Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Otú M Nwere Ike Isi Na-emekwu nke Ọma n’Ule?

Olee Otú M Nwere Ike Isi Na-emekwu nke Ọma n’Ule?

Ihe i nwere ike ime

Echela na ị gaghị emeli nke ọma! Ọ bụrụ na ị na-eche na ị gaghị emeli nke ọma, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-eme nke ọma. Mgbe ọ bụla ịna-eche na ị gaghị emeli nke ọma, gbalịa na-eche na ị ga-emeli nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị mmadụ kwuru na Pọl onyeozi amaghị okwu ekwu, ọ sịrị ha: “Ọ bụrụgodị na abụghị m ọkà n’ikwu okwu, n’ezie, adịghị m otú ahụ n’ihe ọmụma.” (2 Ndị Kọrịnt 10:10; 11:6) Pọl ma ebe ndị ọ na-anaghị emecha nke ọma. Ma, ọ makwa ebe ndị ọ na-eme nke ọma. Gịnwakwanụ? Olee ebe ndị ị na-eme nke ọma? Ọ bụrụ na o nweghị nke i chetara, gagodị jụọ dimkpa gị na ya na-adị ná mma? O nwere ike inyere gị aka ịma ebe ndị ị na-eme nke ọma. O nwekwara ike ịgwa gị otú ị ga-esi na-emekwu nke ọma.

Mee ka ịmụ ihe mara gị ahụ́. O nweghị otú ị ga-esi mee nke ọma n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụrụ na ị naghị amụ ihe. Mee elu mee ala, i kwesịrị ịmụ ihe. E nwere ike ị naghị achọ ịmụ ihe. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ịmụ ihe bara ezigbo uru. Ọ bụrụ na i jisie ike na-amụ ihe, ọ ga-abịa na-atọ gị ụtọ. Ihe ga-enyere gị aka ka ịmụ ihe mara gị ahụ́ bụ ịhazi oge gị ahazi. Ọ bụ eziokwu na Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịchị ọchị” na “oge iwụli elu.” Ma, cheta na ịmụ ihe dị ezigbo mkpa. (Ekliziastis 3:1, 4; 11:9) I kwesịkwara iwepụta oge ị ga-eji na-atụrụ ndụ otú ndị na-eto eto ndị ọzọ na-eme. Ma cheta na Ekliziastis 11:4 sịrị: “Onye na-ele ifufe agaghị agha mkpụrụ; onye na-ele ígwé ojii agaghịkwa ewe ihe ubi.” Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru pụtara? Ọ pụtara na i kwesịrị ibu ụzọ na-eme ihe ndị dị ezigbo mkpa tupu gị emewe ihe ndị ọzọ. N’ihi ya, buru ụzọ mụọ ihe tupu gị egwuwe egwu. Echegbula onwe gị. I nwere oge ị ga-eji mechaa ha abụọ!

Ibuli ihe e ji emega ahụ́ otú e si ebu ya nwere ike ime ka ahụ́ gbasie gị ike, otú ahụ ka ịgụsi akwụkwọ ike nwere ike ime ka ị na-eme nke ọma n’ụlọ akwụkwọ