Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 1: Otú Ị Ga-esi Zere Ya

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 1: Otú Ị Ga-esi Zere Ya

 A sị na e metọrọ mmadụ, gịnị ka ọ pụtara?

Ọ bụ eziokwu na ihe bụ́ “imetọ mmadụ” n’otu obodo nwere ike ịdị iche n’ihe bụ́ imetọ mmadụ n’obodo ọzọ, e nwere ike ikwu na ihe ọ pụtara bụ mmadụ ịmanye onye ọzọ ka ya na ya dinaa. O nwekwara ike ịbụ idina obere nwa ma ọ bụ onye ka na-eto eto, idina onye ikwu mmadụ, ịpị onye ọzọ aka n’ihe o ji bụrụ nwoke ma ọ bụ ihe o ji bụrụ nwaanyị. Onye ọ bụla mere mmadụ ụdị ihe a emetọọla onye ahụ, ọ sọkwa ya ya bụrụ dọkịta, onye nkụzi ma ọ bụ ụkọchukwu. Ọ na-abụ ụfọdụ ndị metọọ mmadụ, ha agwa onye ahụ na ha ga-emesi ya ike ma ọ bụ gbuo ya ma ọ nwaa anwaa gwa onye ọzọ.

Otu nchọpụta e mere gosiri na kwa afọ, a na-emetọ ihe fọrọ obere ka o ruo narị puku mmadụ abụọ na iri puku ise n’Amerịka. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ọkara n’ime ndị a nọ n’agbata afọ iri na abụọ na iri na asatọ.

 Ihe i kwesịrị ịma

  • Baịbụl gosiri na imetọ mmadụ adịghị mma. Baịbụl kwuru ihe mere n’ihe dị ka puku afọ anọ gara aga mgbe ụmụ nwoke abụọ gara Sọdọm. Ìgwè mmadụ ndị ara mmekọahụ na-agba gbasiri mbọ ike idina ụmụ nwoke abụọ ahụ. Ihe a ha mere gosiri ihe mere Jehova ji bibie obodo ahụ. (Jenesis 19:4-13) Iwu Chineke nyere Mozis ihe dị ka puku afọ atọ na narị ise gara aga kwuru na mmadụ ekwesịghị idina onye ikwu ya ma ọ bụ metọọ ya.Levitikọs 18:6.

  • Ọtụtụ ndị e metọrọ bụ ndị ha ma metọrọ ha. Otu akwụkwọ a kpọrọ Talking Sex With Your Kids kwuru na n’ime mmadụ atọ ọ bụla e dinara, mmadụ abụọ n’ime ha bụ ndị ma ha dinara ha. Ọ naghị abụkarị onye na-amabughị ha.

  • A na-emetọ ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị. N’Amerịka, e kee ndị e metọrọ ụzọ iri, otu ụzọ bụ ụmụ nwoke. Otu òtù na-ahụ maka ndị e metọrọ n’Amerịka (ya bụ the Rape, Abuse & Incest National Network), kwuru na ụjọ nwere ike ịna-atụ ụmụ nwoke ndị e metọrọ na ha abụghị nwoke ma ọ bụkwanụ na ha ga na-edinazi ụmụ nwoke ibe ha.

  • Ọ naghị eju anyị anya na a na-emetọ ndị mmadụ n’ọtụtụ ebe. Baịbụl buru amụma na “n’oge ikpeazụ,” ọtụtụ ndị agaghị ‘enwe obi mmadụ,’ kama ha ga ‘na-eme ihe ike,’ ha agaghịkwa ‘na-ejide onwe ha.’ (2 Timoti 3:1-3) O doro anya na ọ bụ àgwà ndị a ka ndị na-amanye ndị ọzọ ka ha na ha nwee mmekọahụ na-akpa.

  • Ọ bụghị onye e metọrọ kpatara ihe mere e ji metọọ ya. E nweghị onye e kwesịrị imetọ ma ọ bụ dinaa n’ike. Ọ bụ naanị onye mere mmadụ ihe arụ a kwesịrị ịta ahụhụ ihe o mere. Ma, e nwere ihe ụfọdụ i nwere ike ime ka a ghara imetọ gị.

