbe niile na ịgba senti nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ịna-esi ísì.

  • Pịmpụl. Ihe na-akpata ya bụ nje ndị na-abanye n’akpụkpọ ahụ́.

    Ihe ga-enyere gị aka: N’agbanyeghị na ịchụ pịmpụl anaghị adịcha mfe, ịsa ihu mgbe niile na iji ụfọdụ ihe ndị e ji ehicha ihu ehicha ihu gị nwere ike inyere gị aka.

 Otú obi na-adị onye ahụ

Ihe ndị na-agbanwe n’ime ahụ́ gị nwere ike imetụta otú obi na-adị gị. O nwedịrị ike ime ka obi dị́ gị mma, a nọtụ obere, obi ajọwa gị njọ.

“Taa, ị na-ebe ákwá, echi obi adị gị mma. Iwe wetụ gị, obere oge, obi ọjọọ emee ka ị gaa nọrọ naanị gị.”—Oksana.

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-abụ ahụ́ ha gbanwewa, ahụ́ agaghị eru ha ala, ya adị ha ka mmadụ niile hà na-ele ha anya, na-akatọkwa ha. Otú ahụ ahụ́ gị si agbanwe nwekwara ike ime ka obi ghara iru gị ala.

“Mgbe m malitere ito, m na-ama ụma ehulata ehulata ma m gawa ije, m na-eyikwa efe buru ibu. N’agbanyeghị na m ma ihe mere ahụ́ m ji agbanwe, ahụ́ anaghị eru m ala, ihere na-emekwa m. Ọ dịzi m ka ọ bụghị mụnwa.”—Janice.

Otú i si ele ndị na-abụghị nwoke ibe gị ma ọ bụ nwaanyị ibe gị anya nwere ike ịbụ ihe ga-akacha agbanwe banyere otú obi na-adị gị.

“M kwụsịrị iche na ụmụ okorobịa niile na-akpasu mmadụ iwe. Ugbu a, ahụla m na ụfọdụ n’ime ha mara mma, anaghịzi m eche na nwa agbọghọ ịhụ nwa okorobịa n’anya bụ ihe ọjọọ. Okwu a kpụzi n’ọnụ bụ ‘ihe onye a, na-amasị onye a.’”—Alexis.

Ụfọdụ ndị na-eto eto na-achọpụta na n’oge ahụ́ ha na-agbanwe, ha na-enwe mmasị n’ebe ndị bụ́ nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ha nọ. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, echekwala na ị ga-aghọzi onye na-edina nwoke ma ọ bụ nwaanyị ibe ya. Ọtụtụ mgbe, ka oge na-aga, ndị na-eto eto na-akwụsị inwe ụdị mmasị ahụ.

“N’ihi otú m si ejikarị ụmụ okorobịa ndị ọzọ atụnyere onwe m, m malitere inwe mmasị n’ebe ha nọ. Ọ bụ mgbe m totukwuru ka m malitere inwe mmasị n’ebe ụmụ agbọghọ nọ. Anaghịzi m enwe mmasị n’ebe ụmụ okorobịa ibe m nọ.”—Alan.

 Ihe i nwere ike ime

  •  Gbalịa na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. N’eziokwu, ihe ndị ahụ na-agbanwe n’ahụ́ gị, ma ndị ị na-ahụ anya ma ndị na-eme n’ime ahụ́ gị dị gị mkpa. Ihe ọbụ abụ, bụ́ Devid, kwuru nwedịrị ike ime ka obi sie gị ike. Ọ sịrị: “I kere m n’ụzọ dị egwu.”Abụ Ọma 139:14.

  • Ejila onwe gị atụnyere ndị ọzọ, gbaakwa mbọ ka ị ghara ịna-echegbu onwe gị banyere otú ị dịzi. Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ na-ahụ ihe anya na-ahụ; ma Jehova na-ahụ ihe dị n’obi.”1 Samuel 16:7.

  • Na-emega ahụ́, na-ezukwa ike nke ọma. Ihi ụra nke ọma ga-eme ka ahụ́ ghara ịna-agbakasị gị, ka ị ghara ịna-echekasị onwe gị nakwa ka obi ghara ịna-ajọkarị gị njọ mgbe ị mụ anya.

  • Etinyela uche n’ihe ọ bụla obi gị gwara gị. Ọ̀ bụ eziokwu na anya mmadụ niile dị n’ebe ị nọ? Ọ bụrụgodị na ndị mmadụ na-ekwu okwu banyere otú ahụ́ gị si agbanwe, echegbula onwe gị. Baịbụl kwuru, sị “Etinyekwala obi gị n’okwu niile ndị mmadụ pụrụ ikwu.”Ekliziastis 7:21.

  • Mụta ịna-ejide onwe gị ma agụụ mmekọahụ gụwa gị. Baịbụl kwuru, sị: ‘Gbaara ịkwa iko ọsọ. . . . Onye na-akwa iko na-emehie megide ahụ́ nke ya.’1 Ndị Kọrịnt 6:18.

  • Gwa nne gị ma ọ bụ nna gị ma ọ bụkwanụ onye ọzọ toro eto ị tụkwasịrị obi ka o nyere gị aka. O nwere ike ime gị ihere ịgwa ha, ma aka ha ga-enyere gị ga-abara gị ezigbo uru.Ilu 17:17.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ihe anaghị adịchara ndị na-eto eto mfe n’oge ahụ́ ha na-agbanwe. Ọ bụkwa oge ahụ ka ha ji etokwu, ma n’ahụ́ ma n’otú ha si eche echiche ma n’otú obi na-adị ha ma n’ihe gbasara ofufe Chineke.1 Samuel 2:26.

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