Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?

Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke na-ahọrọ mmadụ ole na ole ji obi ha niile na-efe ya bụ́ ndị ọ ga-abụ ha nwụọ, ya akpọlite ha n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. (1 Pita 1:3, 4) A họrọhaala ha, ha ga-anọgide na-eme ka okwukwe ha na-esikwu ike, na-ebikwa ndụ otú Chineke si chọọ. Ọ bụrụ na ha emeghị otú ahụ, a ga-ewere ha ka ndị na-erughị eru inweta oké ha n’eluigwe.Ndị Efesọs 5:5; Ndị Filipaị 3:12-14.

Olee ihe ndị na-aga eluigwe na-aga ime n’ebe ahụ?

Ha ga-eso Jizọs chịa dị ka ndị eze na ndị nchụàjà ruo otu puku afọ. (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Ọ bụ hanwa ga-aghọ “eluigwe ọhụrụ,” ya bụ, ọchịchị ga-esi n’eluigwe na-achị “ụwa ọhụrụ,” nke bụ́, ndị ezi omume ga-ebi n’ụwa. Ndị ahụ ga-eso Jizọs chịa ga-enye aka mee ka ụmụ mmadụ dịrị otú ahụ Chineke chọburu ka ha dịrị.Aịzaya 65:17; 2 Pita 3:13.

Mmadụ ole ka a ga-akpọlite n’ọnwụ, ha agaa eluigwe?

Baịbụl kwuru na a ga-akpọlite otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ n’ọnwụ, ha agaa eluigwe. (Mkpughe 7:4) N’ọhụụ dị n’akwụkwọ Mkpughe 14:1-3, Jọn onyeozi hụrụ “Nwa Atụrụ ahụ ka o guzo n’Ugwu Zayọn, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.” N’ọhụụ a, “Nwa Atụrụ ahụ” nọchịrị anya Jizọs e si n’ọnwụ kpọlite. (Jọn 1:29; 1 Pita 1:19) “Ugwu Zayọn” nọchiri anya otú e si bulie Jizọs elu, ya na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-eso ya chịa n’eluigwe.Abụ Ọma 2:6; Ndị Hibru 12:22.

Na Baịbụl, e nwere aha a kpọrọ ndị a ‘a kpọrọ, na ndị a họọrọ’ ka ha soro Jizọs chịa. A kpọrọ ha “ìgwè atụrụ nta.” (Mkpughe 17:14; Luk 12:32) Ihe a Baịbụl kpọrọ ha gosiri na ha ga-adị obere n’ọnụ ọgụgụ ma e jiri ha tụnyere ọnụ ọgụgụ ndị niile bụ́ atụrụ Jizọs.Jọn 10:16.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere ndị ga-aga eluigwe

Ụgha: Ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe.

Eziokwu: Chineke kwere nkwa na ihe ka ọtụtụ ná ndị ezi omume ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa.Abụ Ọma 37:11, 29, 34.

  • Jizọs sịrị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgowooro n’eluigwe.” (Jọn 3:13) Ihe a o kwuru gosiri na mmadụ ndị dị ka Ebreham, Mozis, Job, na Devid bụ́ ndị ezi omume nwụrụ tupu ya abịa, agaghị eluigwe. (Ọrụ Ndịozi 2:29, 34) Kama, ha nwere olileanya na a ga-akpọlite ha n’ọnwụ, ha adịrị ndụ n’ụwa.Job 14:13-15.

  • Ihe a na-akpọ ụdị mbilite n’ọnwụ a, ya bụ, ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ha agaa eluigwe, bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ.” (Mkpughe 20:6) Ihe ọ pụtara bụ na a ga-enwekwa ụdị mbilite n’ọnwụ ọzọ. Ọ ga-abụ nke ndị a ga-akpọlite, ha ebiri n’ụwa.

  • Baịbụl na-akụzi na mgbe Alaeze Chineke ga-achịwa ụwa, “ọnwụ agaghị adị ọzọ.” (Mkpughe 21:3, 4) Ebe ọ bụ na e nwetụbeghị mgbe ọnwụ dị n’eluigwe, ọ pụtara na ọ bụ n’ụwa ka nkwa ahụ ga-emezurịrị.

Ụgha: Ọ bụ onye ọ bụla ga-eji aka ya ekpebi ma ọ̀ ga-aga eluigwe ka ọ̀ ga-ebi n’ụwa.

Eziokwu: Ọ bụ Chineke na-ekpebi onye ga-enweta “òkù a kpọrọ ịga eluigwe,” n’ime ndị niile ji obi ha niile na-efe Chineke. (Ndị Filipaị 3:14) Chineke anaghị ahọrọ onye ọ bụla maka na ọ na-agụ onye ahụ agụụ ịga eluigwe.Matiu 20:20-23.

