Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Otú M Ga-esi Mechaa Ihe Niile A Onye Nkụzi Anyị Nyere M Mee n’Ụlọ?

Olee Otú M Ga-esi Mechaa Ihe Niile A Onye Nkụzi Anyị Nyere M Mee n’Ụlọ?

Ihe ndị i nwere ike ime

Chọta ebe dị mma ị ga-anọ na-eme ha. O kwesịghị ịbụ ebe ihe ọ bụla ga-emegharị gị anya. I kwesịrị inwe tebụl n’ebe ahụ. Agbanyekwala tiivi.

Oge yiri ịnyịnya na-awụ gam gam. I kwesịrị ịmụta otú ị ga-esi na-ahazi ya nke ọma

Bụrụ ụzọ mee ihe ndị dị gị mkpa. Ebe ọ bụ na ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ dị gị mkpa, buru ụzọ na-eme ihe ndị ahụ onye nkụzi unu nyere gị ka i mee n’ụlọ tupu i mewe ihe ndị ọzọ.

Asịkwala mgbe e mechara. Dee oge ị ga na-eji eme ihe ndị ahụ onye nkụzi unu nyere gị ka i mee n’ụlọ, ejikwala oge ahụ eme ihe ọzọ.

Hazie otú ị ga-esi eme ha. Kwuo nke ị ga-ebu ụzọ eme, kwuokwa nke abụọ ị ga-eme ma i mechaa, na ndị ọzọ. Dee ha n’akwụkwọ, deekwa oge ị ga-eji emecha nke ọ bụla. Nke ọ bụla i mechara, kagbuo ya n’akwụkwọ ahụ.

I metụ, gị ezurutụ ike. Ọ bụrụ na i mewe ihe ndị ahụ isi agbawa gị ghara ghara, kwụsịtụ, zurutụ ike. I zurutụchaa ike, mewekwa ihe ị na-eme.

Obi sie gị ike na ị ga-emeli nke ọma. Cheta na ihe na-emekarị ka nwa akwụkwọ na-eme nke ọma bụ ịgụsi akwụkwọ ike, ọ bụchaghị inwe isi akwụkwọ. (Ilu 10:4) Ị ga-emeli nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Gbalịsie ike, ọ ga-abara gị uru.