Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Olee Otú M Ga-esi Agwa Papa M na Mama M Gbasara Iwu Ndị Ha Nyere M?

Olee Otú M Ga-esi Agwa Papa M na Mama M Gbasara Iwu Ndị Ha Nyere M?

Ihe i kwesịrị imụta: Mụta otú ị ga-esi na-agwa ha okwu

Ọ bụrụ na gị na ha na-ekwurịta okwu

  • ọ ga-eme ka ha ghọta gị

  • ọ ga-emekwa ka ị ghọta ihe mere ha ekweghị eme ihe ị chọrọ.

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na ị chọrọ ka papa gị na mama gị na-eme gị ka onye toro eto, i kwesịrị ịna-ekwu okwu ka onye toro eto. Olee otú ị ga-esi eme ya?

Mụta ijide onwe gị. I kwesịrị ịna-ejide onwe gị ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na papa gị na mama gị na-ekwurịta okwu nke ọma. Baịbụl kwuru, sị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.Ilu 29:11.

Gịnị ka ihe a Baịbụl kwuru pụtara? Ha na-agwa gị okwu, atamula ntamu, agbachila ha nkịtị, ma ọ bụkwanụ were iwe kwachie ụzọ zọrọ kpim kpim pụwa. Àgwà dị otú a nwere ike ime ka ha nyekwuo gị iwu.

Gbalịa ghọta ihe papa gị na mama gị na-ekwu. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na papa gị na mama gị achọghị ka ị gaa otu nnọkọ oriri na ọṅụṅụ. Kama ịrụwa ha ụka, i nwere ike ịjụ ha, sị:

“Ọ́ bụrụkwanụ na enyi m toro eto, bụ́ ezigbo mmadụ, esoro m?”

Ma eleghị anya, ha agaghị ekwe gị gaa. Ma ọ bụrụ na ị ghọta ihe mere ha ji jụ, ọ ga-aka adịrị gị mfe ịtụ aro ha ga-anabata.

Irubere papa gị na mama gị isi yiri ịkwụ ụlọ akụ̀ ụgwọ i ji ya. Ọ bụrụ na gị ana-erubere ha isi mgbe niile, ha ga na-atụkwasịkwu gị obi.

Mee ka papa gị na mama gị tụkwasị gị obi. Ka e were ya na mmadụ ji ụlọ akụ̀ ụgwọ. Ọ bụrụ na onye ahụ akwụọ ụgwọ o ji n’oge, ụlọ akụ̀ ahụ ga-atụkwasị ya obi. Ha nwedịrị ike ịgbazinyekwu ya ego n’oge ọzọ.

Otú ahụ ka ọ dị n’ezinụlọ. I kwesịrị ịsọpụrụ papa gị na mama gị. Ọ bụrụ na ị na-enupụrụ ha isi mgbe niile, ya ejula gị anya na ha agaghị atụkwasịcha gị obi. Ha nwekwara ike nyowe ihe ọ bụla i mere enyo.

Ma, ọ bụrụ na ị na-eme ihe ga-eme ka ha tụkwasị gị obi ugbu a, ọbụnadị n’obere ihe, ha nwere ike ịtụkwasịkwu gị obi n’oge ọzọ.

 

 

GỤKWUO GBASARA YA

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 1

Ụfọdụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru gbasara ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mmekọ nwoke na nwaanyị, na nwoke na nwaanyị ịkpa.