Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Kwụsị Ịna-echegbu Onwe M?

 Gịnị na-eme ka ị na-echegbu onwe gị?

Ihe a ndị na-eto eto kwuru ebe a, hà yiri otú obi na-adị gị mgbe ụfọdụ?

“Ihe m na-eche mgbe niile bụ: Gịnị ka m ga-eme ma . . . ?’ ‘Gịnị ka m ga-eme ma anyị nwee ihe mberede okporo ụzọ?’ ‘Gịnị ka m ga-eme ma ụlọ anyị gbaa ọkụ?’ Ihe na-echukarị m ụra bụ ihe na-ekwesịghị ichu onye isi kpakọrọ ọnụ ụra.”—Charles.

“M na-echegbukarị onwe m. Ọ na-adị m ka m̀ nọ na janglova. Ma, m nyaa ya elu nyaa ya ala, ebe m nọ ka m nọkwa. N’agbanyeghị otú m si na-echegbu onwe m, e nweghị uru m na-erite.”—Anna.

“Ọ na-abụ ndị mmadụ hụ na m ka na-aga akwụkwọ, ha agwa m na mụ alaferela. Ma ihe na-agbata m n’obi bụ, ‘Ndị a amaghịdị ụdị ahụhụ m na-ata n’ụlọ akwụkwọ.’”—Daniel.

“Isi na-adị agba m ghara ghara. M na-echegbukarị onwe m banyere ihe nwere ike ime echi ma ọ bụ ihe m ka ga-eme eme.”—Laura.

Ihe i kwesịrị ịma: Anyị bi n’oge Baịbụl kpọrọ “oge dị oké egwu, nke tara akpụ.” (2 Timoti 3:1) N’ihi ya, ma ndị na-eto eto ma ndị torola eto nwere ike ịna-echegbu onwe ha.

 Ọ̀ bụ mgbe niile ka mmadụ ichegbu onwe ya dị njọ?

Azịza ya bụ mba. Nke bụ́ eziokwu bụ na Baịbụl kwuru na ọ dị mma mmadụ ichegbu onwe ya banyere otú ọ ga-esi mee ka obi dị́ ndị ọ hụrụ n’anya mma.1 Ndị Kọrịnt 7:32-34; 2 Ndị Kọrịnt 11:28.

Ihe ọzọ bụ na nchegbu nwere ike ime ka mmadụ mee ihe dị́ mma. Ka e were ya na e nwere ule unu ga-ele n’ụlọ akwụkwọ n’izu na-abịanụ. Ọ bụrụ na i chegbuo onwe gị banyere ule ahụ, ọ ga-eme ka ị gụọ akwụkwọ gị n’izu a. Ịgụ akwụkwọ ga-enyekwara gị aka ime nke ọma n’ule ahụ.

Nchegbu nwekwara ike ime ka mmadụ zere nsogbu. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Serena kwuru, sị, “I nwere ike ịna-echegbu onwe gị maka na ị ma na ihe ị na-eme dị njọ nakwa na i kwesịrị ịkwụsị ya ka akọnuche gị kwụsị inye gị nsogbu.”—Tụlee Jems 5:14.

Ihe i kwesịrị ịma: Nchegbu nwere ike ịbara gị uru ma ọ bụrụhaala na ọ na-eme ka i mee ihe dị́ mma.

Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe ị na-eche bụ naanị ihe ọjọọ ihe ọjọọ?

Mmadụ ichegbu onwe ya dị ka ebe mmadụ nọ n’ebe ọ na-amaghị otú ọ ga-esi apụta apụta, ma onye ọzọ ghọtara nsogbu ya nwere ike inyere ya aka ịpụta

Ihe atụ: Nwa okorobịa dị́ afọ iri na itoolu aha ya bụ Richard kwuru, sị, “Obi anaghị eru m ala ma m na-eche banyere ihe dị iche iche nwere ike isi ná nsogbu bịaara m pụta. M na-echegide ya ruo mgbe ahụ́ na-agaghịzi eru m ala.”

Baịbụl kwuru na “obi dị jụụ bụ ndụ anụ ahụ́.” (Ilu 14:30) Ma, nchegbu nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa ụfọdụ, dị ka isi ọwụwa, anya ajụ, afọ ọrụrụ, na obi ịna-akụkarị ya kpum kpum.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na otú i si echegbu onwe gị na-akpatara gị nsogbu?

