Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Mere O Ji Dị́ Mma Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?

Gịnị Mere O Ji Dị́ Mma Ịna-akwụwa Aka Ọtọ?

 Ihe mere ọtụtụ ndị anaghị akwụwa aka ọtọ

N’ụwa taa, o nwere ike ịdị ka ịkwụwa aka ọtọ na-eme ka ihe ghara ịgara mmadụ nke ọma. A sị ka e kwuwe, ọtụtụ ndị nwere ike ịna-eche, sị:

  • ‘Ọ bụrụ na m gwa ndị mụrụ m eziokwu, ha agaghịzi na-ekwe m mee ihe ụfọdụ m na-enwe mmasị ime.’

  • ‘Ọ bụrụ na mụ aghọghị aghụghọ n’ule a, m nwere ike ịda.’

  • ‘Ọ bụrụ na mụ ezughị ihe a, m ga-agbalịwa idokọta ego m ga-eji azụ ya.’

Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-eche sị, ‘Ò nwekwaranụ oké ihe ọ bụ? Ọ̀ bụ na mmadụ niile adịghị aghọ aghụghọ?’

Azịza ajụjụ ahụ bụ mba. Ọtụtụ ndị, ma ndị na-eto eto, kweere na ịkwụwa aka ọtọ bara uru. E nwekwara ezigbo ihe mere ha ji kweta. Baịbụl kwuru, sị: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, ọ bụ ya ka ọ ga-aghọrọkwa.” (Ndị Galeshia 6:7) Ihe ọ pụtara bụ na e nwere ihe ga-esirịrị n’ihe ọ bụla anyị mere pụta, o nwere ike ịbụ ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.

Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ọjọọ ịgha ụgha kpataara ụfọdụ ndị.

“E nwere mgbe ghaara mama m ụgha gbasara otu nwa okorobịa mụ na ya na-akparịta n’ekwentị. Mama m ma na ihe m gwara ya abụghị eziokwu. Mgbe m ghara ụgha ahụ ugboro atọ, ezigbo iwe were ya, ya amachie m ime ihe ndị na-amasị m ruo izu abụọ. O machiri m ile tiivi, jichiekwa fon m otu ọnwa. Ihe a mere ka m kwụsị ịghara ndị mụrụ m ụgha.”—Anita.

Ihe ị ga-echebara echiche: Gịnị mere ọ ga-eji wee oge tupu mama Anita amalitekwa ịtụkwasị ya obi?

Baịbụl sịrị: “Ebe unu hapụworo okwu ụgha, ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu.”Ndị Efesọs 4:25.

“M ghaara ndị mụrụ m ụgha, chee na nke ahụ agaala. Mgbe e mechara, ha gwara m kwughachi ihe ahụ m kwuru merenụ. Ihe m kwuziri dị iche n’ihe m kwuburu n’ihi na m ghaara ha ụgha chara acha, e nweghịzi m ike icheta otú m si kọbuoro ha akụkọ ahụ. Ọ bụrụ na ị na-ekwu eziokwu, ụdị ihe a agaghị eme gị.”—Anthony.

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe Anthony gaara eme ka ọ ghara imechu onwe ya ihu?

Baịbụl sịrị: “Egbugbere ọnụ ụgha bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ndị na-eme ihe n’ikwesị ntụkwasị obi na-eme ka o nwee obi ụtọ.”Ilu 12:22.

“E nwere otu enyi m na-etinyekarị okwu nnu na ose. Ahụrụ m ya n’anya, na-agbakwa mbọ ka m ghara ịna-atụcha ihe ọ bụla o kwuru. Ma, ọ na-ara m ahụ́ ikweta ihe o kwuru ma ọ bụ ịtụkwasị ya obi.”—Yvonne.

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú itinye okwu nnu na ose na ịgha “obere” ụgha nwere ike isi mebie aha enyi Yvonne?

Baịbụl sịrị: “Anyị na-achọ ka anyị na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.”Ndị Hibru 13:18.

Ọ bụrụ na ntọala ụlọ agbawaa, o nwere ike ime ka ụlọ ahụ daa, otú ahụ ka akwụwaghị aka ọtọ nwere ike imebi aha ọma i nwere

 Uru ịkwụwa aka ọtọ bara

Ugbu a, tụlee ihe ọma nwere ike imere gị ma ị na-akwụwa aka ọtọ.

“E nwere mgbe ego nwaanyị nọ na-aga m n’ihu dapụrụ. Mụ akpọọ ya, nye ya ego ahụ. Obi tọrọ ya ezigbo ụtọ, ya ekelee m. Ọ sịrị m: ‘Ị bụ ezigbo mmadụ. Ọ bụghị mmadụ niile ga-emeli ihe a i mere.’ Obi dị m ụtọ na mmadụ hụrụ ihe ọma m mere.”—Vivian.

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee ihe ọ ga-abụ ya mere o ji ju nwaanyị ahụ anya na Vivian na-akwụwa aka ọtọ? Olee otú ịkwụwa aka ọtọ si baara Vivian uru?

Baịbụl sịrị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị . . . na-eme ezi omume mgbe niile.”Abụ Ọma 106:3.

“Ọrụ ndị ezinụlọ anyị bụ ihichara ndị mmadụ ụlọ. Mgbe ụfọdụ, anyị hichawa ọfis ndị mmadụ, anyị na-ahụ mkpụrụ ego tọgbọ n’ala. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ ya, anyị atụtụrụ ya dowe n’elu tebụl dị́ nso. Ọ fọdịrị obere ka iwe wee otu onye na-arụ ọrụ n’ebe ahụ n’ihi otú anyị si akwụwa aka ọtọ. Ọ sịrị anyị: ‘Ego a enwekwanụghị ihe ọ bụ.’ Ma, ihe a mere ka ọ na-atụkwasị anyị obi.”—Julia.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ebe ọ bụ na e ji ịkwụwa aka ọtọ mara Julia, olee otú o nwere ike isi nyere ya aka mgbe ọ bụla ọ ga-achọ onye ga-ebinyere ya aka n’akwụkwọ ma ọ chọwa ọrụ ọzọ?

Baịbụl sịrị: “Gbalịsie ike ka i chee onwe gị n’ihu Chineke dị ka onye ihe ya dị ya mma, onye ọrụ nke na-enweghị ihe ọ ga-emere ihere.”2 Timoti 2:15.

“N’ebe m na-arụ ọrụ, m ji iri awa isii na anọ rụọ ọrụ. Ma, a kwụrụ m ụgwọ onye rụrụ ọrụ iri awa asatọ. Ọ bụ eziokwu na ọ gaara adị mma ma m were ego ahụ, ma agaghị m emeli ya. M gwara ya onye na-akwụ anyị ụgwọ, obi atọọ ya ezigbo ụtọ. Ihe na-aga nke ọma n’ụlọ ọrụ ahụ. Ma, a sị na m weere ego ahụ, ọ gaara abụ ohi ka m zuru.”—Bethany.

Ihe ị ga-echebara echiche: È nwere ihe dị́ iche n’izu ego ụlọ ọrụ na izu mmadụ ohi?

Baịbụl sịrị: “Onye aghụghọ bụ ihe arụ n’anya Jehova, ma ya na ndị na-eme ihe n’eziokwu na-enwe mmekọrịta chiri anya.”Ilu 3:32.

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ

AKWỤKWỌ Ị GA-EJI EDETU IHE

Ị̀ Na-akwụwa Aka Ọtọ?

Danloduo

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Ka M Ga-eme ma M Mee Ihe Papa M na Mama M Sị M Emela?

Mụta ihe ị ga-eme ka ihe ghara ịka njọ.