Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Nwee Ike Ịna-ehikwu Ụra?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Nwee Ike Ịna-ehikwu Ụra?

Baịbụl kwuru na “obere ezumike dị mma karịa ịrụsi ọrụ ike gabiga ókè na ịchụso ifufe.” (Ekliziastis 4:6) Ọ bụrụ na ị naghị ehi ụra nke ọma, ịrụ ọrụ ga na-esiri gị ike.

  • Nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Ulumma kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ehighị m ụra nke ọma, o nweghị ihe m na-emeli, ụbụrụ m ga na-agbakwa ghara ghara.”

  • Amarachi, onye dị afọ iri na itoolu, kwuru, sị: “Ọ na-abụ elekere abụọ nke ehihie kụhaala, ike agwụruo m n’ọkpụkpụ. Mụ na mmadụ na-ekwu okwu, ụra ana-atụ m.”

Ì kwesịrị ịna-ehikwu ụra? Lee ihe ụfọdụ ndị na-eto eto ibe gị merela.

Na-alakpu n’oge. Adaeze, onye dị afọ iri na asatọ, sịrị: “M na-agbalị ka m na-alakpu n’oge.

Ekwela ka ndị enyi gị mee ka ị ghara ihi ụra mgbe i kwesịrị ihi. Obinna, onye dị afọ iri abụọ na otu, sịrị: “Mgbe ụfọdụ, ọ bụ n’ime abalị ka ndị enyi m na-akpọ m n’ekwentị ma ọ bụ jiri ya zitere m ozi. Ma ugbu a, ha kpọọ m, mụ agwa ha ka ọ dị mgbe ọzọ, ka m nwee ike hie ụra.

Nwee oge ị ga na-alakpu na oge ị ga na-eteta. Onyinyechi, onye dị afọ iri abụọ, sịrị: “Kwa ụbọchị, m na-agbalị hie ụra n’oge m kpebiri iji na-ehi ụra. M na-etetakwa n’oge m kpebiri iteta.

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Gbalịa ka ị na-ehiru ụra awa asatọ n’abalị ọ bụla.

Ọ bụrụ na ị gbalịa na-ehikwu ụra, ọ ga-abara gị uru. Cheta na ọ bụrụ na ahụ́ esie gị ike, ị ga-adịkwu mma n’anya, obi ga na-adịkwu gị ụtọ, gị ana-emetakwukwa ihe ndị ị na-eme.

O nwere ihe ụfọdụ ị na-agaghị ama ihe ị ga-eme gbasara ha, ma otú i si ebi ndụ nwere ike ime ka ahụ́ gbasie gị ike ma ọ bụkwanụ mee ka ị na-arịakarị ọrịa. Nnenna, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Mee elu mee ala, ọ bụ naanị gị ga-ekpebi otú ahụ́ ga-adị gị.