Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma A Chọwa M Okwu?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma A Chọwa M Okwu?
  • Gịnị bụ ịchọ okwu?

  • Olee ihe mere ndị mmadụ ji achọ ibe ha okwu?

  • Olee ụdị ndị a na-achọkarị okwu?

  • Gịnị ka ị ga-eme ma a chọọ gị okwu?

Gụọ ụfọdụ ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru na ihe otu onye nkụzi kwuru gbasara ịchọ mmadụ okwu, zaakwa ajụjụ ụfọdụ gbasara ịchọ okwu.

Ịchọ okwu abụghị ihe e kwesịrị ileghara anya. Otu nnyocha e mere na Briten gosiri na e kee ndị na-eto eto gburu onwe ha ụzọ iri, ihe so mee ka ihe karịrị ụzọ anọ n’ime ha gbuo onwe ha bụ na a na-achọ ha okwu.

Gịnị bụ ịchọ okwu?

Ịchọ okwu abụghị naanị iti mmadụ ihe. Ụzọ ụfọdụ e nwere ike isi chọọ mmadụ okwu bụ:

  • Ịkọ mmadụ ọnụ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri abụọ aha ya bụ Celine sịrị: “Ụmụ nwaanyị nwere ọnụ ọjọọ. Enweghị m ike ichefu aha ndị ha kpọrọ m ma ọ bụ ihe ndị ha kwuru. Ha mere ka m yie onye na-abaghị uru, onye a jụrụ ajụ, nakwa onye iberiibe. Ọ gaara akara m mma ma a sị na ha tiri m ihe.

  • Ịkpapụ mmadụ iche. Nwa agbọghọ dị́ afọ iri na asatọ aha ya bụ Haley kwuru, sị: “Ụmụ akwụkwọ anyị malitere ịgbara m ọsọ. M bịa ka m soro ha nọrọ na tebụl rie nri, ha anọchie ebe niile ka m ghara iso ha nọrọ. N’afọ ahụ niile, m na-ebe ákwá, e nweghịkwa onye mụ na ya na-anọ eri nri.

  • Isi n’Ịntanet achọ okwu. Nwa okorobịa dị́ afọ iri na anọ aha ya bụ Daniel kwuru, sị: “Naanị obere ihe mmadụ dere na kọmputa zipụ n’Ịntanet nwere ike imebi aha mmadụ ma ọ bụdị kpata nnukwu nsogbu. O nwere ike ịdị ka ihe na-enweghị ike ime eme, ma ọ na-eme.” Iji ekwentị ezipụ foto ma ọ bụ ozi ndị na-adịghị mma sokwa n’otú e si eji Ịntanet achọ mmadụ okwu.

Olee ihe mere ndị mmadụ ji achọ ibe ha okwu?

Lee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ya.

  • A chọrọ hanwa okwu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Antonio kwuru, sị: “Otú ndị ọgbọ m si na-emesi m ike mere ka ike gwụ m, mụ amalitezie ịchọ ndị ọzọ okwu ka ndị ọgbọ m nwee mmasị n’ebe m nọ. M mechara chọpụta na ihe ahụ m mere adịghị mma.

  • Ha mụtara ya n’aka ndị ọzọ. N’akwụkwọ Jay McGraw dere, nke a na-akpọ Life Strategies for Dealing With Bullies, ọ sịrị: ‘Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị na-eto eto ji achọ ndị ọzọ okwu bụ na ọ bụ otú ahụ ka nne ha na nna ha, ụmụnne ha ndị tọrọ ha, na ndị ọzọ nọ́ n’ezinụlọ ha si emeso ibe ha.

  • Ha na-eme ka ha siri ike, ma ụjọ na-atụ ha. N’akwụkwọ Barbara Coloroso dere, nke a na-akpọ The Bully, the Bullied, and the Bystander, o kwuru, sị: “Ụmụaka ndị na-achọ okwu na-eme ka ha ka ndị ọzọ mma iji kpuchie obi ọjọọ na-eme ha nakwa ụjọ ji ha/Obi anaghị adị ụmụaka ndị na-achọ okwu mma. Ọ bụ ya mere ha ji achọ okwu ka obi wee dị ha mma.

