Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

M̀ Kwesịrị Igbu Egbugbu n’Ahụ́?

M̀ Kwesịrị Igbu Egbugbu n’Ahụ́?

 Gịnị mere ndị mmadụ ji egbu egbugbu n’ahụ́?

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Ryan kwuru, sị: “Echere m na ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-ese n’ahụ́ ha mara mma.”

Ihe nwere ike ime ka mmadụ nwewe mmasị n’igbu egbugbu n’ahụ́ bụ ihe onye ahụ bu n’obi chọọ igbu egbugbu. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jillian kwuru, sị: “E nwere nwa akwụkwọ anyị mama ya nwụrụ mgbe ọ dị obere. Mgbe o topụtara agbọghọ, o dere aha mama ya n’azụ olu ya. Eche m na ụdị egbugbu ahụ dị mma.”

N’agbanyeghị ihe mere i ji chọọ ime ya, i kwesịrị iche echiche nke ọma tupu i kpebie igbu egbugbu na-agaghị apụ apụ n’ahụ́ gị. Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ ma ọ bụrụ na ị na-eche ma ì kwesịrị igbu egbugbu n’ahụ gị? Oleekwa ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ikpebi ihe dị mma?

 Olee ajụjụ ndị i kwesịrị ịjụ?

Olee ọrịa ndị o nwere ike ịkpata? Ihe otu ụlọ ọgwụ a na-akpọ Mayo Clinic dere n’Ịntanet gbasara igbu egbugbu bụ: “E gbuwe mmadụ egbugbu, a na-akpọpu akpụkpọ ahụ́ onye ahụ́. O nweziri ike ịkpatara onye ahụ ọrịa akpụkpọ ahụ́ na nsogbu ndị ọzọ.” Ha kwukwara na mgbe ụfọdụ, ebe ahụ e gburu egbugbu nwere ike ịfụ ákpụ̀, baakwa ọnyá ma ọ bụkwanụ nye onye àpà n’ebe ahụ. Ihe ọzọ ha kwuru bụ na “ọ bụrụ na ihe e ji egbu egbugbu ahụ metụrụ n’ọbara onye bú ọrịa, o nwere ike ibufe ọrịa ahụ n’ahụ́ onye ọzọ.”

Olee otú ndị mmadụ ga-esi na-ele gị anya? Ma ì kwere ma ì kweghị, otú ị na-adị nwere ihe ọ na-agwa ndị ọzọ banyere gị. O nwere ike ime ka a na-ele gị anya ka nwata ma ọ bụ ka onye ma ihe, ma ọ bụkwanụ ka e lewe gị anya ka onye e kwesịrị ịtụkwasị obi ma ọ bụ onye na-abaghị uru. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Samantha kwuru, sị: “M hụhaala onye gburu egbugbu, m na-ewere onye ahụ ka onye na-ebi ndụ na-enweghị isi.”

Nwa agbọghọ ọzọ dị́ afọ iri na asatọ aha ya bụ Melanie kwuru otú yanwa si ele ndị gburu egbugbu anya. Ọ sịrị: “Igbu egbugbu na-ekpuchi mma mmadụ mara. Ọ dị ka a ga-asị na ndị na-egbu egbugbu achọghị ka ndị mmadụ hụ otú ha dị, ha na-eji ihe ahụ ha gburu ezochi ahụ́ ha.”

È nwere mgbe ọ na-agaghị amasịzi gị? Ka oge na-aga, ibu ma ọ bụ nká nwere ike ime ka ihe mmadụ gburu n’ahụ́ gharazie ịdị otú ọ dịbu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Joseph kwuru, sị: “Ahụla m otú egbugbu na-emecha dị mgbe onye ahụ mewere agadi, ọ naghịdị ama mma.”

Nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na otu, aha ya bụ Allen, sịrị: “Egbugbu na-ewucha ewucha. Afọ ole na ole gafee, ihe pụrụ iche n’anya mmadụ nwere ike ọ gaghịzi aba uru n’anya onye ahụ.”

Ihe a Allen kwuru bụ eziokwu. Nke bụ́ eziokwu bụ na ka mmadụ na-aka nká, otú o si ele ihe anya, ihe na-amasị ya, na ihe ndị na-atọ ya ụtọ na-agbanwe, ma egbugbu o gburu n’ahụ́ anaghị agbanwe agbanwe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Teresa kwuru, sị: “Achọghị m ka egbugbu ga na-echetara m naanị iberiibe m mere soro n’ihe ndị m ga-akwara mmakwaara n’ọdịnihu.”

 Olee ihe Baịbụl kwuru i kwesịrị ichebara echiche?

Onye maara ihe na-ewepụta oge chebara ọtụtụ ihe echiche tupu o kpebie ihe ọ ga-eme. (Ilu 21:5; Ndị Hibru 5:14) N’ihi ya, chebara amaokwu Baịbụl ndị a echiche. E nwere otú ha si gbasa igbu egbugbu.

  • Ndị Kọlọsi 3:20: “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na nke a na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.”

    Ọ bụrụ na gị na nne na nna gị ka bi n’ụlọ ma ị naghị erubere ha isi, olee nsogbu o nwere ike ịkpatara gị?

  • 1 Pita 3:3, 4: “Unu ekwekwala ka mma unu na-achọ bụrụ ịkpa isi efu na iyi ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi, nke yi uwe na-apụghị imebi emebi, bụ́ mmụọ dị jụụ, nke dịkwa nwayọọ.”

    Gịnị ka i chere mere Baịbụl ji kwusie okwu ike banyere “mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi”?

  • 1 Timoti 2:9: ‘Ụmụ nwaanyị, na-achọnụ onwe unu mma n’imeru ihe n’ókè na uche zuru okè.’

    Gịnị ka ‘imeru ihe n’ókè’ pụtara? Gịnị mere imeru ihe n’ókè ji ka ịchọ mma elu ahụ́ mma?

  • Ndị Rom 12:1: ‘Nyefeenụ Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.’

    Gịnị mere ihe i mere ahụ́ gị ji gbasa Chineke?

N’ihi ihe ndị a, ọtụtụ ndị ekpebiela na ha agaghị egbu egbugbu. N’eziokwu, ha achọtala ihe ka igbu egbugbu mma. Teresa, anyị kwuburu okwu ya, sịrị: “Ọ bụrụ na e nwere okwu na-amasị gị, na-akpa àgwà otú ga-egosi na ọ masịrị gị. Ọ bụrụkwa na e nwere onye dị gị ezigbo mkpa, gwa onye ahụ na i jighị ya egwu egwu. Kama igbuwe egbugbu n’ahụ́ gị, na-akpa àgwà otú ga-egosi ihe i ji kpọro ihe.”

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