Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ndị Enyi M Na-agwa M Ka M Mee Ihe Ọjọọ?

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Ndị Enyi M Na-agwa M Ka M Mee Ihe Ọjọọ?

Ihe i nwere ike ime

Ihe mbụ i kwesịrị ime bụ ịmata na ọ sọgodị ya ya bụrụ na ndị enyi gị na-eme ihe na-adịghị mma, ihe gịnwa metara dị gị n’isi.

Ihe nke abụọ bụ ịmata ihe na-akacha arata gị ime ihe na-adịghị mma.

Ihe ọzọ bụzi, jụọ onwe gị, sị, ‘Olee ebe ọ na-akacha adịrị m mfe ime ihe na-adịghị mma?’ (Ọ̀ bụ n’ụlọ akwụkwọ? Ka ọ̀ bụ n’ebe m na-arụ ọrụ? Ka ọ̀ bụ n’ebe ọzọ?) Ọ bụrụ na ị mata ebe ọ na-akacha adịrị gị mfe ime ihe na-adịghị mma, o nwere ike inyere gị aka ka ị ghara ime ihe na-adịghị mma.

Ugbu a, olee ihe ị ga-eme? Ihe mbụ bụ na i kwesịghị ịnọ n’ụdị ebe nwere ike ime ka i mee ihe ọjọọ. (Dị ka ihe atụ: Ọ bụrụ na ọ na-abụkarị ị na-ala akwụkwọ, gị ahụ ụmụ akwụkwọ ibe gị ga na-enye gị sịga ka ị ṅụọ, i nwere ike ịna-esizi ụzọ ọzọ ala.) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị ọ bụla sị na ha bụ ndị enyi gị ma ha ana-agwa gị ka i mee ihe na-adịghị mma abụghị ezigbo ndị enyi gị.

Mgbe ọ bụla i kwere ka ọnwụnwa merie gị, ị na-agbara ọchịchọ gị ohu

Ọ bụ eziokwu na ị gaghị agbanahụcha ihe niile nwere ike ime ka i mee ihe ọjọọ. Otu ụbọchị, i nwere ike ịhụ ihe nwere ike ime ka i mee ihe na-adịghị mma. O nwere ike ịbụ na ị tụtụghị anya ụdị ihe ahụ. Olee ihe ị ga-eme?

Ihe kacha mma ị ga-eme bụ ijikere ejikere!

Chebaragodị ihe a echiche: Jizọs ma ebe ọ kwụ ma a bịa n’ihe gbasara ime ihe ọma na ime ihe ọjọọ. O kpebisiri ike irubere Nna ya isi mgbe niile. (Jọn 8:28, 29) N’ihi ya, ihe ị ga-ebugodị ụzọ mee bụ ị mara ebe ị kwụ.

Ihe ị ga-eme. Legodị ma ị̀ ga-echeta ihe abụọ kwesịrị ime ka ị ghara ikwe ka ihe ọ bụla mee ka i tinye aka n’ihe ọjọọ. Lezie ma ị̀ ga-echeta ihe abụọ i nwere ike ime ga-enyere gị aka ka ị ghara itinye aka n’ihe ọjọọ.

I kwesịghị ịgba nkịtị ka ndị ọzọ na-atụrụ gị ụka. Kata obi mee ihe ọ bụla ị ma dị mma. (Ndị Kọlọsi 3:5) Na-arịọkwa Jehova ka o nyere gị aka ịna-eme ihe dị mma.—Matiu 6:13.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 2

Ụfọdụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru gbasara ụlọ akwụkwọ, ntụrụndụ, ndị ọgbọ gị, papa gị na mama gị, mgbanwe ndị ị na-enwe n’ahụ́ gị, otú obi na-adị gị, na okwu nwoke na nwaanyị.

Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị

Ndị ọgbọ anyị nwere ike ime ka anyị mewe ihe na-adịghị mma. Gịnị ka i kwesịrị ịma banyere ya, olee otú ị ga-esi merie ya?

Enyi Gị Ọ̀ Chọrọ Ka Gị na Ya Nwee Mmekọ Nwoke na Nwaanyị?

I kweta ka gị na enyi gị nwee mmekọ nwoke na nwaanyị, ò nwere uru ọ ga-abara gị? Ị̀ ga-akwa mmakwaara?