Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị n’Eziokwu?

Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị n’Eziokwu?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee. Ndị mmụọ ọjọọ dị adị. Ha bụ ‘ndị mmụọ ozi mehiere emehie.’ Ha nupụụrụ Chineke isi. (2 Pita 2:4) Mmụọ ozi mbụ mere onwe ya mmụọ ọjọọ bụ Setan bụ́ Ekwensu. Baịbụl kpọrọ ya “onye na-achị ndị mmụọ ọjọọ.”—Matiu 12:24, 26.

Otú ndị mmụọ ozi si nupụrụ Chineke isi n’oge Noa

Baịbụl kwuru na e nwere ndị mmụọ ozi nupụụrụ Chineke isi tupu Iju Mmiri oge Noa. Ọ sịrị: “Ụmụ ndị ikom nke ezi Chineke malitere ịhụ ụmụ ndị inyom nke mmadụ, na ha mara mma; ha wee na-alụrụ ndị inyom, bụ́ ndị niile ha họọrọ.” (Jenesis 6:2) Ndị mmụọ ọjọọ ahụ “hapụrụ ebe obibi ha kwesịrị ekwesị” n’eluigwe ma ghọọ mmadụ ka ha nwee ike isoro ụmụ nwaanyị nwee mmekọahụ.—Jud 6.

Mgbe Iju Mmiri ahụ malitere, ndị mmụọ ọjọọ ahụ mere onwe ha ka ha ghọghachi mmụọ ma laghachi eluigwe. Ma, Chineke chụpụrụ ha n’eluigwe. Ihe so na ntaramahụhụ Chineke nyere ha bụ na ha enweghịzi ike ịghọkwa mmadụ ọzọ.—Efesọs 6:11, 12.