Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọ Nwoke na Nwaanyị?

Gịnị Ka M Ga-eme ma Enyi M Chọọ Ka Mụ na Ya Nwee Mmekọ Nwoke na Nwaanyị?

I nwere ike ịna-eche sị: “Ò nwekwaranụ ihe o mere ma mụ na ya mee ya? Ọ̀ kwa mmadụ niile na-eme ya?”

Chetụgodị echiche!

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mmadụ niile na-eme ya.

Ọ bụ eziokwu na i nwere ike ịgụta ebe e kwuru na ndị na-eme ya bụ ájá. Dị ka ihe atụ, otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na e kee ndị na-eto eto ụzọ atọ, ụzọ abụọ enwewela mmekọ nwoke na nwaanyị tupu ha agachaa ụlọ akwụkwọ sekọndrị. Ma, nchọpụta ahụ gosikwara na otu ụzọ n’ime ha anaghị eme ya.

Oleekwanụ maka ndị nke ahụ na-eme ya? A chọpụtara na ọtụtụ n’ime ha na-emecha nwee ụfọdụ nsogbu ndị a:

Mmadụ inwe mmekọahụ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye yiri iji foto mara mma mere ihe e ji ehicha ụkwụ

Obi erughị ala. Ọtụtụ ndị na-eto eto, ndị nwere mmekọ nwoke na nwaanyị mgbe ha na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye, kwuru na ha mechara kwaa mmakwaara.

Atụkwasịghị ibe ha obi. Nwoke na nwaanyị nwee mmekọahụ mgbe ha na-akpa, ihe onye ọ bụla n’ime ha ga-echewe bụ, ‘ọ ga-abụkwa na ya na ndị ọzọ na-eme ụdị ihe a.’

Ịkwa mmakwaara. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ ha na ụmụ okorobịa nwerela mmekọahụ na-akwa mmakwaara n’ihi na ndị ha chọrọ bụ ndị ga-elekọta ha, ọ bụghị ndị ga-emebi ha. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na-ekwukwa na ha na nwa agbọghọ nwehaala mmekọahụ, ihe nwa agbọghọ ahụ anaghịzi amasịcha ha.

Nke bụ́ eziokwu bụ na i kwesịghị ikwe ka mmadụ mebie gị. Gwa onwe gị na o nweghị ihe ga-eme ka i nupụrụ Chineke isi n’okwu gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Chineke achọghị ka nwa okorobịa na nwa agbọghọbịa nwee mmekọ tupu ha alụọ. Jide onwe gị. I mechaa lụọ di ma ọ bụ nwunye, unu nweziri ike inwe mmekọahụ. Mgbe ahụzi, ị gaghị na-echegbu onwe gị, na-akwa mmakwaara, ma ọ bụ nwee nsogbu ndị ọzọ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-enwe ma ha nwee mmekọahụ tupu ha alụọ.—Ilu 7:22, 23; 1 Ndị Kọrịnt 7:3.

 

GỤKWUO GBASARA YA

NDỊ NA-ETO ETO

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 2

Ụfọdụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru gbasara ụlọ akwụkwọ, ntụrụndụ, ndị ọgbọ gị, papa gị na mama gị, mgbanwe ndị ị na-enwe n’ahụ́ gị, otú obi na-adị gị, na okwu nwoke na nwaanyị.