Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwusawa M Egwuregwu Iberiibe?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Mmadụ Gwusawa M Egwuregwu Iberiibe?
  • Gịnị bụ egwuregwu iberiibe?

  • Gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a na-egwusa m egwuregwu iberiibe?

Gịnị bụ egwuregwu iberiibe?

Ọ bụ mmadụ ime onye ọzọ ihe ọ bụla gosiri na ọ chọrọ ka ha nwee mmekọahụ. O nwere ike ịbụ ibi mmadụ aka ebe a na-ekwesịghị ibi ya aka ma ọ bụkwanụ ịgwa ya okwu iberiibe. Ma, mgbe ụfọdụ, ọ naghị adịrị mmadụ mfe ịma ma ọ̀ bụ egwuregwu nkịtị ka a na-egwusa ya, ma ọ̀ bụ ọchụchụ ka a na-achụ ya, ma ọ̀ bụkwanụ egwuregwu iberiibe ka a na-egwusa ya.

Olee otú ị ga-esi mata mgbe mmadụ na-egwusa gị egwuregwu iberiibe? Ị ga-ama azịza ya ma ị zaa ajụjụ atọ a anyị jụrụ gbasara igwusa mmadụ egwuregwu iberiibe.

E nwekwara ike igwusa mmadụ egwuregwu iberiibe mgbe onye ahụ gụcharala akwụkwọ, na-arụ ọrụ. Ọ bụrụ na gị amara ihe ị ga-eme ma mmadụ gwusa gị egwuregwu iberiibe ugbu a, ọ ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme ma e gwusa gị egwuregwu iberiibe n’ebe ị na-arụ ọrụ. Ọ bụrụ na i mee ihe ahụ, o nwekwara ike ime ka onye ahụ ghara ime ya ndị ọzọ.

Gịnị ka m kwesịrị ime ma ọ bụrụ na a na-egwusa m egwuregwu iberiibe?

O yiri ka ndị mmadụ hà ga-akwụsị igwusa gị egwuregwu iberiibe ma ọ bụrụ na ị mara ihe bụ́ egwuregwu iberiibe na ihe ị ga-eme ma egwusa gị ya. Ka anyị tụlee ihe atụ atọ na ihe ị ga-eme ná nke ọ bụla n’ime ha.

IHE ATỤ:

Ifeoma, onye dị iri afọ abụọ kwuru, sị: “N’ebe m na-arụ ọrụ, o nwere ụfọdụ ụmụ okorobịa tọrọ m ezigbo ọtịtọ. Ha na-enye m nsogbu mgbe niile, na-agwa m na m mara mma. Ha na-ekwukwa na ọ dị ha ka ha bụrụ ọgbọ m. Otu ụbọchị, otu n’ime ha bịara m nso, na-akpa m aka ná ntutu isi.

Ifeoma nwere ike iche na nwa okorobịa ahụ ga-akwụsị ya ma ya gbachie ya nkịtị.

Gịnị mere na i kwesịghị ịgbachi nkịtị? Ndị ọkachamara na-ekwu na ọ bụrụ na mmadụ na-egwusa gị egwuregwu iberiibe ma ọ bụ na-agwa gị okwu iberiibe, gị agbachie ya nkịtị, ọ gaghị akwụsị ya. O nwedịrị ike mewe nke ka njọ.

Kama ịgbachi nkịtị, gbalịa gwa onye ahụ ka ọ kwụsị ya, abakwarala ya mba. Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Ego kwuru, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ ebie m aka ebe ọ na-ekwesịghị ibi m aka, m na-agwa ya anwakwala ya anwa mgbe ọzọ. Ọ na-eme ka onye ahụ ghọta na m dị iche.” Ọ bụrụ na onye ahụ akwụsịghị ya, ọnụ ajụla gị oyi. Nọgide na-agwa ya ka ọ kwụsị ya. Baịbụl gwara anyị na ọ bụrụ na mmadụ emee anyị ụdị ihe a, anyị kwesịrị ịkwụsi ike n’ime ihe dị mma. Obi kwesịkwara ịka anyị mgbe anyị na-agwa ya ka ọ kwụsị ya.Ndị Kọlọsi 4:12.

