Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Iwu Ò Ji Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike?

Iwu Ò Ji Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike?

Ihe Baịbụl kwuru

A gwaghị Ndị Kraịst ka ha na-edebe ubọchị izu ike. Ndị Kraịst nọ n’okpuru “iwu nke Kraịst.” Idebe Ụbọchị Izu Ike esoghịkwa n’iwu ahụ. (Ndị Galeshia 6:2; Ndị Kọlọsi 2:16, 17) Gịnị mere anyị ji kwuo otú a? Ka anyị burugodị ụzọ hụ otú Ụbọchị Izu Ike si malite.

Gịnị bụ Ụbọchị Izu Ike?

Ebe mbụ okwu a pụtara na Baịbụl bụ n’iwu Chineke nyere ụmụ Izrel. (Ọpụpụ 16:23) Dị ka ihe atụ, iwu nke anọ n’ime Iwu Iri kwuru, sị: “Cheta ụbọchị izu ike ka i doo ya nsọ, ị ga-eji ụbọchị isii jee ozi ma rụọ ọrụ gị niile. Ma ụbọchị nke asaa bụ ụbọchị izu ike nye Jehova bụ́ Chineke gị. Arụla ọrụ ọ bụla.” (Ọpụpụ 20:8-10) Ụbọchị Izu Ike na-amalite mgbe anyanwụ dara na Fraịdee ruo mgbe anyanwụ dara na Satọdee. N’oge ahụ, ndị Izrel anaghị esi n’ụlọ ha pụọ, ha anaghị amụnye ọkụ, kpaa nkụ ma ọ bụ buo ibu. (Ọpụpụ 16:29; 35:3; Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36; Jeremaya 17:21) A na-egbukwa onye ọ bụla na-edebeghị Ụbọchị Izu Ike.—Ọpụpụ 31:15.

E nwekwara ụbọchị ndị ọzọ bụ ụbọchị izu ike na Kalenda ndị Juu. A na-ewerekwa afọ nke asaa na afọ nke iri ise ka afọ izu ike. N’afọ izu ike, ndị Izrel anaghị akọ ihe, ha anaghịkwa amanye onye ọ bụla ji ụgwọ ka ọ kwụọ ụgwọ o ji.—Levitikọs 16:29-31; 23:6, 7, 32; 25:4, 11-14; Diuterọnọmi 15:1-3.

Àjà Jizọs chụrụ kagburu iwu Ụbọchị Izu Ike

Gịnị mere na iwu Ụbọchị Izu Ike ejighị Ndị Kraịst?

Ọ bụ naanị ndị e nyere Iwu Mozis ka iwu ji idebe Ụbọchị Izu Ike. (Diuterọnọmi 5:2, 3; Ezikiel 20:10-12) Chineke agwaghị ndị ọzọ ka ha na-edebe ụbọchị izu ike. Ihe ọzọ bụ na mgbe Jizọs Kraịst ji ndụ ya chụọ àjà, ọ tọpụrụ ndị Juu “n’Iwu ahụ,” ma n’Iwu Iri ahụ. (Ndị Rom 7:6, 7; 10:4; Ndị Galeshia 3:24, 25; Ndị Efesọs 2:15) Kama ịna-edebe Iwu Mozis, Ndị Kraịst na-edebe iwu kachanụ, ya bụ, iwu ịhụnanya.—Ndị Rom 13:9, 10; Ndị Hibru 8:13.

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere Ụbọchị Izu Ike

Ụgha: Ọ bụ Chineke malitere Ụbọchị Izu Ike mgbe o zuru ike n’ụbọchị nke asaa.

Eziokwu: Baịbụl sịrị: “Chineke gọziri ụbọchị nke asaa ahụ bịakwa doo ya nsọ, n’ihina ụbọchị ahụ, Chineke zuru ike mgbe ọ rụchara ọrụ okike ya.” (Jenesis 2:3, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ihe e kwuru n’amaokwu a bụ ihe Chineke mere n’ụbọchị nke asaa mgbe ọ na-eke ihe, ọ bụghị iwu o nyere ụmụ mmadụ. E nweghị onye Baịbụl kwuru na-edebe ụbọchị izu ike tupu oge Mozis.

Ụgha: Ndị Izrel na-edebebu Ụbọchị Izu Ike tupu e nye ha Iwu Mozis.

Eziokwu: Mozis gwara ndị Izrel, sị: “Anyị na Jehova bụ́ Chineke anyị gbara ndụ na Horeb,” bụ́ nke dị́ n’akụkụ Ugwu Saịnaị. Iwu Ụbọchị Izu Ike so n’ọgbụgba ndụ a. (Diuterọnọmi 5:2, 12) Ihe ndị Izrel mere gosikwara na iwu Ụbọchị Izu Ike bụ iwu ọhụrụ. Chineke gwara ha ka ha na-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ọ ga na-echetara ha otú o si kpọpụta ha n’Ijipt. Ọ bụrụ na ha na-edebebu ya mgbe ha nọ n’Ijipt, olee otú ọ gaara esi na-echetara ha ihe a? (Diuterọnọmi 5:15) Gịnị mere e ji gwawa ha ka ha ghara ịtụtụ mana n’ụbọchị nke asaa? (Ọpụpụ 16:25-30) Gịnịkwa mere na ha amaghị ihe ha ga-eme mgbe mbụ mmadụ dara iwu Ụbọchị Izu Ike?—Ọnụ Ọgụgụ 15:32-36.

