Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 2: Otú Ị Ga-esi Enweta Onwe Gị

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 2: Otú Ị Ga-esi Enweta Onwe Gị

 Ihe ị ga-eme ka obi ghara ịna-ama gị ikpe

Ezigbo ihere na-adị eme ọtụtụ ndị e metọrọ ma ọ bụ dinaa n’ike. Ha nwere ike ịna-eche na ọ bụ ha kpatara ya. Dị ka ihe atụ, e nwere nwa agbọghọ dị afọ iri na itoolu aha ya bụ Karen. E metọrọ ya malite mgbe ọ dị afọ isii ruo mgbe ọ dị afọ iri na atọ Ọ sịrị: ‘Nsogbu kachanụ m na-enwe bụ na obi m na-ama m ikpe. M na-adị ajụ onwe m ihe mere m ji gbachi nkịtị ruo ogologo oge.’

Ọ bụrụ na obi gị na-ama gị ikpe maka ihe e mere gị, chebagodịrị ihe ndị a echiche:

  • Ụmụaka etorubeghị inwe mmekọahụ. Uche ha erubeghịkwa n’ụdị ihe ahụ. Ha amaghị ihe ọ bụla banyere ya ma ọ bụ ihe o nwere ike ịkpata. N’ihi ya, ha kwetagodi ime ya, ha amaghị ihe ọ pụtara. Ọ bụ ya mere na e kwesịghị ịta nwatakịrị e metọrọ ụta.

  • Ụmụaka na-atụkwasịkarị ndị toro eto obi, ha anaghịkwa ama otú ndị arụrụala si aghọgbu mmadụ. Ọ bụ ya mere ha ji adabakarị n’aka ha. Akwụkwọ a na-akpọ The Right to Innocence kwuru na ndị na-edina ụmụaka na-emekarị ka ndị ezigbo mmadụ nakwa na ụdị aghụghọ ha na-aghọ abụghị ihe obere nwa ga-aghọtali.

  • Ihe ndị na-eme n’ahụ́ mmadụ ma mmadụ nwewe mmekọahụ nwere ike ime n’ahụ́ nwatakịrị ma mmadụ dịnaa ya n’ike ma ọ bụ metụwa ya aka n’ahụ́ otú na-adịghị mma. Ọ bụrụ na ụdị ihe a emee gị, obi amapụla gị. Ọ bụ otú e kere ahụ́ mmadụ ka ọ na-eme ma mmadụ nwewe mmekọahụ ma ọ bụ ma mmadụ metụ ya aka otú na-ekwesịghị ekwesị. Ọ pụtaghị na i kwetara ka gị na onye ahụ nwee mmekọahụ ma ọ bụkwanụ na e kwesịrị ịta gị ụta.

Megodị ihe a: Chee banyere nwatakịrị ị ma dị afọ ole ị dị mgbe e metọrọ gị. Jụzie onwe gị, sị: ‘È kwesịrị ịta nwatakịrị ahụ ụta ma mmadụ metọọ ya ma ọ bụ dinaa ya n’ike?’

Karen anyị kwuburu okwu ya chebaara ihe a echiche mgbe ọ na-elekọta ụmụaka atọ. Otu n’ime ụmụaka atọ ahụ dị ihe dị ka afọ isii. I chetaranụ na ọ bụ afọ ole Karen dị mgbe a malitere imetọ ya. Karen sịrị, “Ọ bịaziri doo m anya na nwatakịrị hà otú ahụ enweghị ihe ọ ma, nakwa na e nweghị ihe m gaara emeli mgbe ahụ.”

Eziokwu: Ọ bụ onye metọrọ mmadụ ma ọ bụ dinaa ya n’ike ka e kwesịrị ịta ụta maka ihe o mere. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ajọ omume nke onye ajọ omume ga-adị n’isi ya.’Ezikiel 18:20.

 Uru ịgwa ya mmadụ bara

Ịgwa onye toro eto ị tụkwasịrị obi banyere ihe mere gị ga-enyere gị aka inweta onwe gị. Baịbụl sịrị, “Ezi enyi nwere ịhụnanya mgbe niile, ọ bụkwa nwanne a mụrụ maka oge nsogbu.”Ilu 17:17.

O doro anya na i nwere ike iche na ọ ga-akara gị mma ma ọ bụrụ na ịgwaghị onye ọ bụla ihe merenụ. I nwere ike ịna-eche na nkịtị ị gbara kaara gị mma, n’ihi na ikwu banyere ya na-agbawa gị obi. Ma, chetakwa na ọ bụrụ na i kpebie na ị gaghị akọrọ ya onye ọ bụla ka obi wee ghara ịjọ gị njọ, agaghị enwe onye ga-enyere gị aka.

