Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Ụwa?

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru

Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụghị Chineke. O nweghị mgbe Jehova Chineke chọrọ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ma, mmadụ abụọ mbụ Chineke kere nupụụrụ Chineke isi, nke gosiri na ha achọghị ka Chineke na-achị ha. Ha kpebiri iji aka ha na-agwa onwe ha ihe dị mma na ihe dị njọ. Ebe ha jụrụ Chineke, nsogbu bịara zuo ha ahụ́. Ọ bụ ihe ahụ ha mere na-akpatakwara anyịnwa nsogbu taa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịsị na ọ bụ Chineke mere anyị ji na-ata ahụhụ. Baịbụl kwuru, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Nsogbu nwere ike ịbịara onye ọ bụla, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Olee otú ihe ọjọọ si malite, gịnị mere Chineke ji gbachi nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo ugbu a? È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?

Ihe Chineke Meere Gị

Iwu Chineke nke bụ́ “mkpụrụ obi laara mkpụrụ obi” na-enyere anyị aka ịghọta ihe mere Chineke ji ‘nye naanị otu Ọkpara ya’ n’ihi anyị.