Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere M Ga-eji Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma?

Gịnị Mere M Ga-eji Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma?
  • Ihe abụọ ọtụtụ ndị na-amaghị

  • Ndị na-emere ndị ọzọ ihe ọma

  • Olee otú m nwere ike isi meere ndị ọzọ ihe ọma?

Ihe abụọ ọtụtụ ndị na-amaghị

Nke #1: Ị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, hanwa ga na-emekwara gị ihe ọma.

Ndị mmadụ hụ na ị na-enye ndị ọzọ ihe, ha ga na-enyekwa gị ihe. Baịbụl kwuru, sị:

  • “Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe. . . . Ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.”Luk 6:38.

Nke #2: Ị na-emere ndị ọzọ ihe ọma, ị na-emekwara onwe gị ihe ọma ma.

Inye ndị ọzọ ihe ga-eme ka ị mara na ị bara uru, meekwa ka i nwee obi ụtọ mmadụ na-enwe ma o nye ndị ọzọ ihe. Lee otú Baịbụl sị kwuo ya:

  • “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”Ọrụ Ndịozi 20:35.

  • “Mgbe ị na-akpọ oriri, kpọọ ndị ogbenye, ndị nwere nkwarụ, ndị ngwọrọ, ndị ìsì; ị ga-enwekwa obi ụtọ, n’ihi na ha enweghị ihe ọ bụla ha ga-eji kwụọ gị ụgwọ.”Luk 14:13, 14.

Ndị na-emere ndị ọzọ ihe ọma

O nweghị ebe a na-enweghị ndị na-eto eto na-emere ndị ọzọ ihe ọma. Lee ụfọdụ n’ime ha.

“Mgbe ụfọdụ, m bịa ka m nọrọ ọdụ lee tiivi, mụ echeta mama m na papa m gara ọrụ, chetakwa na ike ga-agwụcha ha ma ha lọta. N’ihi ya, m na-ebili gaa saa efere ma zaa ụlọ. M na-emekwara ha kọfị n’ihi na ọ bụ ihe na-amasị ha. Mama m lọta, ọ na-asị, ‘Ime ụlọ a mara mma, ọ na-esikwa ísì ọma. Nwa m, i meela nnụ?’ Imere papa m na mama m ụdị ihe a na-eme m obi ụtọ.”—Casey.

“Papa m na mama m na-egboro m mkpa m niile. N’ihi ya, mgbe nnukwu ihe mebiri n’ụgbọala ha n’afọ gara aga, m nyere ha akwụkwọ ha ga-eji dọrọ ego mezie ya, n’agbanyeghị na o mere ka obere ego fọdụziere m. Ọ bụ eziokwu na ha ekweghị anara m ego ahụ, ma m rịọsiri ha ike ka ha were ya. O nweghị ihe ihe ahụ m meere ha bụ ma e jiri ya tụnyere ihe ha meerela m. Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na m nyere nne na nna m ihe.”—Holly.

Ị̀ maara? Ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eto eto na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-enyere ndị ọzọ aka ịmụta ihe dị na Baịbụl. Ụfọdụ n’ime ha akwagadịla ná mba ọzọ n’ihi na e nwechaghị ndị na-akụzi Baịbụl ná mba ahụ.

“Esi m Amerịka kwaga Meksiko ka m nye aka na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’ebe ahụ. Mgbe ụfọdụ, anaghị m enwe ego ma ọ bụ ihe ọzọ m ga-enye ndị ọzọ n’ihi na o nweghị otú ọ dịịrị m. Ma, achọpụtala m na m jiri ike m na oge m gaa ozi ọma, ndị m ziri ozi ọma na-enwe ezigbo obi ụtọ karịadị otú ha gaara enwe ma a sị na m nyere ha ego ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.”—Evan.

Olee otú m nwere ike isi meere ndị ọzọ ihe ọma?

Ị̀ ga-achọ inwe obi ụtọ mmadụ na-enwe ma o meere ndị ọzọ ihe ọma? Lee ihe ụfọdụ ị ga-eme.

Iji nyere ndị ezinụlọ unu aka:

  • Saa efere, zaa ụlọ, ma ọ bụkwanụ gị ehichaa ụlọ n’echeghị ka a gwa gị ya agwa

  • Sie nri

  • Kelee papa gị na mama gị maka ihe ọma ndị ha na-emere gị ma ọ bụ gị edee ya na kaadị nye ha

  • Nyere nwanne gị aka ka o mee ihe onye nkụzi ha sịrị ya mee

Iji nyere ndị na-abụghị ndị ezinụlọ unu aka:

  • Gaa leta onye ahụ́ na-adịghị

  • Gaa na nke onye agbata obi unu merela agadi meere ya ihe ụfọdụ

  • Gaa leta onye na-anaghịzi apụta èzí

  • Zụta onyinye ị ga-enye onye ihe na-esiri ike ma nye ya ya

Ihe ga-enyere gị aka: E wezụga ihe ndị a e dere ebe a, gbalịa cheta n’onwe gị ụzọ ndị ọzọ i nwere ike isi meere mmadụ ihe ọma. Gbalịakwa meere mmadụ ihe ọma n’izu a. O nwere ike ịtụ gị n’anya otú obi ga-esi tọọ gị ụtọ.

“I nyere ndị ọzọ aka, obi ga-adị gị ụtọ. Afọ ga-ejukwa gị. O nwedịrị ike ịbụ na ihe ahụ i meere ndị ọzọ tọrọ gị ụtọ mgbe ị na-eme ya, n’agbanyeghị na ị maghị na ọ ga-atọ gị ụtọ ná mmalite. O nwekwara ike ịbụ na ọ dịghị gị ka ihe ahụ i mere ò furu gị ihe, ebe ọ bụ na ọ bakwaara gịnwa ezigbo uru.”—Alana.

GỤKWUO GBASARA YA

Cameron Matara Ihe Kacha Mma Mmadụ Nwere Ike Iji Ndụ ya Mee

Ị̀ chọrọ ibi ndụ ga-abara gị uru? Lee vidio a ka ị hụ ihe Cameron kọrọ gbasara otú o si bie ndụ bara uru n’obodo ọzọ.