Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Tora?

Gịnị Bụ Tora?

Ihe Baịbụl kwuru

Okwu bụ́ “Tora” si n’okwu Hibru bụ toh·rahʹ, nke nwere ike ịpụta “ntụziaka,” “nkụzi” ma ọ bụ “iwu.” * (Ilu 1:8; 3:1; 28:4) Ihe atụ ndị na-esonụ na-egosi otú e si kọwaa ihe okwu Hibru ahụ bụ Tora pụtara na Baịbụl.

  • Mgbe ụfọdụ, a na-akpọ akwụkwọ ise ndị mbụ nke Baịbụl Tora. Ha bụ: Jenesis, Ọpụpụ, Levitikọs, Ọnụ Ọgụgụ na Diuterọnọmi. N’asụsụ Grik, a na-akpọ ha Pentatuk, nke pụtara “otu mpịakọta nwere nkebi ise.” Ọ bụ Mozis dere Tora. Ọ bụ ya mere e ji akpọ ya “akwụkwọ Iwu Mozis.” (Jọshụa 8:31; Nehemaya 8:1) Na mbụ, e dere ya n’otu akwụkwọ ma mechaa kewasịa ya ka ọ dị mfe ọgụgụ, dịkwa mfe nghọta.

  • A na-akpọkwa iwu e nyere mba Izrel banyere ihe ụfọdụ Tora. Dị ka ihe atụ “iwu [toh·rahʹ] metụtara àjà mmehie,” “iwu banyere ekpenta,” nakwa “iwu banyere onye Naziraịt.”​—Levitikọs 6:​25; 14:57; Ọnụ Ọgụgụ 6:​13.

  • Mgbe ụfọdụ, Toh·rahʹ nwere ike ịpụta ntụziaka na nkụzi, ma ò si n’aka ndị nne na nna, ndị mara ihe, ma ọ bụ n’aka Chineke.​—Ilu 1:8; 3:1; 13:14; Aịzaya 2:3.

Olee ihe ndị dị na Tora ma ọ bụ Pentatuk?

  • Akụkọ ihe mere eme gbasara otú Chineke si mesoo ụmụ mmadụ malite mgbe Chineke bidoro ike ihe ruo mgbe Mozis nwụrụ.​—Jenesis 1:​27, 28; Diuterọnọmi 34:5.

  • Ihe ndị dị n’Iwu Mozis. (Ọpụpụ 24:3) E nwere ihe karịrị narị iwu isii n’Iwu ahụ. Nke kacha gbaa ọkpụrụkpụ n’ime ha bụ Shema, ma ọ bụ nkwupụta nke okwukwe ndị Juu. Otu ihe e dere na Shema bụ: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Diuterọnọmi 6:4-9) Jizọs kwuru na nke a bụ “iwu kasị ukwuu bụrụkwa nke mbụ.”​—Matiu 22:36-​38.

  • Aha ahụ bụ́ Jehova gbara na ya ugboro otu puku na narị asatọ. Na Tora, e nwere iwu kwuru na ndị mmadụ kwesịrị ịna-akpọ aha Chineke, o gbochighị ndị mmadụ ịkpọ ya.​—Ọnụ Ọgụgụ 6:​22-​27; Diuterọnọmi 6:​13; 10:8; 21:5.

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara Tora

Ụgha: Iwu Tora na-adịru ebighi ebi, a gaghịkwa ahapụ ya.

Eziokwu: Ná nsụgharị Baịbụl ụfọdụ, e kwuru na ihe ụfọdụ e dere na Tora, dị ka ihe gbasara Ụbọchị izu ike, ndị nchụàjà na Ụbọchị Mkpuchi Mmehie “ga-adị ruo ọgbọ ha niile” ma ọ bụ “ọgbụgba ndụ ebighị ebi.” (Ọpụpụ 31:16; 40:15; Levitikọs 16:33, 34, Nsụgharị Union Version) Ma, okwu Hibru e dere n’amaokwu ndị ahụ nwekwara ike ịpụta mgbe a na-amaghị ama, ọ bụghị mgbe ebighị ebi. * Mgbe ihe dị ka narị afọ itoolu Chineke na ụmụ Izrel ji iwu Mozis gbaa ndụ gachara, Chineke buru amụma na ya ga-eji “ọgbụgba ndụ ọhụrụ dochie ya.” (Jeremaya 31:31-33) Mgbe Chineke “sịrị ‘ọgbụgba ndụ ọhụrụ,’ o mewo ka [ọgbụgba ndụ] nke mbụ bụrụ ihe oge ya gafeworo.” (Ndị Hibru 8:7-13) N’ihi àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ n’ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga, e nweziri ọgbụgba ndụ ọhụrụ e ji dochie ọgbụgba ndụ ochie ahụ.​—Ndị Efesọs 2:​15.

