Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Mere E Ji Akpọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Gịnị Mere E Ji Akpọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke enweghị nwunye. Ma, ọ bụ yanwa kere ihe niile. (Mkpughe 4:11) Adam bụ mmadụ mbụ Chineke kere. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kpọọ ya “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Baịbụl kwukwara na Chineke kere Jizọs. Ọ bụ ya mere e jikwa akpọ Jizọs “nwa Chineke.”—Jọn 1:49, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

Chineke bu ụzọ kee Jizọs tupu ya ekee Adam. Pọl onyeozi kwuru na Jizọs bụ “onyinyo nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya, onye e bụ ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” (Ndị Kọlọsi 1:15) Jizọs ebiela ndụ n’eluigwe ruo ọtụtụ puku afọ tupu a mụọ ya n’ụlọ anụ na Betlehem. Maịka 5:2 kwudịrị na Jizọs “malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.” Jizọs bụ mmụọ n’eluigwe mgbe Chineke kere ya. Ma, e mechaziri mụọ ya n’ụwa, ya abụrụ mmadụ. Jizọs n’onwe ya kwudịrị, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.”—Jọn 6:38; 8:23.