Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Ihe M Ga-eme Ka Ndị Mmadụ Na-akpa M Nso?

Olee Ihe M Ga-eme Ka Ndị Mmadụ Na-akpa M Nso?

Ihe i nwere ike ime

Burugodị ụzọ mata ndị ọ kacha e siri gị ike ịkpa nso.

Afọ ndụ ha:

Ndị ọ na-esiri m ike ịkpa nso bụ . . .

  • ndị ọgbọ m

  • ndị tọrọ m

  • ndị tọgburu m atọgbu

Ihe e ji mara ha:

Ndị ọ na-esiri m ike ịkpa nso bụ . . .

  • ndị na-eme egwuregwu

  • ndị na-emete ihe karịa ibe ha

  • ndị ụbụrụ na-aghọ nkọ

Ụdị ndị ha bụ:

Ndị ọ na-esiri m ike ịkpa nso bụ . . .

  • ndị obi kara

  • ndị a ma ama

  • ndị na-akpa iche

Ihe nke abụọ ị ga-eme bụ ịchọpụta ihe ị na-eme ma gị na ha nọrọ. Kanyezie ihe na nke ọ bụla n’ime ihe e kwuru n’okpuru ebe a dabara n’ihe ị na-eme ma gị na ha nọrọ.

  • M na-eme ka mụ na ha ànyị bụ otu.

  • M na-ekwu ihe na-amasị m, ọ bụghị ihe na-amasị ha.

  • M na-agbachi nkịtị ma na-achọ otú m ga-esi si ebe ahụ pụọ.

Ihe nke Atọ ị ga-eme bụ imete ndị ọzọ enyi. Ọ bụghị mgbe niile ka i kwesịrị ịchọ ka ndị ọzọ bịa mete gị enyi. Mgbe ụfọdụ ị nwere ike ịga mete ha enyi. (Ndị Filipaị 2:4) Olee otú i nwere ike isi eme ya?

Mete ndị na-abụghị ndị ọgbọ gị enyi. Jụọ onwe gị, sị: Olee ihe mere m ji na-emete naanị ndị ọgbọ m enyi ma na-asị na ahụghị m ndị mụ na ha ga-abụ enyi? Nke a yiri mmadụ ịnọ na mmiri na-achọ mmiri ọ ga-aṅụ.

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri abụọ aha ya bụ Helena sịrị: “Mama m gwara m ka m gbalịa ka mụ na ndị tọrọ m na-akpa nkata. Ọ sịrị na m ga-ahụ na ọtụtụ ihe na-amasị m na-amasịkwa ha. Ihe ahụ o kwuru bụ eziokwu, o meekwala ka m nwee ọtụtụ ndị enyi!

Mụta otú gị na ndị ọzọ ga-esi na-akparịta ụka nke ọma. Ihe ndị ga-enyere gị aka bụ: (1) ige ntị, (2) ịjụ ajụjụ (3) ịhụ ndị ọzọ n’anya.—Jems 1:19.

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na asatọ aha ya bụ Serena, sịrị: “Ana m ege ntị nke ọma mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu, anaghị m achọ ka naanị m na-ekwu ihe niile. M chọọ ikwu okwu, ana m agbalị ka m ghara ịna-eto onwe m ma ọ bụ ghara ikwu ihe ga-eme ka e lewe ndị ọzọ anya ọjọọ.

Otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na otu aha ya bụ Jared, sịrị: “Ọ bụrụ na mmadụ agwawa m ihe m na-amaghị, m na-ajụ ya ajụjụ ka ọ kọwakwuoro m ya. Ọ ga-eme ka mụ na ya na-akparịta ụka na-aga.

Otu nwa agbọghọ dị afọ iri na isii aha ya bụ Leah, sịrị: “Abụ m onye ihere. Ọ bụ ihe mere m ji na-agbalịsi ike ka mụ na ndị mmadụ na-akparịta ụka. Ọ bụrụ na mmadụ chọrọ ka ya na ndị ọzọ bụrụ enyi, onye ahụ kwesịrị ịna-emete ndị ọzọ enyi. Ọ bụ ya mere m ji mụta ịna-ekwuru ndị mmadụ okwu.