Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Ghara Ịna-etinyekarị Anya n’Ihe M Na-eme?

Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Ghara Ịna-etinyekarị Anya n’Ihe M Na-eme?
  • Gịnị mere ndị nne na nna ji etinye anya n’ihe ụmụ ha na-eme?

  • Ihe i nwere ike ime

  • Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

Gịnị mere ndị nne na nna ji etinye anya n’ihe ụmụ ha na-eme?

Papa gị na mama gị na-asị na ihe banyere gị na-echu ha ụra. Gịnwa echee na ha anaghị ekwe gị megharịa ahụ́. Dị ka ihe atụ:

  • Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Erin kwuru, sị: “Papa m na-ewere ekwentị m, jụọ m paswọd m, gụọ ma ozi ndị mmadụ ziteere m ma nke m zigaara ndị ọzọ. M jụ inye ya, ya echee na o nwere ihe m na-ezoro ya.”

  • Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Denise, dị ihe dị ka afọ iri abụọ na abụọ ugbu a, kwuru na mama ya na-aga ele ndị ọ kpọrọ n’ekwentị na ndị kpọrọ ya. O sịrị: “Mama m na-ele akara ekwentị nke ọ bụla, jụọ m onye nwe ya na ihe mụ na onye ahụ kwurịtara.”

  • Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kayla kwuru na mama ya gụrụ otu akwụkwọ ọ na-eji ede ihe ndị gbasara onwe ya. Ọ sịrị: “Ihe m dere n’akwụkwọ ahụ bụ ihe ndị dị m n’obi na ihe ụfọdụ gbasadịrị ya. Ihe ahụ mere ka m kwụsị ide ihe ndị dị m n’obi n’akwụkwọ.”

Nke Bụ́ Eziokwu Bụ: Ọ bụ papa gị na mama gị ka e nyere ọrụ ilekọta gị. Ị gaghịkwanụ agwa ha otú ha ga-esi rụọ ọrụ e nyere ha. Ọ bụrụgodị na ọ dị gị ka hà na-emebiga ya ókè, e nwere ihe i nwere ike ime ka ọ ghara ịdị gị otú ahụ.

Ihe i nwere ike ime

Na-agwa ha ihe ị na-eme. Baịbụl gwara anyị ka anyị “na-eme ihe n’eziokwu n’ihe niile.” (Ndị Hibru 13:18) Gbalịa na-agwa papa gị na mama gị eziokwu. Ị na-agwa ha eziokwu, ọ bụghịzi ihe ọ bụla ị na-eme ka ha ga na-etinye anya na ya.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ị̀ na-eme ihe ndị ga-eme ka mama gị na papa gị tụkwasị gị obi? Ị̀ na-anọfe oge ha nyere gị iji alọta n’ụlọ? Ị̀ na-eme ka ha mata ndị enyi gị ma ọ bụ ihe ndị ị na-eme?

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Delia, sịrị: “M na-eme ihe papa m na mama m chọrọ. M na-agwa ha ihe niile m na-eme, na ihe ọ bụla ha jụrụ m. O mere ka ha tụkwasị m obi, ọ bụghịzi ihe ọ bụla m na-eme ka ha na-etinye anya na ya.”

Na-enwe ndidi. Baịbụl sịrị, “Na-emenụ omume dị mma.” (1 Pita 2:12) Ọ na-ewe oge ime ka mmadụ tụkwasị gị obi, ma ị gbaa mbọ mee ka a tụkwasị gị obi, ọ ga-abara gị uru.

Ihe ị ga-echebara echiche: E nweburu mgbe papa gị na mama gị bụ ndị na-eto eto. Olee ihe i chere mere ha ji na-etinye anya na ihe ndị ị na-eme ebe ọ bụ na e nweela mgbe ha bụ ndị na-eto eto?

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Daniel kwuru, sị: “Echere m na ndị nne na nna na-echeta ihe ndị ha na-emetaghị mgbe ha na-eto eto, ha achọghịkwa ka ụmụ ha mee ụdị ihe ahụ.”

Na-echebara ha echiche. Gbalịa lee ihe anya otú ndị mụrụ gị si ele ya. Baịbụl gwara anyị na ezigbo nwaanyị “na-eleru anya n’ihe ndị na-eme n’ezinụlọ ya” nakwa na ezigbo nna na-azụlite ụmụ ya “n’ọzụzụ na nduzi echiche nke si n’aka Jehova.” (Ilu 31:27; Ndị Efesọs 6:4) O nweghị otú ọzọ ha ga-esi mee ihe ndị a ma ọ bụrụ na ha anaghị etinye anya n’ihe ị na-eme.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna ma ihe ya na ndị na-eto eto na-alụ, ị̀ ga-ahapụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwaanyị ka ọ na-eme ihe ọ bụla masịrị ya n’ajụghị ya ihe ọ na-eme?

Otu nwa okorobịa aha ya bụ James kwuru, sị: “Mgbe mmadụ na-eto eto, ọ na-adị ya ka ndị mụrụ ya anaghị ekwe ya ṅụrụ mmiri tọgbọ iko. Ma ugbu a m torola, amatala m na ihe mere ha ji eme ya bụ na ha hụrụ gị n’anya.”