 Ihe i nwere ike ime

  • Kpebie ihe ị ga-eme. Mata n’oge ihe ị ga-eme ma mmadụ chọọ ịmanye gị ka unu nwee mmekọahụ, ọ sọkwa ya ya bụrụ onye ikwu gị ma ọ bụ onye gị na ya na-akpa. Nwa agbọghọ aha ya bụ Erin kwuru na ọ bụrụ na mmadụ chọọ ijikere maka nsogbu ọ bụla ndị ọgbọ ya nwere ike inye ya, ọ ga-aka mma ka onye ahụ buru ụzọ chee ihe dị iche iche ha nwere ike ime nakwa ihe dị iche iche yanwa ga-eme ma ọ bụ za ha. O kwuru na ibu ụzọ chewe ụdị ihe ahụ nwere ike ịdị ka onye ahụ amaghị ihe, ma ọ ga-esi ike inweta onye ahụ ma mmadụ nyewe ya nsogbu ka ya na ya nwee mmekọahụ.

    Baịbụl kwuru, sị: “Na-echesinụ nche ike ka otú unu si na-eje ije ghara ịdị ka ndị na-amaghị ihe kama dị ka ndị maara ihe, . . . n’ihi na ụbọchị ndị a jọrọ njọ.”Ndị Efesọs 5:15, 16.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Gịnị ka m ga-eme ma mmadụ metụwa m aka otú m na-achọghị?’

  • Buru ụzọ kpebie otú ị ga-esi apụ n’ebe ahụ. Òtù ahụ na-ahụ maka ndị e metọrọ n’Amerịka kwuru na ọ dị mma ka mmadụ na ndị ezinụlọ ha ma ọ bụ ndị enyi ya nwee ihe ha kpebiri ọ ga-abụ otu onye kwuhaala, ndị ọzọ amata na onye ahụ nọ ná nsogbu, ma onye ya na onye ahụ nọ agaghị aghọta ya. Ọ ga-eme ka ndị enyi onye ahụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ ya bịa kpọpụ ya ebe ahụ ozugbo. Ma, ọ ga-akachakwa mma ma ọ bụrụ na ị naghị aga n’ebe nwere ike ime ka ị banye ná nsogbu.

    Baịbụl kwuru, sị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”Ilu 22:3.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m kpebiri m ga-esi apụ ma nsogbu bịawa?’

    Buru ụzọ kpebie otú ị ga-esi apụ ma nsogbu bịawa

  • Kpebie ihe unu ga-eme na ihe unu na-agaghị eme. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na e nwere onye gị na ya na-akpa, gị na onye ahụ kwesịrị ikwu ihe ndị unu na-ekwesịghị ime na ndị unu nwere ike ime. Ọ bụrụ na onye gị na ya na-akpa echeghị na unu kwesịrị ikpebi ihe ndị unu na-ekwesịghị ịna-eme, ọ pụtara na i kwesịrị ịchọrọ onye ọzọ gị na ya ga na-akpa, onye ga-eji ihe ndị i ji kpọrọ ihe kpọrọ ihe.

    Baịbụl kwuru, sị: ‘Ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya.’1 Ndị Kọrịnt 13:4, 5.

    Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee ihe ndị m ji kpọrọ ihe? Olee ụdị ihe ndị na-abụghị di na nwunye na-ekwesịghị ime?’

GỤKWUO GBASARA YA

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Kwesịrị Ịma Banyere Imetọ Mmadụ?—Nke 2: Otú Ị Ga-esi Enweta Onwe Gị

Gụọ ihe ndị e metọrọ mgbe ha dị obere kwuru nyeere ha aka inweta onwe ha.

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwusawa M Egwuregwu Iberiibe?

Chọpụta ihe bụ́ egwuregwu iberiibe na ihe ị ga-eme ma e gwusawa gị ya.

IHE NDỊ NA-ETO ETO IBE GỊ KWURU

Ihe Ndị Na-eto Eto Kwuru Gbasara Egwuregwu Iberiibe

Lee vidio a ka ị hụ ihe ndị na-eto eto ise kwuru gbasara egwuregwu iberiibe na ihe mmadụ ga-eme ma e gwusawa ya ụdị egwuregwu ahụ.