Ụgha: E kwesịrị idebe iwu ndị dị n’akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ Talmud nakwa omenala ndị Juu a na-edeghị n’Iwu Chineke otú ahụ e si edebe iwu ndị e dere na Tora.

Eziokwu: O nweghị ebe e kwuru n’Akwụkwọ Nsọ na Chineke nyere Mozis iwu ndị ọzọ a na-edeghị ede ha kwesịrị idebe mgbe o nyechara ha iwu ndị e dere na Tora. Kama, Baịbụl kwuru sị: “Jehova wee gaa n’ihu ịsị Mozis: ‘Deere onwe gị okwu ndị a.’” (Ọpụpụ 34:27) E mechara detuo iwu ndị ahụ a na-edeghị ede n’otu akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah, mechazie denye ya n’akwụkwọ okpukpe ndị Juu bụ́ Talmud. Ihe juru na ya bụ́ omenala ndị Juu ndị Farisii chepụtara. Ọtụtụ mgbe, ihe dị n’omenala ndị ahụ na-adị iche n’ihe ndị e dere na Tora. Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndị Farisii, sị: “Unu emewo ka okwu Chineke ghara ịdị irè n’ihi ọdịnala unu.”—Matiu 15:​1-9.

Ụgha: E kwesịghị ịkụziri ụmụ nwaanyị Tora.

Eziokwu: Otu n’ime ihe e kwuru n’Iwu Mozis bụ ka a gụọrọ ndị Izrel niile Iwu ahụ dum, ma ụmụ nwaanyị ma ụmụntakịrị. N’ihi gịnị? “Ka ha wee gee ntị, ka ha mụtakwa ihe, ka ha tụọ egwu Jehova bụ́ Chineke [ha] ma lezie anya idebe ihe niile e kwuru n’iwu [ahụ].”​—Diuterọnọmi 31:10-​12. *

Ụgha: E nwere ihe ndị e dere na Tora nke ihe ha pụtara dị iche n’ihe e dere.

Eziokwu: Onye dere ihe ndị dị na Tora, bụ́ Mozis kwuru na ihe e dere na ya doro anya dịkwa mfe nghọta, ha adịghị mgbagwoju anya. (Diuterọnọmi 30:11-14) Ihe mere ụfọdụ ndị ji ekwu na ihe ndị e dere na Tora nwere ihe ndị dị iche ha pụtara bụ n’ihi ihe omimi dị iche iche ndị Juu kweere a kpọrọ Kabbalah. Ha na-eji “akọ chepụta” otú ha ga-esi na-akọwa Akwụkwọ Nsọ. *​—2 Pita 1:​16.

^ para. 3 Lee mbipụta e degharịrị edegharị nke akwụkwọ bụ́ The Strongest Strong’s Exhaustive Concordance of the Bible, ihe odide nke 8451 ná nkebi bụ́ “Hebrew-Aramaic Dictionary-Index to the Old Testament.”

^ para. 13 Lee akwụkwọ bụ́ Theological Wordbook of the Old Testament, Mpịakọta nke 2, peeji nke 672-​673.

^ para. 17 N’Iwu ndị Juu, a naghị ekwe ụmụ nwaanyị gụọ Tora, mana ihe e kwuru na Tora bụ na onye ọ bụla kwesịrị ịgụ ya. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Mishnah kwuru ihe otu onye Rabaị aha ya bụ Eliezer ben Hyrcanus kwuru. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla na-akụziri nwa ya nwaanyị Tora, na-akụziri ya okwu rụrụ arụ.” (Sotah 3:4) E dekwara ụdị ihe a n’akwụkwọ iwu ndị Juu a na-akpọ Talmud nke Jeruselem. Ọ sịrị: “Kama a ga-akụziri ụmụ nwaanyị Tora, ọ ka mma na a gbara ya ọkụ.”—Sotah 3:​19a.

^ para. 19 Dị ka ihe atụ, akwụkwọ bụ́ Encyclopaedia Judaica kwuru otú ndị Juu kweere n’ihe omimi dị iche iche si were Tora. Ọ sịrị: “Tora enweghị otu ihe doro anya ọ pụtara, kama e nwere ọtụtụ ihe dị iche iche ọ pụtara n’ebe dị iche iche.”—Mbipụta nke abụọ, Mpịakọta nke 11, peeji nke 659.