Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

Olee Mgbe A Mụrụ Jizọs?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Lee ihe akwụkwọ ụfọdụ kwuru iji gosi na o kwughị ụbọchị a mụrụ ya:

  • A maghị ụbọchị a mụrụ Kraịst.”—New Catholic Encyclopedia.

  • O nweghị onye ma kpọmkwem ụbọchị a mụrụ Kraịst.”—Encyclopedia of Early Christianity.

Ọ bụ eziokwu na Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs, ma o nwere ihe abụọ o kwuru mere n’oge a mụrụ Jizọs mere ọtụtụ ndị ji mata na ọ bụghị n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba ka a mụrụ ya.

A mụghị Jizọs n’oge oyi

  1. Ideba aha n’akwụkwọ. Obere oge tupu a mụọ Jizọs, Siza Ọgọstọs nyere iwu “ka e deba aha elu ụwa dum mmadụ bi n’akwụkwọ.” Onye ọ bụla ga-aga “n’obodo nke ya” deba aha ya. Ihe a nwere ike ime ka ụfọdụ ndị gaa ije otu izu ma ọ bụ karịa iji gaa deba aha n’obodo ha. (Luk 2:1-3) Ọ ga-abụ na ihe Ọgọstọs bụ n’obi tie iwu a bụ ka e si na ya na-anata ndị mmadụ ụtụ isi nakwa ka esi na ya nweta ndị ga-abụ ndị agha. Ma, o nweghị onye obi ga-adị ụtọ ime ogologo njem a. N’ihi ya, o yighị ka Ọgọstọs ọ̀ ga-asị ka ndị mmadụ mee ụdị njem a n’oge oyi, n’ihi na ọ ma na ọ ga-emekwu ka iwe wee ha.

  2. Ndị ọzụzụ atụrụ. N’oge a mụrụ Jizọs, ndị ọzụzụ atụrụ “bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.” (Luk 2:8) Otu akwụkwọ a na-akpọ Daily Life in the Time of Jesus kwuru na ndị ọzụzụ atụrụ na atụrụ ha na-anọ n’èzí “n’izu bu ụzọ tupu izu Ememme Ngabiga [ya bụ, ná ngwụcha ọnwa Mach]” ruo n’etiti ọnwa Nọvemba. O kwukwara na “ha na-anọ n’ụlọ n’oge oyi; n’ihi ya, oge e ji agba Krismas, ya bụ n’oge oyi, agaghị abụ oge a mụrụ Jizọs, n’ihi na Akwụkwọ Nsọ sị na ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’ọhịa n’oge ahụ.

N’ihe dị ka n’ọnwa Ọktoba

Ọ bụrụ na anyị ebido n’oge Jizọs nwụrụ, ya bụ, n’Ụbọchị Ememme Ngabiga na Naịsan 14, n’oge opupu ihe ubi afọ 33, gụrụ laa azụ, o nwere ike inyere anyị aka ịmata ọnwa ọ ga-abụ ya ka a mụrụ Jizọs. (Jọn 19:14-16) Jizọs dị afọ iri atọ mgbe o bidoro ikwusa ozi ọma. O zikwara ozi ọma afọ atọ na ọkara. N’ihi ya, ọ ga-abụ n’ihe dị ka n’ọnwa Ọktoba n’afọ 2 (Tupu Oge Ndị Kraịst) ka a mụrụ Jizọs.—Luk 3:23.

Gịnị mere e ji agba Krismas n’abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba?

Ebe ọ bụ na anyị ahụla na ọ bụghị n’abalị iri abụọ na ise nke ọnwa Disemba ka a mụrụ Jizọs Kraịst, gịnịzi mere ndị mmadụ ji agba Krismas n’oge ahụ? Otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica sịrị na ọ ga-abụ na ndị isi chọọchị họọrọ abalị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba “ka o nwee ike ịdaba n’oge ndị Rom na-ekpere arụsị ji eme ememme ‘ụbọchị ọmụmụ anyanwụ’” n’oge oyi. Akwụkwọ ọzọ a na-akpọ Encyclopedia Americana kwuru na ọtụtụ ndị gụrụ akwụkwọ sịrị na ihe mere ndị isi chọọchị ji họrọ ụbọchị ahụ bụ “iji mee ka ndị ọgọ mmụọ a tọghatara ọhụrụ nwekwuo mmasị n’okpukperechi Ndị Kraịst.

 

 

GỤKWUO GBASARA YA

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ndị Kraịst?

Biko, legodị ihe ụfọdụ mere anyị ji dị iche na chọọchị ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst.