Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Mere Papa M na Mama M Anaghị Ekwe M Kporie Ndụ?

Gịnị Mere Papa M na Mama M Anaghị Ekwe M Kporie Ndụ?

Weregodị ya na ihe a na-eme ugbu a:

Ị chọrọ ịga oriri na nkwari, ma ị maghị ma papa gị na mama gị hà ga-ekwe gị gaa. Olee ihe ị ga-eme?

  1.  M GA-AGA, MA M GAGHỊ AGWA HA

  2.  M GAGHỊ AGA, M GAGHỊKWANỤ AGWA HA

  3.  M GA-AGWA HA KA M MARA IHE HA GA-EKWU

 1. M GA-AGA, MA M GAGHỊ AGWA HA

Ihe nwere ike ime ka ị chọọ ime ya: Ị chọrọ ka ndị enyi gị mara na ọ bụ gịnwa na-ekpebi ihe ị na-eme. I chere na ị ma ihe karịa papa gị na mama gị. O nwekwara ike bụrụ na o nweghị ihe i ji okwu ha kpọrọ.—Ilu 14:18.

Ihe ga-eme ma i mee ya: Obi nwere ike ịtọ ndị enyi gị ụtọ, mana ihe ahụ i mere ga-emekwa ka ha mata na ị na-aghọ aghụghọ. Ebe ọ bụ na obi kara gị ịghọ papa gị na mama gị aghụghọ, i nwekwara ike ịghọ ndị enyi gị aghụghọ. Papa gị na mama gị mechaa chọpụta, ọ ga-ewute ha, o nwekwara ike ime ka ha kwụsị gị ịga ebe ndị ọzọ ị chọrọ ịga.—Ilu 12:15.

 2. M GAGHỊ AGA, M GAGHỊKWANỤ AGWA HA

Ihe nwere ike ime ka ị chọọ ime ya: I chechaala ịga ebe ahụ ma cheta na ihe a na-aga ime ebe ahụ adịghị mma. Ma ọ bụkwanụ, ị chọpụtala na ụfọdụ ndị ga-abịa ya anaghị akpa àgwà ọma. (1 Ndị Kọrịnt 15:33; Ndị Filipaị 4:8) O nwekwara ike ịbụ na ị chọrọ ịga, ma obi akaghị gị ịgwa ndị mụrụ gị.

Ihe ga-eme ma i mee ya: Ọ bụrụ na ị gaghị n’ihi na ị ma na ọ dịghị mma ịga, obi ga-akakwu gị ịgwa ndị enyi gị na ị gaghị aga. Ma, ọ bụrụ na ihe mere na ị gaghị bụ na obi akaghị gị ịgwa ndị mụrụ gị, i nwere ike nọrọ n’ụlọ, obi ana-ajọ gị njọ, gị ana-eche na ọ bụ naanị gị bụ onye na-anaghị ekpori ndụ.

 3. M GA-AGWA HA KA M MARA IHE HA GA-EKWU

Ihe nwere ike ime ka ị chọọ ime ya: Ị ghọtara na i kwesịrị irubere papa gị na mama gị isi, ị na-akwanyekwara ha ùgwù. (Ndị Kọlọsi 3:20) Ị hụrụ papa gị na mama gị n’anya, ị chọghịkwa ịga n’agwaghị ha n’ihi na ọ ga-ewute ha. (Ilu 10:1) I nwekwara ike ịgwa ha ebe ị chọrọ ịga na ihe mere i ji chọọ ịga.

Ihe ga-eme ma i mee ya: Papa gị na mama gị ga-ama na ị hụrụ ha n’anya, nakwa na ị na-akwanyere ha ùgwù. Ha chọpụtakwa na ebe ị chọrọ ịga adịghị njọ, ha nwere ike ikwe gị gaa.

Ihe Nwere Ike Ime Ka Papa Gị na Mama Gị Sị Gị Agala

Chebaragodị ihe atụ a echiche ka ị mata otu ihe mere ha nwere ike iji sị gị agala. Were ya na a sị gị họrọ ebe ị ga-aga gwuo mmiri, i nwere ike ịhọrọ ebe e nwere ndị na-agụpụta onye mmiri chọrọ iri. Maka gịnị? Maka na mmiri ị na-egwu tọwa gị ụtọ, ọ ga-esiri gị ike ịma mgbe mmiri chọrọ iri gị. Ma ndị ahụ na-agụpụta mmadụ na-anọ n’ebe ha ga-ahụ onye mmiri chọrọ iri. Papa gị na mama gị dị ka ndị ahụ na-agụpụta mmadụ. Ebe ọ bụ na ha ma ihe karịa gị, ha nwere ike ịhụ ihe ọjọọ chọrọ ime gị ma gịnwa ahụbeghị ya. Ha na-eme ka ndị ahụ na-agụpụta onye mmiri chọrọ iri. Ha chọrọ ka i kporie ndụ, ha chọkwara inyere gị aka ka ihe ọjọọ ghara ime gị, n’ihi na ihe ọjọọ mee gị, ị gaghị ekporizi ndụ.

