Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ahụ́ Adịghị M? (Nkebi nke 3)

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ahụ́ Adịghị M? (Nkebi nke 3)

Ahụ́ na-esikarị ndị na-eto eto ike. Ọ na-adịkwa ka ike anaghị agwụ ha agwụ. Ma, ọrịa ọjọọ na-emesi ụfọdụ ndị na-eto eto ike. È nwere ọrịa gị na ya na-alụ? Ọ bụrụ na e nwere, akụkọ V’loria, Justin, na Nisa nwere ike inyere gị aka. Ha atọ bụcha Ndịàmà Jehova. Chọpụta ihe na-enyere ha aka idi ọrịa ọjọọ na-arịa ha.

 V’loria

Kemgbe m dị afọ iri na anọ, m na-arịa ọrịa na-akụrisị ahụ́ a na-akpọ fibromyalgia. Mgbe m gbara iri afọ abụọ, m malitere ịrịa ọrịa ogbu na nkwonkwo nakwa ụdị ọrịa ọjọọ abụọ ọzọ. Ọ na-esiri mmadụ ike ime ihe niile ọ chọrọ ime ma ọ bụrụ na ike na-agwụkarị ya. Mgbe ụfọdụ, ahụ́ na-akpọnwụ m malite n’úkwù m gbadaa, mezie ka m na-anọ n’oche ndị ngwọrọ.

E wezụga nsogbu ọrịa a na-enye m n’ahụ́, m na-echegbukwa onwe m n’ihi na anaghị m enwe ike ime ụmụ irighiri ihe ndị dị ka ide ihe ma ọ bụ ikwughe ihe. M hụ ụmụaka ebe ha na-agagharị, m chewe ihe mere o ji esiri m ezigbo ike ime ka ha. Ọ dị m ka m baghị uru.

Obi dị m ụtọ na ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna m, bụ́ ndị mụ na ha nọ n’otu ọgbakọ na-efe Jehova, na-enyere m aka. Ndị nọ́ n’ọgbakọ anyị na-abịa eleta m ọtụtụ mgbe, mezie ka m ghara ịna-anọ naanị m. Ụfọdụ na-akpọ m ma ha mewe oriri na nkwari, n’agbanyeghị na ọ naghị adịcha mfe isi n’oche ndị ngwọrọ kupụta m, kunye m n’ụgbọala ma kupụtakwa m.

Ndị agadi nọ́ n’ọgbakọ anyị kacha enyere m aka n’ihi na ha ma otú ọ na-adị onye ahụ́ na-adịghị. Ha na-enyere m aka ịghọta ebe ike m ruru nakwa ka obi ghara ịna-ajọ m njọ maka na m naghị emeli ihe ndị ọzọ na-eme. Obi na-akacha atọ m ụtọ mgbe m nọ n’ozi ọma nakwa n’ọmụmụ ihe. (Ndị Hibru 10:25) N’oge ndị ahụ, m na-aghọta na n’agbanyeghị ọrịa m, mụ na ndị ọzọ bụ otu.

M na-echeta na Jehova na-enye anyị ihe ndị ga-enyere anyị aka ịna-edi nsogbu anyị. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ bụrụgodị na mmadụ anyị bụ n’elu ahụ́ na-ala n’iyi, a na-eme ka mmadụ anyị bụ n’ime “dị ọhụrụ kwa ụbọchị.” (2 Ndị Kọrịnt 4:16) Ọ bụ nnọọ otú ọ dị m.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ bụrụ na e nwere ọrịa ọjọọ gị na ya na-alụ, gịnị mere i ji kwesi ịna-akpa ndị ọzọ nso? Ọ bụrụkwa na ahụ́ dị gị, olee otú i nwere ike isi nyere onye na-arịa ọrịa aka?Ilu 17:17.

 Justin

M dara n’ala, enweghị m ike ibili. Ọ dị m ka obi ọ̀ chọrọ ikuchi m, enweghịkwa m ike imegharị ahụ́. E bugara m ozugbo n’ebe a na-elekọta ndị ihe gbata gbata mere. Ná mmalite, ndị dọkịta achọpụtalighị ihe na-arịa m. Ma mgbe ihe ndị a mere m ọtụtụ mgbe, ha chọpụtaziri na ọ bụ ọrịa ọjọọ a na-akpọ ọrịa Lyme.

Ọrịa a kụrụ akwara m niile gwoo gwoo. N’agbanyeghị na ọtụtụ afọ agaala m rịawara ọrịa a, ahụ́ ka na-ama m jijiji, oge ụfọdụ, ọ naghịkwa akwụsị akwụsị. E nwere ụbọchị ahụ́ niile ma ọ bụ mkpịsị aka m ga-egbugide m mgbu, agaghị m enwe ike imegharị ahụ́. Ọ dị ka a ga-asị na nkwonkwo m niile tara nchara.