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ahụ agwa gị na ya ga-emesi gị ike? Ya gwa gị otú ahụ, gbachie ya nkịtị, sikwa ebe ahụ pụọ ozugbo. Gaa kọọrọ ya otu enyi gị tọrọ gị.

IHE ATỤ:

Ezinne, onye dị afọ iri na asatọ kwuru, sị: “Mgbe m dị ihe dị ka afọ iri na otu, ụmụ akwụkwọ anyị abụọ jichiri m na paseeji ụlọ akwụkwọ anyị. Ha bụdị ụmụ nwaanyị ibe m. Otu na ụmụ nwaanyị ibe ya na-enwe mmekọahụ, ọ chọrọ ka mụ na ya soro gaa ebe ọ chọrọ ịga. Ajụrụ m na agaghị m eso ya. Ma, ha nọgidere na-enye m nsogbu mgbe ọ bụla onye nkụzi na-anọghị na klas anyị. O nwedịrị ụbọchị ha kwara m aka, mụ akụọ isi n’ahụ́ aja.

Ezinne nwere ike iche na ọ bụrụ na ya agwa mmadụ ihe merenụ, onye ahụ nwere ike ikwu na ọ maghị nke a na-akọ. O nwekwara ike iche na o nweghị onye ga-ekweta na ihe ọ na-ekwu bụ eziokwu.

Gịnị mere i kwesịrị iji akọrọ ya onye ọzọ? Ọ bụrụ na ị gaghị kọọrọ ya onye ọzọ, onye ahụ agaghị akwụsị inye ma gịnwa ma ndị ọzọ nsogbu.Ekliziastis 8:11.

Kama ị ga-agbachi nkịtị, kọọrọ ya onye ọzọ ka o nyere gị aka. Ọ bụrụ na ị kọọrọ ya papa gị, mama gị, ma ọ bụ ndị nkụzi gị, ha nwere ike ịgwa gị ihe ị ga-eme ka onye ahụ kwụsị inye gị nsogbu. Ma, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na onye ị kọọrọ ya ewere na ihe ahụ enweghị ihe ọ bụ? Ihe i nwere ike ime bụ, mgbe ọ bụla onye ahụ gwusara gị egwuregwu iberiibe, dee ya n’akwụkwọ. Dee ụbọchị o gwusara gị ya, oge o gwusara gị ya, ebe ọ nọ gwusa gị ya nakwa ihe o kwuru. Nyezie papa gị ma ọ bụ mama gị ma ọ bụkwanụ onye nkụzi gị akwụkwọ ahụ. Ya hụ ya, ọ ga-ama na ihe ị na-agwa ya bụ eziokwu n’ihi na ọtụtụ ndị anaghị eji ihe e dere ede egwu egwu.

Ì chere na ihe ga-aka njọ ma ọ bụrụ na a kọọrọ ya onye ọzọ? Pịa ebe a ka ị hụ ihe Ugochi kwuru.

IHE ATỤ:

Ugomma, onye dị afọ iri na asatọ kwuru, sị: “O nwere otu nwa okorobịa m na-atụ ụjọ n’ụlọ akwụkwọ anyị. Ọ dị ezigbo ogologo, buokwa ibu. O kwuru na o nweghị ihe ga-eme ka mụ na ya ghara inwe mmekọahụ. Ọ na-enyekwa m nsogbu mgbe ọ bụla ọ hụrụ m. O megidere ihe a ruo otu afọ. O nwere otu ụbọchị naanị mụ na ya nọ klas, ya abịawa ebe m nọ. Ihe m mere bụ si n’oche malie, gbapụ n’èzí.

Ugomma nwere ike iche na ihe a bụ àgwà ụmụ okorobịa.

Gịnị mere na iche otú ahụ adịghị mma? O yiri ka onye ahụ agaghị agbanwe ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-eche na o nweghị ihe o mere, na ọ bụ àgwà ụmụ okorobịa.

