Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Ihe M Ga-eme Ka Papa M na Mama M Na-ekweta Ihe M Gwara Ha?

Olee Ihe M Ga-eme Ka Papa M na Mama M Na-ekweta Ihe M Gwara Ha?

Ihe i nwere ike ime

Chebaragodị ihe a echiche: Otú i si akpa àgwà ọ̀ na-eme ka papa gị na mama gị na-enyo gị enyo?

Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi dere, sị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Ndị Hibru 13:18) Jụọ onwe gị ma ị̀ na-agwa papa gị na mama gị eziokwu mgbe ị na-agwa ha ebe ị chọrọ ịga na ihe ị chọrọ ime.

Select a name below for a true story.

 Lori  Beverly

 Lori

O nwere mgbe m na-ezigara otu nwa okorobịa m hụrụ n’anya ozi iimel na nzuzo. Papa m na mama m mechara chọpụta ma sị m kwụsị ya. Agwara m ha na m ga-akwụsị ya, ma akwụsịghị m. M nọ na-ezigara ya ozi ruo otu afọ. Ọ na-abụ m zigara nwa okorobịa ahụ ozi iimel, papa m na mama m chọpụta, mụ arịọ ha ma gwa ha na agaghị m eme ya ọzọ. E mechaakwa, mụ emee ya ọzọ. O nwere ebe o ruru, ha anaghịzi ekweta ihe ọ bụla m gwara ha!

Olee ihe i chere mere papa na mama Lori ji gharazie ikweta ihe ọ bụla ọ gwara ha?

Ọ bụrụ na ị bụ papa ma ọ bụ mama Lori, olee ihe ị gaara eme? Oleekwa ihe mere ị ga-eji mee ya?

Mgbe mbụ ahụ papa na mama Lori gwara ya ka ọ kwụsị izigara onye ahụ ozi iimel, olee ihe ọ gaara eme iji gosi na ọ bụ ezigbo nwa?

 Beverly

“O nwere mgbe papa m na mama m na-anaghị ekweta na m naghị achụ nwoke. Ma, aghọtala m ihe kpatara ya. N’oge ahụ, mụ na ụmụ nwoke abụọ ndị ji afọ abụọ tọọ m na-eme enyi. Mụ na ha na-ekwu okwu ọtụtụ awa n’ekwentị. Anyị gaa oriri na nkwari, ọ na-abụkarị naanị mụ na ha na-akpa nkata. Ndị mụrụ m naara m ekwentị m ma jide ya ruo otu ọnwa. Ha ekweghịkwa m gaa ebe ọ bụla mụ na ụmụ okorobịa ahụ ga-ahụ.

Ọ bụrụ na ị bụ papa ma ọ bụ mama Beverly, olee ihe ị gaara eme? Oleekwa ihe mere ị ga-eji mee ya?

Ì chere na ihe ahụ papa na mama Beverly mere ya adịghị mma? Ọ bụrụ na i chere otú ahụ, olee ihe mere i ji chee otú ahụ?

Olee ihe Beverly gaara eme ka papa ya na mama ya na-ekweta ihe o kwuru?

Ihe Ị Ga-eme Ka Papa Gị na Mama Gị Kwetawa Ihe I kwuru

Ihe i nwere ike ime

E nwere ike iji ugbu a ị na-eto eto tụnyere ebe i ji nwayọọ nwayọọ na-arị steepụ ụlọ elu. Nwayọọ nwayọọ ka ị ga-ejikwa ghọọ onye torola eto na-akpa ezigbo àgwà

Ihe mbụ ị ga-eme bụ ịchọpụta ebe ị na-anaghị eme nke ọma n’ihe ndị a:

  • Ịlọta mgbe a gwara m lọta

  • Ime ihe m kwuru

  • Ịga ihe n’oge

  • Iji ego m eme ihe bara uru

  • Ịrụcha ọrụ e nyere m n’ụlọ

  • Iteta n’ụra n’echeghị ka mmadụ kpọtee m

  • Idebe ime ụlọ m ọcha

  • Ikwu eziokwu

  • Iji ekwentị ma ọ bụ kọmputa eme ihe bara uru

  • Ikweta ihe m mejọrọ na ịrịọ mgbaghara

  • Ihe ndị ọzọ

Ihe nke abụọ ị ga-eme bụ ikpebisi ike na ị ga na-eme nke ọma n’ebe ndị ahụ ị na-anaghị eme nke ọma. Mee ihe a Baịbụl kwuru: ‘Yipụ mmadụ ochie ahụ, nke kwekọrọ n’ụzọ i si eme omume n’oge gara aga.’ (Ndị Efesọs 4:22) Ka oge na-aga, papa gị na mama gị na ndị ọzọ ga-achọpụta na ịna-emezi nke ọma.—1 Timoti 4:15.

Ihe nke atọ ị ga-eme bụ ịgwa papa gị na mama gị ebe ndị ahụ i kpebirila na ị ga na-eme nke ọma. Kama ịnọ na-ekwu na papa gị na mama gị kwesịrị ikweta ihe ndị ị na-agwa ha, jiri nwayọo jụọ ha ihe ị ga na-eme ka ha ghara ịna-enyo gị enyo.

Ihe ị ga-akpachara anya maka ya: Echekwala na ị gwachaa papa gị na mama gị ihe a, ha ekweta ozugbo. Ha ga-achọgodị ịma ma ị̀ ga-emekwa ihe i kwuru. Ọ bụ ugbu a ka i kwesịrị ibido mewe ihe ndị ahụ i kwuru. Ka oge na-aga, papa gị na mama gị nwere ike kwetawa ihe ị na-agwa ha, ha ga na-ahapụkwu gị ka i jiri aka gị na-ekpebi ihe ị ga-eme. Papa na mama Beverly meere ya otú ahụ. Beverly sịrị: “Ọ dịghị mfe ime ihe ga-eme ka papa gị na mama gị na-ekweta ihe ị gwara ha, ma ọ dị mfe ime ihe ga-eme ka ha na-enyo gị enyo.” O kwukwara, sị: “Otú m si akpa àgwà ugbu a emeela ka papa m na mama m na-ekweta ihe m gwara ha. Obi na-atọkwa m ụtọ!”

Ihe dị mkpa i kwesịrị ime: Ị na-eme nke ọma, papa gị na mama gị agaghịzi na-enyo gị enyo.

 

 

E nwere ike iji ugbu a ị na-eto eto tụnyere ebe i ji nwayọọ nwayọọ na-arị steepụ ụlọ elu. Nwayọọ nwayọọ ka ị ga-ejikwa ghọọ onye torola eto na-akpa ezigbo àgwà