Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Amụ Asụsụ Ọzọ?

Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Amụ Asụsụ Ọzọ?

Ọ naghị adị mfe ịmụ asụsụ ọzọ. Ịgba mbọ na-amụ ya ga-egosi ma ị̀ na-adị uchu na-adịkwa umeala n’obi. Ma ọ̀ bara uru ịmụ asụsụ ọzọ? Ọtụtụ ndị na-eto eto kwetara na ịmụ asụsụ ọzọ bara uru. Isiokwu a ga-akọwa ihe mere ha ji amụ asụsụ ọzọ.

  • Gịnị mere ndị mmadụ ji amụ asụsụ ọzọ?

  • Gịnị mere o ji esi ike?

  • Olee uru ọ bara?

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị mere ndị mmadụ ji amụ asụsụ ọzọ?

Ọtụtụ ndị na-amụ asụsụ ọzọ n’ihi na ụlọ akwụkwọ ha chọrọ ka nwa akwụkwọ ọ bụla mee ya. Ndị ọzọ na-amụkwa ya n’ihi na e nwere ihe ha chọrọ iji ya eme. Dị ka ihe atụ:

  • Otu nwa agbọghọ bi n’Ọstrelia aha ya bụ Anna chọrọ ịmụta asụsụ ndị Latvia, bụ́ asụsụ ndị obodo mama ya. Ọ sịrị: “Ndị ezinụlọ anyị na-akwado ịga Latvia, m chọrọ ka mụ na ụmụnne m nwee ike ịna-akparịta ma anyị ruo.”

  • Otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Gina, bụ́ onye Amerịka, mụtara Asụsụ Ndị Ogbi nke Amerịka, kwagazie Beliiz ka o nwee ike ijekwuru Jehova ozi. Ọ sịrị: “Naanị ndị onye ogbi ma bụ ndị na-asụ asụsụ ya. Ọ na-atọ ndị mmadụ ụtọ ma m gwa ha na ihe mere m ji mụọ asụsụ ndị ogbi bụ ka m nwee ike ịkụziri ha Baịbụl n’asụsụ ha.”

Ị̀ Maara? Baịbụl buru amụma na a ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke ná “mba niile na ebo niile na asụsụ niile.” (Mkpughe 14:6) Iji mezuo amụma a, ọtụtụ ndị na-eto eto bụ́ Ndịàmà Jehova na-amụ asụsụ ọzọ ka ha nwee ike ikwusakwu ozi ọma n’obodo ha ma ọ bụ n’obodo ọzọ.

Gịnị mere o ji esi ike?

Ọ naghị adị mfe ịmụta asụsụ ọzọ. Otu nwa agbọgho na-eto eto aha ya bụ Corrina kwuru, sị: “Eche m na ihe dị n’ịmụ asụsụ ọhụrụ bụ naanị ịmụta ihe ndị ahụ na-akpọ ihe ọ bụla, ma m chọpụtara na m kwesịkwara ịmụta omenala ha na otú ha si eche echiche. Ịmụ asụsụ ọzọ na-ewe oge.”

Mmadụ kwesịrị ịdị umeala n’obi ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịmụta asụsụ ọzọ. Otu nwa okorobịa mụrụ asụsụ Spanish, aha ya bụ James kwuru, sị: “Ị ga-agba mbọ mụta ịchị onwe gị ọchị n’ihi na a ga-enwe ọtụtụ okwu ị na-agaghị akpọta. Ma, o so n’ihe dị n’ịmụ asụsụ ọzọ.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ọ bụrụ na ị ga-edili ihe ndị ị na-anaghị emeta na ọchị a ga-achị gị, ma ọ bụkwanụ nsogbu ndị nwere ike ịdapụta ma ị kpọjọọ okwu, ọ ga-eme ka ị mụta asụsụ ọzọ nke ọma.

Ihe ndị ga-enyere gị aka: Ike agwụla gị ma ọ bụrụ na ndị ọzọ na-amụta ya ọsọ ọsọ karịa gị. Baịbụl kwuru, sị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya, ọ bụghịkwa n’iji onwe ya tụnyere onye ọzọ.”​—Ndị Galeshia 6:4.

Olee uru ọ bara?

Uru dị n’ịmụ asụsụ ọzọ dị ọtụtụ. Dị ka ihe atụ, otu nwa agbọghọ aha ya bụ Olivia kwuru, sị: “Ị mụta asụsụ ọzọ, gị na ndị si ebe ahụ ị mụrụ asụsụ ha ga-abụ enyi.”

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Mary chọpụtara na ịmụ asụsụ ọzọ na-eme ka ọ dị ya ka è nwere ihe ọ dị mma ya. Ọ sịrị: “Ọ nabughị adị m ka è nwere ihe m dị mma ya, ma ugbu a m na-amụ asụsụ ọzọ, obi na adị m ụtọ mgbe ọ bụla m mụtara okwu ọhụrụ n’asụsụ ahụ.”

Nwa agbọghọ ahụ anyị kwuru okwu ya ná mmalite, aha ya bụ Gina, chọpụtara na iji asụsụ ndị ogbi akụziri ndị mmadụ Baịbụl na-eme ka ọ na-enwekwu obi ụtọ n’ozi ya. Ọ sịrị: “Ihe kacha eme m obi ụtọ bụ ịhụ otú obi na-adị ndị m na-amụrụ ihe ma m jiri asụsụ ha na-amụrụ ha ihe.”

Nke bụ́ eziokwu bụ: Ịmụta asụsụ ọzọ nwere ike inyere gị aka imeta ndị enyi ọhụrụ, mee ka ị mata na e nwere ihe ị dị mma ya, meekwa ka ozi gị na-atọkwu gị ụtọ. Ịmụta asụsụ ọzọ bụ otu ụzọ dị ezigbo mkpa e si ezi “ndị si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile” ozi ọma.​—Mkpughe 7:9.

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