Ọ bụrụ na ị chọghị ịkọrọ mmadụ ihe mere gị ka obi wee ghara ịjọ gị njọ, ọ ga-adị ka ebe i ji mgbidi gbachibido onwe gị. Ma, mgbidi ahụ ga-emekwa ka ndị ọzọ ghara inyere gị aka

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Janet chọpụtara na ịgwa onye ọzọ gbasara ihe mere ya nyere ya ezigbo aka inweta onwe ya. Ọ sịrị, “Mgbe m dị obere, onye m ma metọrọ m. Agwaghịkwa m ya onye ọ bụla ruo ọtụtụ afọ. Ma, ozugbo m katara obi gwa ya mama m, ọ bịara dị m ka ebe e buturu m ibu na-anyịgbu m.”

Janet ghọtara ihe mere o ji esiri ụfọdụ ike ịkọrọ mmadụ ihe mere ha, n’ihi na ọ ma otú ọ dị ya n’oge mbụ. Ọ sịrị, “Obi anaghị adị mmadụ mma ikwu banyere mmetọ e metọrọ ya. Ma mgbe nke m mere, ịgbachi nkịtị mere ka obi na-ajọ m ezigbo njọ. M chọpụtara na ọ kaara m mma ịgwa ya onye ọzọ ozugbo karịa izochiwe ya.”

 “Oge ịgwọ agwọ”

Ọ bụrụ na e metọrọ gị, o nwere ike ịbụ na o meela ka i chewe na ị baghị uru, na nke gị agwụla ma ọ bụkwanụ na naanị ihe ị dị mma ya bụ igboro ndị ọzọ agụụ mmekọahụ na-agụ ha. I nwere ike ịkwụsị ile onwe gị anya otú ahụ. Baịbụl kwuru banyere “oge ịgwọ agwọ,” ya bụ, oge ị ga-eji nweta onwe gị. (Ekliziastis 3:3) Olee ihe ndị ga-enyere gị aka?

Ịmụ Baịbụl. Ihe e dere na Baịbụl bụ uche Chineke. “Ọ dị ike.” E jikwa ya “akụghasị ihe ndị gbanyesiri mgbọrọgwụ ike” n’obi, dị ka mmadụ iche na ya abaghị uru. (2 Ndị Kọrịnt 10:4, 5) Dị ka ihe atụ, gụọ amaokwu Baịbụl ndị a ma chebara ha echiche: Aịzaya 41:10; Jeremaya 31:3; Malakaị 3:16, 17; Luk 12:6, 7; 1 Jọn 3:19, 20.

Ekpere. Obi gị mawa gị ikpe ma ọ bụ i chewe na ị baghị uru, kpee ekpere kọsara Jehova otú ọ dị gị n’obi. (Abụ Ọma 55:22) Chineke agaghị ahapụ gị.

Ndị okenye ọgbakọ. A zụrụ ụmụnna ndị a ka ha ‘dị ka ebe izere ifufe na ebe mgbaba iji zere oké mmiri ozuzo.’ (Aịzaya 32:2) Ha ga-enyere gị aka ka ị kwụsị ileda onwe gị anya ma birikwa ndụ gị na-aga.

Ezigbo ndị enyi. Leruo ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị na-akpa àgwà Ndị Kraịst anya. Chọpụta otú ha si emeso ibe ha. Ka oge na-aga, ị ga-ahụ na ọ bụghị mmadụ niile na-aghọgbu ndị ha sịrị na ha hụrụ n’anya.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Tanya achọpụtawala na ihe a bụ eziokwu. Malite mgbe ọ dị ezigbo obere, ọtụtụ ụmụ nwoke metọrọ ya. Ọ sịrị na ụmụ nwoke ndị ya na ha dị ná mma mere ya ihe gbawara ya obi. Ma, Tanya achọpụtala na e nwere ụmụ nwoke ndị hụrụ ndị ọzọ n’anya n’eziokwu. Olee otú o si chọpụta ihe a?

E nwere di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ha na Tanya na-adị ná mma. Ha na-akpa nnọọ ezigbo àgwà. Tanya kwuru, sị: “Otú nwoke a si eme emeela ka m mata na ọ bụghị ụmụ nwoke niile na-arụ arụrụala. Ọ naghị ekwe ka ọkọ kọọ nwunye ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka Chineke chọrọ ka ụmụ nwoke si na-emeso ụmụ nwaanyị.” *Ndị Efesọs 5:28, 29.

^ para. 27 Ọ bụrụ na mmetọ e metọrọ gị emeela ka ị ghara ịna-eri nri nke ọma ma ọ bụ na-emerụ onwe gị ahụ́ ma ọ bụ na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ghara ịna-ehi ụra nke ọma ma ọ bụ mee ka ị na-eche echiche igbu onwe gị ma ọ bụkwanụ na-eme ka obi na-ajọ gị njọ nke ukwuu, ọ ga-adị mma ka ị gaa hụ dọkịta.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 1: Otú Ị Ga-esi Zere Ya

Ihe atọ ga-enyere gị aka izere ihe ga-eme ka mmadụ manye gị ka gị na ya nwee mmekọahụ.