Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ònye Bụ Jehova?

Ònye Bụ Jehova?

Ihe Baịbụl kwuru

Jehova bụ Chineke e kwuru okwu ya na Baịbụl. Ọ bụ ya kere ihe niile. (Mkpughe 4:11) Ọ bụkwa ya ka Ebreham na Mozis, bụ́ ndị amụma fere, otú ahụ Jizọs mekwara. (Jenesis 24:27; Ọpụpụ 15:1, 2; Jọn 20:17) Ọ bụghị Chineke otu ndị, kama ọ bụ Chineke “ụwa dum.”Abụ Ọma 47:2.

Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova. Aha a pụkwara iche. (Ọpụpụ 3:15; Abụ Ọma 83:18) Okwu Hibru e si sụgharịta ya pụtara “ịbụ.” Ọtụtụ ndị ọkà mmụta kwuru na ọ pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” Ihe a ha kwuru aha Chineke pụtara dabara nnọọ adaba ebe ọ bụ ya kere ihe niile, na-emezukwa ihe ọ bụla o kwuru. (Aịzaya 55:10, 11) Baịbụl na-enyekwara anyị aka ịmata ụdị Onye Jehova bụ, karịchaa ịmata banyere àgwà ya bụ́ isi, ya bụ, ịhụnanya.—Ọpụpụ 34:5-7; Luk 6:35; 1 Jọn 4:8.

Jehova bụ otú ndị Igbo si ede mkpụrụ akwụkwọ anọ bụ́ יהוה (YHWH), nke bụ́ aha Chineke n’asụsụ Hibru. A na-akpọ ya Tetragramatọn. E nweghịzi onye ma kpọmkwem otú ndị Hibru si kpọọ aha ahụ n’oge ochie. Ma, ọ dịla ezigbo anya a kpọwara Chineke “Jehova” n’asụsụ Igbo. Ebe mbụ ọ gbara bụ na Bible Nsọ nke Union Version a sụgharịrị n’afọ 1913.

Gịnị mere na e nweghịzi onye ma otú ndị Hibru si kpọọ aha Chineke n’oge ochie?

Ọ bụ naanị mgbochiume ka ndị Hibru ji ede ihe n’oge ochie. Ha anaghị etinye ụdaume. Ọ bụzi onye na-agụ ihe e dere n’asụsụ Hibru ga-eji aka ya na-etinye ụdaume ndị dabara adaba. Ma, mgbe e dechara Akwụkwọ Nsọ Hibru (ya bụ, “Agba Ochie”), ụfọdụ ndị Juu bịaziri kwuwe na ọ dịghị mma ịna-akpọ Chineke aha ya. Ma, ihe a ha na-ekwu abụghị eziokwu. Ha gụpụtawa akwụkwọ nsọ ruo ebe e dere aha Chineke, ha ejiri “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke” dochie ya. Ka ọtụtụ narị afọ gara, imirikitiimi bí ná mba dị iche iche bịara kwerewe na ọ dịghị mma ịna-akpọ aha Chineke. Ka oge na-aga, e nweghịzi onye ma otú e si akpọ aha Chineke. *

Ụfọdụ ndị na-ekwu na otú e si akpọ aha Chineke bụ “Yahweh,” ndị ọzọ ana-ekwu ihe ndị ọzọ dị iche. N’otu akwụkwọ Mpịakọta Osimiri Nwụrụ Anwụ, e nwere ebe e ji asụsụ Grik dee ihe ụfọdụ si n’akwụkwọ Levitikọs. Ihe e dere na ọ bụ aha Chineke bụ Iao. Ụfọdụ ndị Grik dere akwụkwọ n’oge ochie kwuru na e nwere ike ịkpọ ya Iae, I·a·beʹ, ma ọ bụ I·a·ou·eʹ. Ma e nweghị ihe gosiri na ọ bụ otú ahụ ka e si kpọọ aha Chineke n’asụsụ Hibru oge ochie. *

Ihe ndị na-abụghị eziokwu gbasara aha Chineke

Ụgha: Na Baịbụl ọ bụla “Jehova” dị na ya, ọ bụ ndị sụgharịrị Baịbụl ahụ ji aka ha tinye ya.

