Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ “Mkpịsị Ugodi nke Alaeze”?

Gịnị Bụ “Mkpịsị Ugodi nke Alaeze”?

Ihe Baịbụl kwuru

“Mkpịsị ugodi nke alaeze” nọchiri anya ikike e ji emepere ndị mmadụ ụzọ ka ha nwee ike “ịbanye n’alaeze Chineke.” (Matiu 16:19; Ọrụ Ndịozi 14:22) * Jizọs nyere Pita “mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe.” Ihe ọ pụtara bụ na e nyere Pita ikike ịgwa ndị mmadụ otú ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ga-esi enweta mmụọ nsọ Chineke, ketakwa Alaeze eluigwe.

Ole ndị ka e ji mkpịsị ugodi ndị ahụ mepeere ụzọ?

Pita ji ikike a Chineke nyere ya mepeere ụdị ndị atọ ụzọ ka ha nwee ike ịba n’Alaeze ahụ. Ha bụ:

  1. Ndị Juu na ndị a tọghatara ha ekpewe okpukpe ndị Juu. Obere oge Jizọs nwụchara, Pita gbara ìgwè ndị Juu gbakọrọ ọnụ ume ka ha nabata Jizọs ka onye Chineke họpụtara ka ọ bụrụ eze Alaeze ya. Pita gwara ha ihe ha ga-eme ka e nwee ike ịzọpụta ha. O si otú ahụ mepeere ha ụzọ ịbanye n’Alaeze. Ọtụtụ puku ndị mmadụ “nabatara okwu ya.”​—Ọrụ Ndịozi 2:38-41.

  2. Ndị Sameria. E mechara ziga Pita ka ọ gakwuru ndị Sameria. * N’oge a kwa, o ji mkpịsị ugodi nke Alaeze megheere ndị Sameria ụzọ nke Alaeze mgbe ya na Jọn onyeozi “kpeere ha ekpere ka ha nata mmụọ nsọ.” (Ọrụ Ndịozi 8:14-17) O megheere ndị Sameria ahụ ụzọ ịbanye n’Alaeze.

  3. Ndị Jentaịl. Mgbe Jizọs nwụchara, afọ atọ na ọkara agaakwa, Chineke kpugheere Pita na ndị Jentaịl (ya bụ, ndị na-abụghị ndị Juu) ga-eso ná ndị ga-aba n’Alaeze ahụ. Pita ziziri ndị Jentaịl ozi ọma, si otú ahụ jiri otu n’ime mkpịsị ugodi ahụ mee ka ha nweta mmụọ nsọ, ghọọ Ndị Kraịst, sorokwa ná ndị ga-aba n’Alaeze ahụ.​—Ọrụ Ndịozi 10:30-35, 44, 45.

Gịnị ka “ịbanye n’alaeze Chineke” pụtara?

Ndị a na-ekwu okwu ha ebe a na ha ‘ga-abanye n’alaeze Chineke’ bụ ndị ga-eso Jizọs chịa n’eluigwe. Baịbụl buru amụma na ndị ahụ ‘ga-anọdụ ala n’ocheeze’ nakwa na ha ‘ga-achị ụwa dị ka ndị eze.’​—Luk 22:29, 30; Mkpughe 5:9, 10.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara mkpịsị ugodi nke Alaeze

Ụgha: Ọ bụ Pita na-ekpebi onye ga-aga eluigwe.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na ọ bụ Jizọs, ọ bụghị Pita bụ “onye a kara aka ikpe ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ ikpe.” (2 Timoti 4:1, 8; Jọn 5:22) Pita jidị ọnụ ya kwuo na ọ bụ Jizọs “bụ Onye ahụ Chineke kpebiri na ọ ga-abụ onyeikpe nke ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ.”​—Ọrụ Ndịozi 10:34, 42.

Ụgha: Chineke na-echere ka Pita kpebie mgbe ọ ga-eji mkpịsị ugodi nke Alaeze ahụ mee ihe.

Eziokwu: Mgbe Jizọs kwuru okwu gbasara mkpịsị ugodi nke Alaeze ahụ, ọ gwara Pita, sị: “Ihe ọ bụla ị ga-ekekwa agbụ n’elu ụwa, a ga-eke ya n’eluigwe: ihe ọ bụla ị ga-atọpụkwa agbụ n’elu ụwa, a ga-atọpụ ya n’eluigwe.” (Matiu 16:19, Bible Nsọ nke Union Version) Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị weere ya na ọ bụ Pita na-atụrụ Chineke ụka, ma okwu Grik mbụ e ji dee amaokwu a gosiri na ihe ọ bụla Pita kpebiri ga-ekwekọrịrị n’ihe ndị e burula ụzọ kpebie n’eluigwe. Ọ bụghị na ihe Pita kpebiri ga-ebu ihe e kpebiri n’eluigwe ụzọ.

E nwekwara ebe ọzọ Baịbụl gosiri na Pita ga-eme ihe dabara n’uche Chineke ma o jiwe mkpịsị ugodi nke Alaeze ahụ na-eme ihe. Dị ka ihe atụ, o mere ihe Chineke gwara ya mgbe o ji mkpịsị ugodi nke atọ mee ihe.​—Ọrụ Ndịozi 10:19, 20.

^ para. 3 Sameria na-ekpe okpukpe dị iche na nke ndị Juu. Ma, ha na-akụzi ma na-emekwa ihe ụfọdụ dị n’Iwu Mozis.

^ para. 7 Mgbe ụfọdụ, Baịbụl kwuo “mkpịsị ugodi,” ọ na-apụtakarị ikike ma ọ bụ ọrụ e nyere mmadụ.​—Aịzaya 22:20-22; Mkpughe 3:7, 8.

GỤKWUO GBASARA YA

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Chọpụta otú Alaeze Chineke si ka ọchịchị ụmụ mmadụ mma.

AJỤJỤ NDỊ BAỊBỤL ZARA

Olee Ndị Ga-aga Eluigwe?

Ndị mmadụ na-ekwukarị na ndị ezi omume niile ga-aga eluigwe. Gịnị ka Baịbụl na-akụzi?