Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Ghara Ibu Oké Ibu?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka M Ghara Ibu Oké Ibu?

Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-emeru ihe n’ókè.” (1 Timoti 3:2) Otu n’ime ụzọ ndị anyị si egosi na anyị na-emeru ihe n’ókè bụ ịkpachara anya n’otú anyị si eri nri. Gbalịa mee ihe ndị anyị ga-ekwu n’ebe a.

Mara mgbe afọ juru gị. Adaure, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Mgbe mbụ, m na-erife nri ókè ma ọ bụrụhaala na nri ahụ agaghị eme ka m buo ibu. Ma ugbu a, ọ na-abụ m rijuo afọ, mụ esere aka.

Erila nri ndị na-anaghị edozi ahụ́. Emeka, onye dị afọ iri abụọ na otu, sịrị: “Naanị n’ime otu ọnwa m kwụsịrị ịṅụ mmanya ọtọ bịrịbịrị, efelatara m.

Kwụsị irife nri ókè. Nnenna, onye dị afọ iri na itoolu, sịrị: “Ana m agbalị ka m ghara ịga kurukwuo nri mgbe afọ juru m.

Ihe Ga-enyere Gị Aka: Rie ugboro nri ole i kwesịrị iri n’ụbọchị. Ọ bụrụ na i meghị otú ahụ, agụụ nwere ike ịgụsi gị ike. Ị chọzie iri nri, gị erifee ya ókè.

Ma, ụfọdụ ndị na-ekwu na ha chọrọ ifelata ebughị ókè ibu. Otú ha dị dị mma. Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ifelata? Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Adaeze kwuru ihe nyeere ya aka. Ọ sịrị:

“Eburu m ókè ibu, ma ọ dịghị m mma. Ọ na-emekarị ka obi na-ajọ m njọ. Ọ na-adị m ka ahụ́ adịghị m.

“Ọ na-abụ m nọtụ, mụ erie nri ga-eme ka m felatatụ. Ma, m na-emecha dịghachi otú m dịbu. N’ihi ya, mgbe m dị afọ iri na ise, m kpebiri na m ga na-erizi naanị ihe ndị na-agaghị eme ka m buo ibu n’ihi na achọghị m ibu taa felata echi.

“M gara zụrụ akwụkwọ e dere ụdị nri mmadụ ga-eri, ya aghara ibu ibu na otú mmadụ ga-esi na-emega ahụ́. M bidoro mewe ihe ndị m gụtara n’akwụkwọ ahụ. M kpebisiri ike na o nweghị ihe ga-eme ka m kwụsị ime ha.

“Ihe a m mere baara m uru. N’ime otu afọ m malitere ime ihe ndị ahụ, m felatara. Otú m dị kemgbe afọ abụọ ugbu a bụ otú m chọrọ ịdị. O nweghị mgbe m chere na m ga-adị otú a.

“Ihe nyeere m aka bụ na e kpebiri m na emekataghị m rie ihe ga-eme ka m buo ibu ọzọ.”