Ihe Baịbụl kwuru

Okwu ahụ bụ́ “Okwu Chineke” na-apụtakarị ozi ma ọ bụ ebe e dekọrọ ihe ndị si n’aka Chineke. (Luk 11:28) N’ebe ụfọdụ, “Okwu Chineke” ma ọ bụ “Okwu ahụ” bụ utu aha.​—⁠Mkpughe 19:13; Jọn 1:⁠14.

Ozi si n’aka Chineke. Ndị amụma na-ekwukarị na ihe ha gwara ndị mmadụ bụ okwu Chineke. Di ka ihe atụ, mgbe Jeremaya malitere ibu amụma ya, okwu o ji malite bụ́, “okwu Jehova wee malite iru m ntị.” (Jeremaya 1:​4, 11, 13; 2:⁠1) Tupu Samuel onye amụma agwa Sọl na Chineke ahọrọla ya ịbụ Eze, ọ sịrị ya, “Guzo n’ebe a ka m mee ka ị nụrụ okwu Chineke.”​—⁠1 Samuel 9:⁠27.

Utu aha. Na Baịbụl, a kpọrọ Jizọs Kraịst “Okwu ahụ” ma mgbe ọ bụ mmụọ n’eluigwe ma mgbe ahụ ọ bịara n’ụwa. Lee ihe ụfọdụ mere anyị ji kwuo otú ahụ:

  • Okwu ahụ adịwala ndụ tupu Chineke eke ihe ndị ọzọ. “Okwu ahụ nọ ná mmalite . . . Onye a na Chineke nọ ná mmalite.” (Jọn 1:​1, 2) Jizọs bụ “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke . . . Ọ dịkwa tupu ihe ndị ọzọ niile.”​—⁠Ndị Kọlọsi 1:​13-15, 17.

  • Okwu ahụ bịara n’ụwa dị ka mmadụ. “Okwu ahụ ghọrọ anụ ahụ́ ma bie n’etiti anyị.” (Jọn 1:14) Jizọs Kraịst “mere onwe ya ihe efu ma were ọdịdị onye ohu, wee dịrị n’oyiyi mmadụ.”​—⁠Ndị Filipaị 2:​5-7.

  • Okwu ahụ bụ Ọkpara Chineke. Mgbe Jọn onyeozi kwuchara na “Okwu ahụ” ghọrọ anụ ahụ́, o kwukwara sị: “Anyị hụkwara ebube ya, bụ́ ụdị ebube nke ọkpara a mụrụ naanị ya na-enweta n’aka nna ya.” (Jọn 1:14) Jọn dekwara sị: “Jizọs bụ Ọkpara Chineke.”​—⁠1 Jọn 4:⁠15.

  • Okwu ahụ nwere ọdịdị nke chi. “Okwu ahụ bụkwa chi” (Jọn 1:⁠1) Jizọs bụ “onyinyo nke ebube ya [Chineke] o yikwara nnọọ Chineke nke ọma.”​—⁠Ndị Hibru 1:​2, 3.

  • Okwu ahụ bụ eze na-achị achị. Baịbụl kwuru na Okwu ahụ kpu “ọtụtụ okpueze n’isi ya.” (Mkpughe 19:​12, 13) A kpọkwara Okwu ahụ “Eze nke ndị eze na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ niile.” (Mkpughe 19:16) A na-akpọ Jizọs “Eze nke ndị na-achị achị dị ka ndị eze, na Onyenwenụ nke ndị na-achị achị dị ka ndị nwenụ.”​—⁠1 Timoti 6:​14, 15.

  • Okwu ahụ bụ ọnụ na-ekwuchitere Chineke. Utu aha ahụ bụ́ “Okwu ahụ” mere ka o doo anya na onye nwe utu aha a ka Chineke si n’aka ya na-agwa ndị mmadụ ihe ọ chọrọ ka ha mee. Jizọs kwuru banyere ọrụ Chineke nyere ya, sị: “Nna m bụ onye zitere m nyere m iwu ihe m ga-akọ na ihe m ga-ekwu. . . . Ya mere ihe niile m na-ekwu, dị nnọọ ka Nna m si kọọrọ m ha, otú ahụ ka m si na-ekwu ha.” ​—⁠Jọn 12:​49, 50.