Ụgha: Olileanya ibi ndụ ebighị ebi n’ụwa enweghị oké ihe ọ bụ, ọ bụkwa ndị na-erughị eru ịga eluigwe nwere ụdị olileanya ahụ.

Eziokwu: Chineke kpọrọ ndị ga-adị ndụ ebighị ebi n’ụwa “ndị m,” “ndị m họọrọ,” na ndị “Jehova gọziri agọzi.” (Aịzaya 65:21-23) Ọ bụ ha ga-emezu ihe Chineke bu n’obi mgbe o kere ụmụ mmadụ, ya bụ, ka ha zuo okè ma dịrị ndụ ebighị ebi n’ụwa bụ́ paradaịs.Jenesis 1:28; Abụ Ọma 115:16; Aịzaya 45:18.

Ụgha: Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ e kwuru okwu ya n’akwụkwọ Mkpughe abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, o nwere ihe ọ nọchịrị anya ya.

Eziokwu: Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ Mkpughe nwere ihe ha nọchịrị anya ya, ma ụfọdụ ọnụ ọgụgụ e dere na ya bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị. Dị ka ihe atụ, o kwuru banyere “aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ nke Nwa Atụrụ ahụ.” (Mkpughe 21:14) Lee ihe doro anya mere a ga-eji kwuo na e kwesịrị iwere otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.

Mkpughe 7:4 kwuru banyere “ọnụ ọgụgụ nke ndị ahụ a kara akara [ma ọ bụ ndị ahụ a họọrọ ịga eluigwe], ya bụ, otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ.” N’amaokwu ndị na-esonu, e kwuru okwu òtù ọzọ dị iche bụ́ “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ.” Ndị so ‘n’oké ìgwè mmadụ’ ahụ ga-enwetakwa nzọpụta si n’aka Chineke. (Mkpughe 7:9, 10) Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, kama e ji ya akọwa otu òtù a na-amaghị ọnụ ọgụgụ ya, ọ pụtaranụ na o nweghizi ihe dị iche ya na “oké ìgwè mmadụ” ahụ. *

Ihe ọzọ bụ na mmadụ otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ bụ ndị ‘e si n’etiti ụmụ mmadụ zụta dị ka mkpụrụ mbụ.’ (Mkpughe 14:4) “Mkpụrụ mbụ” ahụ a kpọrọ ha gosiri na ha bụ mmadụ ole na ole a họọrọ. Nke a gosiri na ndị ga-eso Jizọs chịa dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere imirikitimi ndị ha ga-achị n’ụwa.Mkpughe 5:10.

^ para. 21 N’otu akwụkwọ kwuru gbasara Mkpughe isi 1 ruo 7 a na-akpọ An Exegetical Commentary, na peeji ya nke 474, otu ọkachamara aha ya bụ Robert L. Thomas, kwuru gbasara otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ahụ e kwuru okwu ya ná Mkpughe 7:4. Ọ sịrị: “Ọnụ ọgụgụ a bụ ọnụ ọgụgụ nkịtị e ji gosi ọdịiche dị n’etiti ya na ọnụ ọgụgụ ahụ onye ọ bụla na-enweghị ike ịgụta ọnụ e kwuru okwu ya na Mkpughe 7:9. Ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ a abụghị ọnụ ọgụgụ nkịtị, ọ pụtara na e nweghịzi ọnụ ọgụgụ dị n’akwụkwọ Mkpughe a ga-ewere ka ọnụ ọgụgụ nkịtị.”

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmadụ Ka Jizọs Nwere Mgbe O Si n’Ọnwụ Bilie Ka Ọ̀ Bụ Ahụ́ Mmụọ?

Baịbụl kwuru na e mere ka Jizọs “dị ndụ na mmụọ,” oleezi otú ndị na-eso ụzọ ya si hụ ya, metụkwa ya aka mgbe a kpọlitechara ya n’ọnwụ?

OZI ỌMA SI N’AKA CHINEKE!

Gịnị Ka Chineke Bu n’Obi Kee Ụwa Anyị A?

Baịbụl kwuru ihe mere Chineke ji kee ụwa, mgbe nsogbu ga-akwụsị, otú ụwa ga-esi ghọọ paradaịs na ndị ga-ebi na ya.

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ka Akwụkwọ Mkpughe Na-ekwu?

Akwụkwọ Mkpughe kwuru na obi ụtọ ga-adịrị onye ọ bụla na-agụ ihe ndị e dere na ya, na-aghọta ha ma na-eme ha eme.

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Ka Nọmba Dị Iche Iche Pụtara na Baịbụl? Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Iji Anwansi Akọwa Nọmba?

Tụlee ihe ụfọdụ nọmba pụtara na Baịbụl chọpụtakwa otú o si dị iche n’iji anwansi akọwa nọmba.