Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ọ̀ Dị Mma Ka Nwoke na Nwaanyị Buru Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?

Ọ̀ Dị Mma Ka Nwoke na Nwaanyị Buru Ụzọ Biri Tupu Ha Alụọ?

Ihe Baịbụl Kwuru

Baịbụl kwuru hoo haa na ‘Chineke ga-ekpe ndị na-akwa iko ikpe.’ (Ndị Hibru 13:4) Ihe a na-akpọ ‘ịkwa iko’ n’asụsụ Grik e ji dee Baịbụl bụ Por·nei′a. Ọ bụrụ na nwoke na nwaanyị chọrọ ịlụ enwee mmekọahụ, ha akwaala iko. Ọ bụ ya mere Chineke akwadoghị ka ha biri, ọ sọkwa ya ya bụrụ na ha ga-emecha lụọ.

Ọ bụrụkwanụ na ha abụọ hụrụ ibe ha n’anya? Chineke ka chọkwara ka ha abụọ lụọ tupu ha enwewe mmekọahụ. Ọ bụ Chineke kere anyị ka nwee ike ịna-ahụ ndị ọzọ n’anya. Baịbụl kwudịrị na Chineke bụ ịhụnanya. (1 Jọn 4:8) N’ihi ya, a ga-enwerịrị ezigbo ihe mere Chineke ji sị na ọ bụ naanị ndị lụrụ dị na nwunye kwesịrị ịna-enwe mmekọahụ.