Eziokwu: Mkpụrụ akwụkwọ Hibru anọ e ji asụpe aha Chineke gbara ihe dị ka ugboro puku asaa na Baịbụl. * Ndị sụgharịrị Baịbụl ụfọdụ kpachara anya wepụ aha Chineke, jirizie utu aha dị ka “Onyenwe anyị” dochie ya.

Ụgha: Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile e kwesịghị inwe aha pụrụ iche.

Eziokwu: Chineke ji mmụọ nsọ ya mee ka ndị dere Baịbụl dee aha ya ọtụtụ puku ugboro na Baịbụl. Ọ chọkwara ka ndị na-efe ya na-akpọ aha ya. (Aịzaya 42:8; Joel 2:32; Malakaị 3:16; Ndị Rom 10:13) N’eziokwu, Chineke katọrọ ndị amụma ụgha bụ́ ndị gbara mbọ ime ka ndị mmadụ chefuo aha ya.Jeremaya 23:27.

Ụgha: E kwesịrị iwepụ aha Chineke na Baịbụl n’ihi ihe ndị Juu kweere.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị Juu ekweghị akpọ aha Chineke. Ma, ha ewepụghị ya mgbe ha na-edepụtaghachi Baịbụl. Ka o sina dị, Chineke achọghị ka anyị sowe omenala ndị megidere iwu ya.Matiu 15:1-3.

Ụgha: E kwesịghị ide aha Chineke na Baịbụl n’ihi na e nweghịzi onye ma otú e si akpọ ya n’asụsụ Hibru.

Eziokwu: Ọ bụrụ na ihe a bụ eziokwu, ọ pụtara na Chineke na-atụ anya na ụmụ mmadụ na-asụ asụsụ dị iche iche ga-enwe otu ụzọ ha ga-esi na-akpọ aha ya. Ma, Baịbụl gosiri na ndị fere Chineke n’oge ochie, bụ́ ndị sụrụ asụsụ dị iche iche, kpọrọ aha ndị mmadụ otú dịkwa iche iche.

Ka anyị jiri Jọshụa bụ́ onyeikpe Izrel maa atụ. Ọ ga-abụ na otú Ndị Kraịst na-asụ Hibru n’oge ndịozi Jizọs si kpọọ aha ya bụ Yehoh·shuʹaʽ, ebe ndị na-asụ Grik kpọrọ ya I·e·sousʹ. Baịbụl kwuru otú e si ede aha Hibru ahụ bụ́ Jọshụa n’asụsụ Grik. Ihe a gosiri na Ndị Kraịst kpọrọ aha ndị mmadụ otú e si akpọ ya n’asụsụ obodo ha.Ọrụ Ndịozi 7:45; Ndị Hibru 4:8.

Otú ahụ ka e kwesịrị ime ma e dewe otú e si akpọ aha Chineke n’asụsụ dị iche iche. Ihe kacha mkpa abụghị otú e si akpọ ya. Kama, ọ bụ ịhụ na ọ dị n’ebe niile o kwesịrị ịdị na Baịbụl.

^ para. 7 Akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia, Mbipụta nke Abụọ, Mpịakọta nke 14, peeji nke 883 ruo 884, kwuru, sị: “Mgbe ndị Juu si n’ebe a dọọrọ ha n’agha lọta, ha malitere ịna-eche na mmadụ ekwesịghị ịna-akpọ Yahweh n’ihi na ọ bụ aha dị́ nsọ. O mekwara ka a malite ịna-ede ADONAI ma ọ bụ ELOHIM n’ebe e kwesịrị ide Yahweh.”

^ para. 8 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmatakwu gbasara aha Chineke, gụọ isiokwu bụ́ “Otú Aha Chineke Si Gbaa n’Akwụkwọ Nsọ Hibru,” n’akwụkwọ bụ́ Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịghọta Baịbụl.

^ para. 11 Gụọ akwụkwọ bụ́ Theological Lexicon of the Old Testament, Mpịakọta nke 2, peeji nke 523 ruo 524.

GỤKWUO GBASARA YA

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Olee Otú Ị Ga-esi Bịaruo Chineke Nso?

Chọpụta ma Chineke ọ̀ na-anụ ekpere niile, otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere, na ihe anyị ga-eme ka anyị bịaruo Chineke nso.