M na-adị na-eche, sị, ‘Oleekwanụ otú m ga-esi na-arịa ụdị ọrịa a ebe m bụ obere nwa?’ Ihe a m na-eche na-eme ka iwe na-ewe m. M na-ebe ákwá kwa ụbọchị, na-ajụ Chineke ihe mere ụdị ihe a ji eme m. M malitedịrị iche na Chineke ajụla m. Ma, m chetara Job a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl. Job aghọtachaghị ihe mere ọtụtụ nsogbu ji bịara ya, ma ọ nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi. Ọ bụrụ na Job akwụsịghị ife Chineke n’agbanyeghị nnukwu nsogbu ndị ahụ, mụnwa ga-emeli ka ya.

Ndị okenye ọgbakọ anyị na-enyere m ezigbo aka. Ha na-abịa eleta m, na-ajụkwa m otú m mere. Otu okenye gwara m na m chọhaala onye m ga-akọrọ otú obi dị m, mụ kpọọ ya, mgbe sọkwara ya bụrụ. M na-ekele Jehova kwa ụbọchị maka ụdị enyi ndị a.Aịzaya 32:1, 2.

Oge ụfọdụ, ọ na-abụ anyị rịawa nnukwu ọrịa, anyị echefuo na Jehova ma ihe anyị na ya na-alụ. Baịbụl kwuru, sị: “Tụkwasị Jehova ibu arọ gị, ya onwe ya ga-akwadokwa gị.” (Abụ Ọma 55:22) Ọ bụ ihe m na-agba mbọ ime kwa ụbọchị.

Ihe ị ga-echebara echiche: Olee otú ndị hụrụ gị n’anya nwere ike isi nyere gị aka idi ọrịa ọ bụla ị na-arịa?Ilu 24:10; 1 Ndị Tesalonaịka 5:11.

 Nisa

Mgbe m dị ihe dị́ ka afọ iri na ise, m malitere ịrịa ọrịa a na-akpọ ọrịa Marfan. Ọ na-akụrisi nkwonkwo, mee ka ha ghara isi ike. Ọ na-emetụtakwa obi, anya, na ihe ndị ọzọ dị́ mkpa n’ahụ́ mmadụ. Ahụ́ anaghị egbu m mgbu kwa ụbọchị, ma o bido igbu m, ọ na-emesi m ike.

Mgbe mbụ a chọpụtara ihe na-arịa m, m bere ezigbo ákwá. M nọ na-echegbu onwe m na m gaghị enwe ike ịna-eme ihe niile m na-emebu na-atọ m ụtọ. Dị ka ihe atụ, ịgba egwú na-atọ m ụtọ. Ma m cheta na otu ụbọchị, ahụ́ mgbu agaghị ekwe m gbaa egwú ma ọ bụ gaa ije, obi amapụ m.

Nwanne m nwaanyị nyeere m ezigbo aka. O nyeere m aka ka obi ghara ịna-ajọkarị m njọ. Ọ gwara m na m kwesịghị ikwe ka ụjọ jide m n’ihi na ọ ga-eme ka ike ụwa gwụ m. Ọ gwakwara m ka m na-ekpechi ekpere anya n’ihi na Jehova na-aghọta ihe mụ na ya na-alụ karịa onye ọ bụla ọzọ.1 Pita 5:7.

Amaokwu Baịbụl kacha gbaa m ume bụ Abụ Ọma 18:6. Ebe ahụ sịrị: “N’oge m nọ n’ahụhụ, m nọ na-akpọku Jehova, ọ bụkwa Chineke m ka m nọ na-etiku maka enyemaka. O wee nọrọ n’ụlọ nsọ ya nụ olu m, mkpu enyemaka m tiri n’ihu ya wee ruo ya ntị.” Amaokwu ahụ nyeere m aka ịghọta na m kpekuo Jehova ekpere, rịọ ya ka o nyere m aka idi nsogbu m, ọ ga-anụ ekpere m, nyekwara m aka. Ọ gaghị ahapụ m.

Amụtala m na e nweghị ihe o mere ma obi jọọ mmadụ njọ maka nsogbu bịaara ya. Ma, onye ahụ ekwesịghị ikwe ka obi ọjọọ ahụ mee ka ike ụwa gwụ ya ma ọ bụkwanụ mee ka ya na Chineke gharazie ịdị ná mma. Ọ bụghị Chineke na-akpata nsogbu anyị, ọ gaghịkwa ahapụ anyị ma ọ bụrụhaala na anyị emee ka ife ya bụrụ ihe kacha mkpa ná ndụ anyị.Jems 4:8.

Ihe ị ga-echebara echiche: Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata?Jems 1:13.

GỤKWUO GBASARA YA

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Ụwa?

Olee ihe mere nsogbu ji abịara onye ọ bụla, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume?

Baịbụl Ò Nwere Ike Inyere M Aka Ma Ọ Bụrụ na M Na-arịa Ọrịa Na-anaghị Ala Ala?

Ee. Lee ihe atọ nwere ike inyere gị aka idi ọrịa na-anaghị ala ala ị na-arịa.