 Ihe i nwere ike ime

  • Jụọ onwe gị ma ì kwesịrị ịna-echegbu onwe gị. “Mmadụ ịna-eche otú ọ ga-esi arụ ọrụ dịịrị ya dị iche na mmadụ ịna-echegbu onwe ya. Mmadụ ichegbu onwe ya dị ka ebe mmadụ na-anya janglova. Ọ nyaa elu, nyaa ala, ọ ka ga-anọkwa ebe ọ nọ.”—Katherine.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ònye n’ime unu pụrụ ịgbakwụnye otu kubit n’afọ ndụ ya site n’ichegbu onwe ya?”Matiu 6:27.

    Ihe ọ pụtara: Ọ bụrụ na ichegbu onwe gị anaghị enyere gị aka ime ihe i kwesịrị ime, nchegbu gị ga-akadị njọ ma ọ bụkwanụ ya aghọziere gị nnukwu nsogbu.

  • Echegbula onwe gị maka echi. “Jụọ onwe gị, sị, ‘Olee uru ihe a m na-echegburu onwe m maka ya ga-abara m echi ma ọ bụ n’ọnwa ọzọ ma ọ bụ n’afọ ọzọ ma ọ bụkwanụ n’afọ ise na-abịanụ?’”—Anthony.

    Baịbụl kwuru, sị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”Matiu 6:34.

    Ihe ọ pụtara: Mmadụ ịna-echegbu onwe ya maka nsogbu nwere ike ịbịara ya echi abaghị uru. Oge ụfọdụ, nsogbu ndị ahụ anaghịdị abịa.

  • Na-ewere ụwa gị otú i si hụ ya. “Ihe ka mma ị ga-eme bụ ịdị njikere maka ụdị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara gị. Ma, buru n’obi na e nwere nsogbu ndị ị na-agaghị emeli ihe ọ bụla banyere ha.”—Robert.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-emeri n’ọsọ, . . . ọ bụghịkwa ndị nwere amamihe na-enweta ihu ọma; n’ihi na oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.”Ekliziastis 9:11.

    Ihe ọ pụtara: Oge ụfọdụ, ị gaghị agbanweli otú ihe dịịrị gị, ma i nwere ike ịgbanwe otú i si ele ya anya.

  • Ghọta ihe gị na ya na-alụ. “M ghọtahaala ụdị nsogbu bịaara m, anaghịzi m enye onwe m nsogbu maka ihe ndị ọzọ ha na ya so. M na-ekpebi ihe ndị ka mkpa, jiri ike m niile mewe ha.”—Alexis.

    Baịbụl kwuru, sị: “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”Ndị Filipaị 1:10.

    Ihe ọ pụtara: Ndị ghọtara nsogbu ha nke ọma anaghị echegbukarị onwe ha banyere ya.

  • Kọọrọ onye ọzọ nsogbu gị. “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na otu, ọ na-abụ m lọta akwụkwọ, mụ ana-echegbu onwe m banyere ihe anyị ga-eme echi ya. Mama m na papa m na-ege m ntị ma m kọwara ha otú obi dị m. Obi dị m ụtọ na ha na-enyere m aka. M tụkwasịrị ha obi, na-akọkwara ha otú obi dị m. O nyeere m aka ka ihe ga-eme echi ghara ịna-amapụ m obi.”—Marilyn.

    Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ nchegbu nke dị n’obi mmadụ ga-anyịgbu ya, ma, ọ bụ okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa ọṅụ.”Ilu 12:25.

    Ihe ọ pụtara: Mama gị ma ọ bụ papa gị ma ọ bụ enyi gị nwere ike ịtụrụ gị aro ga-enyere gị aka ịkwụsị ịna-echegbu onwe gị.

  • Ikpe ekpere. “Ikpe ekpere na-enyere m aka, karịchaa ma m kpepụta ya ekpepụta. Ọ na-enyere m aka ikwupụta ihe na-echegbu m kama iburu ya n’obi. Ọ na-emekwa ka m ghọta na Jehova karịrị ihe ndị ahụ na-echegbu m.”—Laura.

    Baịbụl kwuru, sị: ‘Tụkwasị Chineke nchegbu gị niile, n’ihi na ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi.’1 Pita 5:7.

    Ihe ọ pụtara: Ekpere anaghị eme ka anyị jiri aka anyị dozie nsogbu ndị bịaara anyị. Kama, ọ bụ otú anyị si akọsara Jehova Chineke mkpa anyị. Ọ gwara anyị, sị: “Elegharịla anya n’ụjọ, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyere gị aka.”Aịzaya 41:10.