Ihe ọzọ mere ha nwere ike iji sị gị agala bụ na ha achọghị ka ihe ọ bụla mee gị. Ị gwa ha ebe ị chọrọ ịga, ha nwere ike ị sị gị gaa ma ọ bụ gị agala. Ihe ha ga-eji sị gị gaa ma ọ bụ gị agala bụ n’ihi na ha hụrụ gị n’anya. Ị gwa ha ihe ị chọrọ ime, ha ga na-eche ma ò nwere ihe ọjọọ ga-eme gị ma ha kwe gị mee ya. O doo ha anya na o nweghị ihe ga-eme gị, ha ga-ekwe gị mee ihe ahụ.

Ihe Ị Ga-eme Ka Ha Kwe Gị Gaa

Ihe i nwere ike ime

Gwa ha eziokwu: Jụọ onwe gị ihe mere i ji chọọ ịga ebe ahụ. Ọ̀ bụ n’ihi na ihe a ga-eme n’ebe ahụ na-atọ gị ụtọ, ka ọ̀ bụ n’ihi na ị chọrọ ime ihe ụmụaka ibe gị na-eme? Ọ̀ bụ n’ihi na nwa okorobịa ahụ ma ọ bụ nwa agbọghọbịa ahụ ị na-achụ ga-abịa ebe ahụ?’ Nke ọ bụla ọ bụ, gwa papa gị na mama gị. E nwere mgbe ha hà ka gị, ha makwa gị nke ọma. N’ihi ya, ma ị gwara ha ma ị gwaghị ha, ha nwere ike ịma ihe mere i ji chọọ ịga. Obi ga-adị ha ụtọ ma ị gwa ha eziokwu. Ihe ha ga-agwa gị ga-abakwara gị uru n’ihi na ha ka gị mara ihe. (Ilu 7:1, 2) Ma ọ bụrụ na ị gwaghị ha eziokwu, ọ ga-eme ka ha ghara ịtụkwasị gị obi. O nwekwara ike ime ka ha ghara ịsị gị gawa mgbe ọ bụla ị gwara ha na o nwere ebe ị chọrọ ịga.

Mgbe ị ga-agwa ha: Arịọla papa gị na mama gị ihe mgbe ha ka si ọrụ lọta ma ọ bụ mgbe ha na-eme ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. Rịọ ha ihe mgbe obi ruru ha ala. Ma echela ka oge ị ga-aga ebe ahụ ruo tupu gị agwa ha. Ọ bụrụ na ị gwa ha ya mgbe oge ị ga-eji gaa ruru, ị ga-esiwezi ọnwụ ka ha kwe gị gaa. Ha ga-achọ ichebara ya echiche tupu ha ekwe gị gawa. Gwa ha ya n’oge ka ha nwee ike ichebara ya echiche.

Ihe ị ga-agwa ha: Gwa ha hoo haa ihe ị chọrọ ime. Obi anaghị adị ndị nne na nna mma ma ha jụọ nwa ha ihe gbasara ebe ọ chọrọ ịga, ya asị ha, “Amaghị m.” Ọ na-akacha ewe ha iwe ma ọ bụrụ na nwa ahụ zara ha otú ahụ mgbe ha jụrụ ya, sị: “Ole ndị ga-abịa ebe ahụ?” “È nwere onye toro eto bụ́ ezigbo mmadụ ga-abịa?” ma ọ bụkwanụ “Ole mgbe unu ga-emecha?”

Otú ị ga-esi agwa ha ya: Echela na papa gị na mama gị bụ ndị iro gị. Echefula na gị na ha na-achụ otu ihe. I cheta na gị na ha na-achụ otu ihe, ị gaghị eji olu ike arịọ ha ihe. I meda obi rịọ ha ihe, ha nwere ike imere gị ihe ahụ.

Mee ihe ọ bụla ha gwara gị. Ọ ga-eme ka ha na-ele gị anya ka onye torola eto. Ọ ga-emekwa ka ha na-akwanyere gị ùgwù. Mgbe ọzọ ị gwara ha ebe ị chọrọ ịga, ha nwere ike sị gị gaa.

Ndị mụrụ gị yiri ndị na-agụpụta onye mmiri chọrọ iri. Ha nwere ike ịhụ nsogbu gịnwa na-ahụghị