Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Akwụkwọ?

M̀ Kwesịrị Ịkwụsị Ịga Akwụkwọ?

Lee ihe ndị i kwesịrị ichebara echiche

Afọ ole ka iwu obodo unu kwuru mmadụ ga-agụru akwụkwọ ma ọ́ dịkarịa ala? Ị̀ gụruola ebe ahụ? Ọ bụrụ na ị gụrughị ebe ahụ, ọ gaghị adị mma ma ị kwụsị, n’ihi na ọ bụrụ na ị kwụsị, ọ pụtara na ị naghị ‘edo onwe gị n’okpuru ndị ọchịchị’ otú Baịbụl kwuru.—Ndị Rom 13:1.

Ị̀ mụtala ihe ndị ị chọrọ ịmụta n’ụlọ akwụkwọ? Olee ihe ndị ị chọrọ ịmụta n’ụlọ akwụkwọ? Ọ bụrụ na ị mabeghị ihe ị chọrọ, i kwesịrị ịgba mbọ mata ya. Ma ọ́ bụghị ya, ị ga-adị ka onye banyere ụgbọala ma ọ maghị ebe ọ na-aga. N’ihi ya, gị na papa gị na mama gị kparịta ihe e kwuru n’isiokwu dị n’ala ala, ya bụ, “ Ihe Ndị M Chọrọ Ịmụta n’Ụlọ Akwụkwọ.” Ọ dịghị mma ka ị kwụsị akwụkwọ mgbe ị na-amụtachabeghị ihe gị na papa gị na mama gị kpebiri na ị ga-amụta n’ụlọ akwụkwọ.

Ịkwụsị ịga ụlọ akwụkwọ yiri isi n’ụgbọala wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga

Gịnị mere i ji achọ ịkwụsị? Ụfọdụ n’ime ha nwere ike ịbụ ka i nwee ike kpatawa ego ị ga-eji na-enyere ndị ezinụlọ unu aka ma ọ bụ ka i nwee ike ịna-ewepụta onwe gị enyere ndị ọzọ aka. Ihe ndị na-enweghị isi mere i ji chọọ ịkwụsị ịga akwụkwọ nwere ike ịbụ ka ị gbaara ule ọsọ ma ọ bụkwanụ ka ị kwụsị ime ihe ndị nkụzi unu na-enye gị ka i mee n’ụlọ. Ihe ị ga-eme ugbu a bụ ịjụ onwe gị ihe mere i ji chọọ ịkwụsị. Ọ̀ bụ ezigbo ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ka ọ̀ bụ ihe na-enweghị isi. Ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ịkwụsị ịga akwụkwọ bụ n’ihi na ị chọrọ ịgbara nsogbu ọsọ, i nwere ike imecha kwaa mmakwaara.

Ịkwụsị akwụkwọ dị ka isi n’ụgbọala wụpụ mgbe ị na-erubeghị ebe ị na-aga. O nwere ike ịbụ na ahụ́ erughị gị ala n’ụgbọala ahụ, ma ọ bụkwanụ na ndị gị na ha nọ n’ụgbọala ahụ na-akpasu gị iwe. Ma, i si n’ụgbọala ahụ wụpụ, ị gaghị eru ebe ị na-aga, i nwekwara ike imerụ ezigbo ahụ́. Otú ahụ ka ọ dịkwa n’ịga akwụkwọ. Ị kwụsị akwụkwọ, o nwere ike isiri gị ike inweta ọrụ. I nwetagodị ọrụ, o nwere ike ịbụ na ego a ga na-akwụ gị agaghị aha ka nke a gaara na-akwụ gị ma a sị na ị gụchara.

Kama ịkwụsị, na-edi nsogbu ndị ị na-enwe n’ụlọ akwụkwọ. I mee otú ahụ, ị ga-amụta otú e si enwe ndidi. Ọ ga-enyekwara gị aka idi nsogbu ndị ị ga-enwe ma ị rụwa ọrụ.

 Ihe Ndị M Chọrọ Ịmụta n’Ụlọ Akwụkwọ

Ihe kacha mkpa mere mmadụ ji aga akwụkwọ bụ ka ọ mụta ihe ga-enyere ya aka inweta ọrụ ọ ga-eji na-egbo mkpa ya na nke ezinụlọ ya ma o mechaa nwee ezinụlọ. (2 Ndị Tesalonaịka 3:10, 12) Ì kpebiela ụdị ọrụ ị chọrọ ịrụ na otú ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ga-esi nyere gị aka ịmụta ya? Zaa ajụjụ ndị a ka ha nyere gị aka ịma ma ihe ị na-amụ n’ụlọ akwụkwọ ọ̀ ga-enyere gị aka n’ọrụ ị chọrọ ịrụ:

  • Olee ihe ndị m ma eme? (Dị ka ihe atụ, ị̀ ma otú e si eso ndị ọzọ akparịta ụka? Ọrụ aka ò doro gị anya? E nwee nsogbu, ị̀ ma otú e si achọpụta ihe kpatara ya nakwa otú a ga-esi edozi ya?)

  • Olee ụdị ọrụ m ga-eji ihe m mụtara rụọ?

  • Olee ụdị ọrụ m nwere ike inweta n’ebe m bi?

  • Gịnị ka m na-amụ ugbu a ga-enyere m aka inweta ọrụ?

  • Olee ihe ndị a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ m kwesịrị ịmụ ugbu a ga-enyere m aka ịrụ ụdị ọrụ m chọrọ ịrụ?

Cheta na ihe mere i ji aga akwụkwọ bụ ka ị mụta ihe ga-abara gị uru. Abụla nwa akwụkwọ na-anaghị agụcha agụcha n’ihi na ị chọghị ịrụ ọrụ onye toro eto kwesịrị ịrụ.

 

GỤKWUO GBASARA YA

NDỊ NA-ETO ETO

Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Nke 1

Ụfọdụ isiokwu ndị dị n’akwụkwọ a kwuru gbasara ịṅụ ọgwụ ọjọọ, mmekọ nwoke na nwaanyị, na nwoke na nwaanyị ịkpa.