Kama iche otú ahụ, ewerela ya na ọ bụ ihe egwuregwu ma ọ bụkwanụ chịwa ọchị. Mee ka ọ ghọta na ihe ahụ ọ na-eme na-ewe gị iwe, nakwa na o kwesịghị ịnwa ya anwa mgbe ọzọ.

Gịnị Ka M Kwesịrị Ime?

IHE MERE EME:

Ifeoma kwuru, sị: “Anaghị m achọ ịgwa ndị mmadụ okwu ọjọọ. Ọ bụ ya mere na mgbe ọ bụla ụmụ okorobịa na-egwusa m egwuregwu iberiibe ma ọ bụ na-agwa m okwu iberiibe, m na-agwa ha kwụsị ya. Ma, ọnụ anaghị aka m mgbe m na-agwa ha ya. Ọ na-abụ m na-agwa ha ya, mụ ana-amụmụ ọnụ ọchị. Ha na-eche na ihe ahụ ha na-eme m dị m mma.

  • A sị na ị bụ Ifeoma, gịnị ka ị gaara àgwà ụmụ okorobịa ahụ? Gịnị mere ị gaara eji gwa ha ya?

  • Gịnị ka ị ga-eme, mmadụ echewe na ihe ọ na-eme gị ma ọ bụ na ihe ọ na-agwa gị dị gị mma?

IHE MERE EME:

Ugochi kwuru, sị: “O nwere ụmụ okorobịa mụ na ha nọ na klas. Ha bidoro gwawa m okwu iberiibe. M gbachiri ha nkịtị ruo izu ụfọdụ, ma ha akwụsịghị ya. Kama, ha nọ na-agwa m nke ka njọ. Ihe ha bidoziri ime bụ ebe ọ bụla ha hụrụ m, ha abịa nọrọ m n’akụkụ konye m aka. M na-akwapụ ha, ma ha akwụsịghị ya. Otu ụbọchị, otu n’ime ha dere okwu iberiibe n’akwụkwọ, nye m. M gara nye onye nkụzi anyị akwụkwọ ahụ. Nke a mere ka a chụọ ya n’ụlọ akwụkwọ. Ihe a mere ka m ghọta na m gaara aga kọọrọ onye nkụzi anyị mgbe ahụ ha malitere ịgwa m okwu iberiibe.

  • Olee ihe i chere mere na Ugochi agaghị kọọrọ onye nkụzi ha mgbe ahụ ha ka malitere ịgwa ya okwu iberiibe? Ì chere na otú ahụ ọ na-agaghị kọọrọ onye nkụzi ha dị mma? Ọ bụrụ na ọ dị mma, gịnị mere i ji chee na ọ dị mma? Ọ bụrụ na ọ dịghị mma, oleekwa ihe mere i ji chee otú ahụ?

IHE MERE EME:

Ebere kwuru, sị: “O nwere otu ụbọchị nwanne m nwoke aha ya bụ Onyema na-asa ahụ́, otu nwa okorobịa abata n’ebe ahụ. Ọ gwara Onyema ka o susuo ya ọnụ, ma ọ jụrụ. O siri ọnwụ na Onyema ga-esusurịrị ya ọnụ. O kweghị apụ ruo mgbe Onyema kwapụrụ ya.

  • Ì chere na ọ bụ egwuregwu iberiibe ka nwa okorobịa ahụ gwusara Onyema? Ọ bụrụ na i chere na ọ bụ ya, gịnị mere i ji chee otú ahụ? Ọ bụrụ na i chere na ọ bụghị ya, oleekwa ihe mere i ji chee otú ahụ?

  • Olee ihe i chere mere na ụfọdụ ụmụ okorobịa anaghị akọrọ mmadụ ma nwa okorobịa ibe ha gwusa ha egwuregwu iberiibe?

  • Ì chere na otú ahụ Onyema si kwapụ nwa okorobịa ahụ dị mma? A sị na ị bụ Onyema, gịnị ka ị gaara eme?

Gụọkwa isiokwu bụ́: Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Ghara Idina M n’Ike?