Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Gịnị Ka ‘Ịsọpụrụ Nna Gị na Nne Gị Pụtara’?

Gịnị Ka ‘Ịsọpụrụ Nna Gị na Nne Gị Pụtara’?

Ihe Baịbụl kwuru

Iwu ahụ bụ́ “sọpụrụ nna gị na nne gị” pụtara ọtụtụ ugboro na Baịbụl. (Ọpụpụ 20:12; Diuterọnọmi 5:16; Matiu 15:4; Ndị Efesọs 6:2, 3) E nwere ihe anọ iwu ahụ pụtara.

  1. Na-ekele ha. Otu ụzọ ị ga-esi na-asọpụrụ nna gị na nne gị bụ ịna-ekele ha maka ihe niile ha meere gị. Ihe ga-egosi na obi dị gị ụtọ maka ihe ndị ha meere gị bụ ịna-eme ihe ha kwuru. (Ilu 7:1, 2; 23:26) Baịbụl kwuru ka ị na-ele ndị mụrụ gị anya ka “ịma mma” gị, ya bụ, ka i jiri ha na-eme ọnụ.—Ilu 17:6.

  2. Na-erubere ha isi. Ọ bụrụ na ị ghọta na ọ bụ Chineke nyere nna gị na nne gị ikike ịgwa gị ihe ị ga na-eme , ị ga na-asọpụrụ ha, karịchaa mgbe ị ka na-eto eto. Ndị Kọlọsi isi atọ amaokwu nke iri abụọ gwara ndị na-eto eto, sị: “Unu ndị bụ́ ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na nke a na-atọ Onyenwe anyị ụtọ.” Mgbe Jizọs na-eto eto, o rubeere ndị mụrụ ya isi.—Luk 2:51.

  3. Na-akwanyere ha ùgwù. (Levitikọs 19:3; Ndị Hibru 12:9) Otú i si agwa ndị mụrụ gị okwu na ihe ị na-agwa ha ga-egosi ma ị̀ na-akwanyere ha ùgwù ma ọ bụ na ị naghị eme otú ahụ. Ọ bụ eziokwu na mgbe ụfọdụ, ụfọdụ ndị nne na nna na-eme ihe na-eme ka o sie ike ịkwanyere ha ùgwù. Ọ dịgodi otú ahụ, ụmụaka ekwesịghị ịna-akparị ha, kama ha kwesịrị ịna-akwanyere ha ùgwù. (Ilu 30:17) Ihe Baịbụl kwuru gosiri na mmadụ ikwujọ nna ya ma ọ bụ nne ya bụ ihe arụ.—Matiu 15:4.

  4. Na-egboro ha mkpa ha. Ọ bụrụ na nne gị na nna gị emee agadi, ha ga-achọ ka ị na-emere ha ihe ụfọdụ. Ihe i nwere ike ime iji gosi na ị na-asọpụrụ ha bụ ime ike gị niile iji na-egboro ha mkpa ha. (1 Timoti 5:4, 8) Dị ka ihe atụ, obere oge tupu Jizọs anwụọ, o mere ndokwa ka e lekọta nne ya.—Jọn 19:25-27.

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara mmadụ ịsọpụrụ nna ya na nne ya

Ụgha: Ọ bụrụ na ị chọrọ ịsọpụrụ nna gị na nne gị, ị ga-ahapụ ha ka ha na-agwa gị ihe niile ị ga-eme n’alụmdi na nwunye gị.

Eziokwu: Baịbụl na-akụzi na mmadụ kwesịrị iji di ya ma ọ bụ nwunye ya kpọrọ ihe karịa onye ọ bụla ọzọ. Jenesis 2:24 sịrị: “Ọ bụ ya mere nwoke ga-eji hapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya.” (Matiu 19:4, 5) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị di na nwunye nwere ike ịmụta ihe na ndụmọdụ ndị mụrụ ha ma ọ bụkwanụ nke nne na nna di ha ma ọ bụ nwunye ha. (Ilu 23:22) Ma, di na nwunye nwere ike ikpebi na ọ bụghị ihe niile ka ndị nne na nna ha ga-etinyere ha ọnụ.​—Matiu 19:6.

Ụgha: Ọ bụ nne gị na nna gị ka ị ga-akacha erubere isi.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na Chineke nyere ndị nne na nna ikike n’ezinụlọ, ma e nwere ebe ikike ụmụ mmadụ ruru. Ọ karịghị ikike Chineke. Dị ka ihe atụ, mgbe otu ụlọikpe gwara ndị na-eso ụzọ Jizọs ka ha nụpuru Chineke isi, ha sịrị: “Anyị aghaghị irubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị karịa mmadụ.” (Ọrụ Ndịozi 5:27-29) Otú ahụkwa ka ụmụaka kwesịrị irubere ndị mụrụ ha isi “n’ime Onyenwe anyị,” ya bụ, mgbe ọ na-emegideghị iwu Chineke.—Ndị Efesọs 6:1.

Ụgha: Irubere ndị mụrụ gị isi pụtara na ị ga-eso ha ekpe okpukpe ha.

Eziokwu: Baịbụl gwara anyị na anyị kwesịrị iji aka anyị chọpụta ma ihe a na-akụziri anyị ọ̀ bụ eziokwu. (Ọrụ Ndịozi 17:11; 1 Jọn 4:1) Ọ bụrụ na mmadụ achọpụta na ihe okpukpe ndị mụrụ ya na-akụzi abụghị eziokwu, o nwere ike ikpebi ịhapụ ya, họrọ ọzọ. E nwere ụfọdụ ndị Baịbụl kwuru na ha kpere okpukpe dị iche na nke ndị mụrụ ha, ndị dị ka Ebreham, Rut, nakwa Pọl onyeozi.—Jọshụa 24:2, 14, 15; Rut 1:15, 16; Ndị Galeshia 1:14-16, 22-24.

Ụgha: Irubere ndị mụrụ gị isi pụtara na ị ga na-efe ndị nna nna gị hà.

Eziokwu: Baịbụl kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova Chineke gị ka ị na-aghaghị ife ofufe, ọ bụkwa naanị ya ka ị na-aghaghị ijere ozi dị nsọ.” (Luk 4:8) Onye na-efe ndị nna nna ya na-eme ihe na-ewe Chineke iwe. Baịbụl kwudịrị na “ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla.” Ha amaghị ma à na-efe ha, ha enweghịkwa ike imerụ ndị dị ndụ ahụ́.​—Ekliziastis 9:5, 10; Aịzaya 8:19.