Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Efe M Yi Ọ̀ Dị Mma?

Efe M Yi Ọ̀ Dị Mma?

Gịnị mere i ji kwesị ịkpachara anya gbasara ụdị efe ị na-eyi? Ọ bụ n’ihi na efe anyị na-eme ka a mata ụdị onye anyị bụ. Olee ihe uwe ị na-eyi na-agwa ndị mmadụ?

 Ihe atọ na-adịghị mma ndị mmadụ na-eme na otú ị ga-esi zere ha

Nke #1: Iji ụdị ejiji a na-egosi na tiivi nakwa n’ebe ndị ọzọ a na-akpọsa ngwá ahịa.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Theresa kwuru, sị: “Mgbe ụfọdụ, m na-achọ iyi efe ndị na-ewu ewu n’ihi na ahụla m ọtụtụ ihe banyere ya n’ebe a na-akpọsa ihe ndị gbara ọhụrụ. Ọ bụrụ na ihe juru mmadụ isi bụ foto ndị yi efe na-ewu ewu, ọ ga-eme ka onye ahụ chọsiwe ike iji ejiji ka ndị ahụ.”

Ọ bụghị naanị ụmụ agbọghọ ka ihe a na-akpọsa n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-adọrọ. Otu akwụkwọ Bekee a na-akpọ The Everything Guide to Raising Adolescent Boys kwuru, sị: “Ihe na-ewu ewu na-amasịkwa ụmụ okorobịa. Ndị na-akpọsa ngwá ahịa na-agba mbọ iwepụta ihe ga-amasị ha malite mgbe ha ka dị obere.”

Ihe ka mma i kwesịrị ime: Baịbụl kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-amaghị ihe na-ekweta okwu niile, ma onye maara ihe na-echebara nzọụkwụ ya echiche.” (Ilu 14:15) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, mụta ịna-echebara ihe ndị pụtara ọhụrụ echiche. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ị hụ efe e dere okwu Bekee bụ́ “sassy,” “hot,” ma ọ bụ “sexy,” jụọ onwe gị, sị:

  • ‘Ọ bụrụ na m yiwe ụdị ákwà a, ònye ka ọ ga-abara uru?’

  • ‘Olee ụdị onye ndị mmadụ ga-asị na m bụ?’

  • ‘Ọ̀ bụ ụdị onye ahụ ka bụ n’eziokwu?’

Ihe i nwere ike ime: Jiri otu izu leruo ákwà ndị na-ewu ewu anya, ma ndị nke a na-egosi na tiivi ma ndị nke a na-egosi n’ebe a na-ere ákwà. Olee ụdị ndị na-eyi ụdị uwe ahụ? È nwere ihe ndị na-ere efe ahụ na-eme ma ọ bụ na-ekwu nke ga-eme ka i chewe na i kwesịrị ịna-eyi ụdị efe ahụ? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Karen kwuru, sị: “Otú ndị mmadụ si ekwu gbasara uwe ndị na-ewu ewu na-emezi ka ọ gụwa ọtụtụ ndị agụụ iyi efe ndị kacha mma iji gosi na ha sokwa biri, ndị ga-emekwa ka a hụ na ahụ́ ha mara mma. Ọ na-adịrị ndị na-akpọsa ngwá ahịa ghọtara ihe a mfe inweta ndị na-eto eto.”

Nke #2: Iji ejiji na-ewu ewu ka ha wee dị́ ka ibe ha.

Otu nwa okorobia aha ya bụ Manuel sịrị: “Ọ bụrụ na e nwere otu efe na-ewu ewu, onye ọ bụla ga-achọrịrị iyi ya. Ma i yighị ya, ndị mmadụ ga-ewere gị ka onye ime ọhịa.” Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Anna kwetara ihe a. Ọ sịrị, “Mkpa ndị mmadụ abụghị ma efe ahụ ọ̀ dịkwa mma, kama mkpa ha bụ ka ha dị́ ka ibe ha.”

