Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Gịnị Ga-eme Ka Udo Dịrị n’Ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru

Ụmụ mmadụ agaghị emeli ka udo dịrị n’ụwa. Ọ bụ Alaeze Chineke ga-eme ya. Alaeze a bụ ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa, ọ bụkwa Jizọs Kraịst bụ eze ya. Lee otú Baịbụl kwuru ọchịchị a ga-esi mee ka udo dịrị n’ụwa.

  1. Chineke ga-eme ka “agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa.” Ọ ga-eme ka “udo dịkwa n’ụwa, n’etiti ụmụ mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.”—Abụ Ọma 46:9; Luk 2:14, Bible Nsọ Ọhụụ.

  2. laeze Chineke ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa niile. (Daniel 7:14) N’oge ahụ, mba niile ga-abụ otu, o nweghịzi onye ga-ewere na mba ya ka nke ndị ọzọ mma. Ị manụ na ọ bụ ihe a mere mba dị iche iche ji na-ese okwu taa.

  3. Jizọs bụ Eze Alaeze Chineke, Baịbụl kpọkwara ya “Onyeisi Udo.” Udo ọ ga-eweta n’ụwa “agaghị enwe ọgwụgwụ.”—Aịzaya 9:6, 7.

  4. Ndị tigbuo zọgbuo agaghị aba n’Alaeze ahụ n’ihi na Chineke “kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.”—Abụ Ọma 11:5; Ilu 2:22.

  5. Chineke na-akụziri ndị ga-ebi n’Alaeze ya otú ha ga-esi na-ebi n’udo. N’ihi ihe a ọ na-akụziri ha, ha akpụgharịala mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi. Ha anaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha. Ha anaghịkwa amụ otú e si alụ agha.—Aịzaya 2:3, 4.

N’ụwa niile, Chineke na-akụziri ọtụtụ nde Ndịàmà Jehova otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo. (Matiu 5:9) Anyị si n’agbụrụ dị iche iche, birikwa n’ihe karịrị narị mba abụọ na iri atọ. Ma, anyị anaghị alụ ọgụ.

Ndịàmà Jehova na-amụ otú ha na ibe ha ga-esi na-ebi n’udo

 

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Ozi Ọma Ahụ?

Gụọ banyere ozi ọma si n’aka Chineke, ihe mere ozi ahụ ji dị mkpa na ihe i kwesịrị ime.

Olee Ụdị Ndị Anyị Bụ?

Ndịàmà Jehova ole ka ị ma? Gịnị na gịnị ka ị ma banyere anyị?