Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Ọbịbịa Kraịst?

Gịnị Bụ Ọbịbịa Kraịst?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru ọtụtụ ugboro gbasara mgbe Kraịst ga-abịa n’ọdịnihu ikpe ndị mmadụ ikpe n’ụwa. * Dị ka ihe atụ, Matiu 25:31-33 kwuru, sị:

“Mgbe Nwa nke mmadụ [bụ́ Jizọs Kraịst] ga-abịa n’ebube ya, ya na ndị mmụọ ozi ya niile, mgbe ahụ ka ọ ga-anọkwasị n’ocheeze ya dị ebube. A ga-emekwa ka mba niile zukọta n’ihu ya, ọ ga-ekewapụkwa ndị mmadụ n’ebe ibe ha nọ, dị nnọọ ka onye ọzụzụ atụrụ si ekewapụ atụrụ n’ebe ewu nọ. Ọ ga-edebe atụrụ n’aka nri ya, ma debe ewu n’aka ekpe ya.”

Oge ikpe a ga-eso ‘n’oké mkpagbu’ nke a na-enwetụbeghị ụdị ya kemgbe ụwa. Oké mkpagbu ahụ ga-ebi mgbe a ga-alụ agha Amagedọn. (Matiu 24:21; Mkpughe 16:16) Ndị iro Kraịst a kpọrọ ewu n’ihe atụ a, “ga-anata ntaramahụhụ ikpe ọmụma nke bụ́ mbibi ebighị ebi.” (2 Ndị Tesalonaịka 1:9; Mkpughe 19:11, 15) Ma, ndị niile ji obi ha niile jeere ya ozi, ya bụ, ndị ahụ bụ́ atụrụ, ga-enwe olileanya inweta “ndụ ebighị ebi.”Matiu 25:46.

Olee mgbe Kraịst ga-abịa?

Jizọs sịrị: “Ọ dịghị onye maara ụbọchị ahụ na oge awa ahụ.” (Matiu 24:36, 42; 25:13) Ma, o nyere “ihe ịrịba àmà” nke ga-eme ka a mata na oge ọ ga-abịa eruola.Matiu 24:3, 7-14; Luk 21:10, 11.

Kraịst ọ̀ ga-abịa n’ahụ́ mmụọ ka ọ̀ bụ n’anụ ahụ́ nkịtị?

Ọ bụ ahụ́ mmụọ ka Jizọs nwere mgbe a kpọlitere ya n’ọnwụ. N’ihi ya, ọ ga-abụ mmụọ mgbe ọ ga-abịa, ọ gaghị ebu anụ ahụ́. (1 Ndị Kọrịnt 15:45; 1 Pita 3:18) Ọ bụ ya mere Jizọs ji gwa ndịozi ya nụbọchị bọtara ụbọchị ahụ ọ nwụrụ, sị: “N’oge na-adịghị anya, ụwa agaghịkwa ahụ m ọzọ.”Jọn 14:19.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara ọbịbịa Kraịst

Ụgha: Mgbe Baịbụl kwuru na ndị mmadụ ga-ahụ Jizọs “ka ọ na-abịa n’ígwé ojii,” ọ pụtara na Jizọs ga-abịa otú ndị mmadụ ga-ahụ ya.Matiu 24:30.

Eziokwu: Ọtụtụ mgbe, Baịbụl kwuo banyere ígwé ojii, ihe ọ na-ekwu bụ ihe a na-anaghị ahụ anya. (Levitikọs 16:2; Ọnụ Ọgụgụ 11:25; Diuterọnọmi 33:26) Dị ka ihe atụ, Chineke gwara Mozis, sị: “M ga-abịakwute gị n’oké ígwé ojii.” (Ọpụpụ 19:9) Ma, Mozis ahụghị Chineke anya. N’ihi ya, Kraịst ‘ịbịa n’ígwé ojii’ pụtara na ndị mmadụ ga-ahụ ihe ndị ga-egosi na Jizọs abịala, ma ha agaghị eji anya nkịtị ahụ ya.

Ụgha: Mkpughe 1:7 kwuru na mgbe Jizọs ga-abịa, “anya niile ga-ahụ ya.” Ihe a gosiri na ndị mmadụ ga-eji anya ha ahụ ya.

Eziokwu: Mgbe ụfọdụ, okwu Grik e si sụgharịta “anya” na “ịhụ ụzọ” na Baịbụl nwere ike ịpụta ịghọta ihe ma ọ bụ ịmata ihe, ọ bụghị iji anya nkịtị ahụ ihe. * (Matiu 13:15; Luk 19:42; Ndị Rom 15:21; Ndị Efesọs 1:18) Baịbụl kwuru na kemgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, o bi “n’ìhè a na-apụghị iru nso, . . . ọ dịghịkwa mmadụ ọ bụla pụrụ ịhụ ya.” (1 Timoti 6:16) N’ihi ya, na Baịbụl sịrị na “anya niile ga-ahụ ya” pụtara na ndị mmadụ ga-amata na ọ bụ Jizọs ka Chineke ga-eji kpee ikpe.Matiu 24:30.

^ para. 3 Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ na-akpọ ọbịbịa Kraịst “ọbịbịa nke abụọ nke Kraịst,” okwu ahụ e nweghị ebe ọ dị na Baịbụl.

^ para. 14 Gụọ peeji nke 451 na nke 470 n’akwụkwọ bụ The New Thayer’s Greek-English Lexicon of the New Testament (1981).