Ihe ka mma i kwesịrị ime: Baịbụl kwuru, sị: ‘Kwụsịnụ ịbụ ndị na-eme omume dị ka usoro ihe nke a si dị.’ (Ndị Rom 12:2) N’ihi ihe a Baịbụl kwuru, leruo efe ndị i nwere anya ma jụọ onwe gị, sị:

  • ‘Olee ihe m ji ekpebi ụdị efe na-amasị m?’

  • ‘M̀ na-enwe mmasị inwe efe ụlọ ọrụ a ma ama mere?’

  • ‘Mkpa m ọ̀ bụ ịna-eyi efe ga-eme ka ndị ọzọ mata na m sokwa biri?’

Ihe i nwere ike ime: Ị chọọ ịzụ efe, echela naanị gbasara nke na-ewu ewu ga-eme ka ị dị ka ndị ọzọ ma ọ bụ nke oge ya gaferela ga-eme ka ị gbapụ iche. Cheekwa otú efe ahụ ga-esi mee ka ahụ́ ruo gị ala. Ọ bụrụ na ahụ́ rụrụ gị ala, ị gaghị na-echegbu onwe gị ka ị dị́ ka ibe gị.

Nke #3: Iche na ọ bụ efe tapaara n’ahụ́ ma ọ bụ nke ga-eme ka a na-ahụ ahụ́ mmadụ anya ka mma.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jennifer sịrị: “N’eziokwu, mgbe ụfọdụ, mmadụ nwere ike ịchọ iyi efe ga-atapara ya n’ahụ́ ma ọ bụ nke ga-eme ka a na-ahụ ahụ́ ya anya ma ọ bụkwanụ nke dị́ mkpụmkpụ.”

Ihe ka mma i kwesịrị ime: Baịbụl kwuru, sị: “Unu ekwekwala ka mma unu na-achọ bụrụ ịkpa isi efu na iyi ihe ịchọ mma ọlaedo ma ọ bụ iyi uwe elu, kama ka ọ bụrụ mmadụ zoro ezo nke dị n’ime obi.” (1 Pita 3:3, 4) N’ihi ndụmọdụ a Baịbụl nyere, chee banyere ihe ga-akacha eme ka a na-ele gị anya ọma. Ọ̀ bụ mma elu ahụ́ ka ọ̀ bụ inwe àgwà ọma?

Ihe i nwere ike ime: A bịa n’ihe gbasara ejiji, ihe ị ga-eburu n’obi bụ ịna-eji ejiji dị́ mma. N’eziokwu, ọtụtụ ndị ekwetaghịzi otú ahụ, ma chegodị banyere ihe a:

È nwetụla mgbe gị na onye na-ekwu oké okwu ma na-ekwu naanị gbasara onwe ya kparịtara ụka? Ọ dị mwute na onye ahụ amaghị na ihe ahụ ọ na-eme ga-eme ka ị na-agbara ya ọsọ.

Ọ bụrụ na ị na-eyi efe ga-eme ka ọ dị́ ka ị̀ na-asị ndị mmadụ, ‘lewenụ m,’ ọ ga-eme ka ha gbawara gị ọsọ

Ọ bụrụ na ị na-eji ejiji otú na-adịghị mma, ị ga-adị ka onye ahụ. Ọ ga-adị ka a ga-asị na ejiji gị na-agwa ndị mmadụ, sị: ‘Lewenụ m.’ O nweziri ike ime ka ahụ́ ghara iru gị ala ma ọ bụ ka onwe gị na-ebu gị isi. O nwere ike ime ka ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike ka ndị mmadụ na-ele gị, ma ndị ọma ma ndị ọjọọ.

Ị manụ na ndị na-akpọsa ngwá ahịa bụ ndị nwere ihe ha chọrọ ire ere. N’ihi ya, kama ịna-eyi efe ga-atapara gị n’ahụ́, na-eji ejiji dị́ mma. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Monica kwuru, sị: “Iji ejiji dị́ mma apụtaghị na ị ga na-ejizi ejiji ka nne nne gị. Kama, ọ pụtara na ị na-akwanyere ma onwe gị ma ndị ọzọ ùgwù.”

Leekwa Ihe Ndị Ọzọ

AKWỤKWỌ Ị GA-EJI EDETU IHE

Ilerukwu Onwe Gị Anya

Danloduo