Olee ụdị ndị a na-achọkarị okwu?

  • Ndị na-anọ naanị ha. Ụfọdụ ndị na-eto eto ọ na-ara ahụ́ ịkpa ndị ọzọ nso na-anọkarị naanị ha, ya emezie ka ọ dịrị ndị ọchọ okwu mfe ịna-achọ ha okwu.

  • Ndị a na-ele anya na ha gbapụrụ iche. A na-achọ ụfọdụ ndị okwu maka otú ha dị, agbụrụ ha si, okpukpe ha na-ekpe ma ọ bụdị maka na ha nwere nkwarụ. Ihe ọ bụla ndị ọchọ okwu hụrụ ka ha na-eji achọ mmadụ okwu.

  • Ndị ụjọ na-atụkarị. Ndị ọchọ okwu na-ama ndị ụjọ na-atụkarị. Ọ bụ ụdị ndị ahụ ka ọ na-akacha adịrị ha mfe ịchọ okwu, ebe ha ma na ha agaghị emegwara ha.

Gịnị ka ị ga-eme ma a chọọ gị okwu?

  • Emela ka ihe ha na-eme ọ̀ na-ewe gị iwe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kylie kwuru, sị: “Obi na-adị ndị ọchọ okwu ụtọ ma ha mata na ha emeela ka iwe wee gị. Ma, ọ bụrụ na i mee ka ihe ha na-eme ewuteghị gị, ha ga-akwụsị ịchọ gị okwu.” Baịbụl kwuru, sị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.Ilu 29:11.

  • E megwarala ha. Imegwara ha agaghị eme ka ha kwụsị ịchọ gị okwu, kama ọ ga-eme ka ha na-achọsikwu gị okwu ike. Baịbụl kwuru, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.Ndị Rom 12:17; Ilu 24:19.

  • Gbaara nsogbu ọsọ. Gbaa mbọ na-ezere ndị ọchọ okwu. Agala ebe ha nwere ike ịchọ gị okwu. Emekwala ihe ga-eme ka ha chọọ gị okwu.Ilu 22:3.

  • Mee ihe ha na-atụghị anya ya. Baịbụl kwuru, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.Ilu 15:1.

  • Were ya ka egwuregwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-achọ gị okwu kọrọ gị ọnụ na i buru oké ibu, i nwere ike ịmụmụ ọnụ ọchị, sị ya: “Ọ dị ka ị̀ ma na m kwesịrị ifelatatụ.

  • Si ebe ahụ pụọ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na itoolu aha ya bụ Nora kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị gba nkịtị, ọ ga-egosi na ị ma ihe nakwa na ị ka onye ahụ ike. Ọ ga-egosikwa na ị na-ejide onwe gị, bụ́ ihe onye ahụ na-achọ gị okwu na-agaghị emeli.

  • Gbaa mbọ ka ị ghara ịna-atụ ụjọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rita kwuru, sị: “Ndị ọchọ okwu na-ama mgbe ahụ́ na-erughị gị ala. Ha nweziri ike chọwa gị okwu mgbe ahụ ka ha menye gị ụjọ.

  • Gwa ya onye ọzọ. Otu nnyocha e mere gosiri na ihe karịrị ọkara n’ime ndị e si n’Ịntanet chọọ okwu anaghị akọrọ ya onye ọzọ. O nwere ike ịbụ ihere mere na ha anaghị akọrọ ya onye ọzọ, karịsịa ma ọ bụrụ nwoke ka a chọrọ okwu ahụ. O nwekwara ike ịbụ maka na ha na-atụ ụjọ na a ga-emesikwu ha ike ma ha gwa ya onye ọzọ. Ma, cheta na ndị ọchọ okwu anaghị achọ ka ndị ọzọ mata ihe ha na-eme. N’ihi ya, ịgwa ndị ọzọ banyere okwu a chọrọ gị so n’ihe nwere ike ime ka ha kwụsị ịchọ gị okwu.