Ụgha: Ụbọchị Izu Ike bụ ọgbụgba ndụ ebighị ebi. N’ihi ya, a ka kwesịrị ịna-edebe ya.

Eziokwu: Ụfọdụ nsụgharị Baịbụl kpọrọ Ụbọchị Izu Ike “ọgbụgba ndụ ebighị ebi.” (Ọpụpụ 31:16, Bible Nsọ nke Union Version) Ma, okwu Hibru a sụgharịrị “ebighị ebi” nwekwara ike ịpụta “na-adịru mgbe a na-akaghị aka.” Dị ka ihe atụ, ọ bụ otu okwu ahụ ka Baịbụl ji gosi mgbe ndị nchụàjà Izrel ga-arụru ọrụ ha. Ma, Chineke kwụsịrị ọrụ ahụ kemgbe ihe dị ka puku afọ abụọ gara aga.—Ọpụpụ 40:15; Ndị Hibru 7:11, 12.

Ụgha: Ndị Kraịst kwesịrị ịna-edebe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na Jizọs debere ya.

Eziokwu: Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, onye ọ bụla bụ́ onye Juu na-edebe iwu Mozis. Ọ bụ ya mere Jizọs ji debe Ụbọchị Izu Ike n’ihi na ọ bụ onye Juu. (Ndị Galeshia 4:4) Mgbe Jizọs nwụrụ, e wepụrụ Iwu Mozis, ma iwu Ụbọchị Izu Ike.—Ndị Kọlọsi 2:13, 14.

Ụgha: Pọl onyeozi debere Ụbọchị Izu Ike mgbe ọ bụ Onye Kraịst.

Eziokwu: Pọl gara n’ụlọ nzukọ n’Ụbọchị Izu Ike, ma ọ bụghị ka o soro ndị Juu mee ihe ha na-eme. (Ọrụ Ndịozi 13:14; 17:1-3; 18:4) Kama, ọ na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ nzukọ n’ihi na n’oge ahụ, e nwere ike ịgwa ndị si esi bịa ka ha gwa ndị zukọtaranụ okwu Chineke. (Ọrụ Ndịozi 13:15, 32) Pọl kwusara ozi ọma “kwa ụbọchị,” ọ bụghị naanị n’Ụbọchị Izu Ike.—Ọrụ Ndịozi 17:17.

Ụgha: Ụbọchị Izu Ike Ndị Kraịst bụ ụbọchị Sọnde.

Eziokwu: E nweghị ebe Baịbụl nyere Ndị Kraịst iwu ka ha jiri ụbọchị Sọnde, bụ́ ụbọchị mbụ n’izu, na-ezu ike ma na-efe ofufe. Ndị Kraịst n’oge ochie na-arụ ọrụ n’ụbọchị Sọnde otú ha si arụkwa n’ụbọchị ndị ọzọ. Akwụkwọ bụ́ The International Standard Bible Encyclopedia kwuru, sị: “Ọ bụ n’ihe dị ka otu puku afọ na narị asaa gara aga, mgbe eze ukwu Rom a na-akpọ Constantine, bụ́ onye na-ekpere arụsị, nyere iwu ka a kwụsị ịna-arụ ọrụ ụfọdụ n’ụbọchị Sọnde, ka a malitere ime ụbọchị Sọnde ka ọ̀ bụ ụbọchị izu ike.” *

Oleekwanụ otú anyị kwesịrị isi ghọta amaokwu Baịbụl ndị yiri ka hà na-egosi na ụbọchị Sọnde pụrụ iche? Baịbụl kwuru na Pọl onyeozi na Ndị Kraịst ibe ya rikọrọ nri “n’ụbọchị mbụ n’izu,” ya bụ, n’ụbọchị Sọnde. Ma, o doro anya na ihe mere ha ji zukọta rie nri ahụ bụ na Pọl na-ala n’echi ya. (Ọrụ Ndịozi 20:7) A gwakwara ụfọdụ ọgbakọ ka ha na-ewepụta ego ha ga-enye n’onyinye “kwa ụbọchị mbụ n’izu,” ya bụ, n’ụbọchị Sọnde. Ma, ihe a bụ naanị aro ka a tụụrụ ha. Ọ bụkwa n’ụlọ ha ka ha na-edebe ego ahụ, ha anaghị ewega ya n’ebe ha na-ezukọ.—1 Ndị Kọrịnt 16:1, 2.

Ụgha: Ọ dịghị mma iwepụta otu ụbọchị n’izu iji zuo ike ma fee Chineke.

Eziokwu: Ọ bụ Onye Kraịst ọ bụla ka ọ dị n’aka ikpebi ụbọchị ọ ga-eji mee ihe ọ bụla ọ chọrọ ime.—Ndị Rom 14:5.

^ para. 21 Gụọ akwụkwọ bụ́ New Catholic Encyclopedia, Mbipụta nke Abụọ, Mpịakọta nke 13, peeji nke 608.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.

Iwu Chineke Nyere Ụmụ Izrel Ọ̀ Dị Mma?

Ihe anọ ndị ikpe Izrel na-eme ma ha kpewe ikpe.

Ndịàmà Jehova Hà Bụ Ndị Kraịst?

Biko, legodị ihe ụfọdụ mere anyị ji dị iche na chọọchị ndị na-ekwu na ha bụ Ndị Kraịst.