Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme ma M Mee Ihe Papa M na Mama M Sị M Emela?

Gịnị Ka M Ga-eme ma M Mee Ihe Papa M na Mama M Sị M Emela?

Lee ihe ụfọdụ ị ga-eme ka ihe ghara ịka njọ.

Gwa ha eziokwu. Ọ bụrụ na ị gwaghị ha eziokwu, o nweghịzi ihe i kwuru ga-adị ha ka ọ̀ bụ eziokwu. N’ihi ya, gwa ha eziokwu, gwakwa ha otú ihe si mee.Ilu 28:13.

  • Emela ka à ga-asị na ihe i mere dị mma ma ọ bụ na ihe i mere abụghị oké ihe.

  • Echefula na “azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.Ilu 15:1.

Rịọ mgbaghara. I kwesịrị igosi na ihu i mechuru ha, ọrụ i nyekwuru ha, na obi ọjọọ i mere ha wutere gị. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka ha ghara imesi gị ike. Arịrịọ ị na-arịọ kwesịrị isi gị n’obi.

Buru ihe ọ bụla si na ya pụta. Iburu ihe si n’ihe i mere pụta na-egosi na ị bụ dimkpa. Ihe kacha mma i nwere ike ime bụ ịgba mbọ ka papa gị na mama gị malite ịtụkwasị gị obi ọzọ.Ilu 20:11.

Cheta na ọ bụ ha kwesịrị ịgwa gị ihe ị ga-eme. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo banyere “ihe nna gị nyere n’iwu” nakwa “iwu nne gị.Ilu 6:20.

Ị chọọ ka papa gị na mama gị na-ahapụ gị ka iji aka gị na-ekpebiri onwe gị ihe

  • Mee ka ha ghọta na ị chọrọ irubere ha isi.

  • Na-erubere ha isi mgbe niile.