Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ndụ A M Dị Agwụla M Ike—Okpukpe, Chineke, Ma Ọ Bụ Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri M Aka?

Ndụ A M Dị Agwụla M Ike—Okpukpe, Chineke, Ma Ọ Bụ Baịbụl Ọ̀ Ga-enyeliri M Aka?

Ihe Baịbụl kwuru

Ee. Baịbụl nwere ike inyere gị aka n’ihi na e dere ọtụtụ okwu amamihe na ya, ọ zakwara ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ taa. Baịbụl nwekwara ike inyere gị aka ka i nwewe obi ụtọ ná ndụ gị. Lee ụfọdụ n’ime ajụjụ ndị Baịbụl zara.

  1. È nwere Onye kere ihe niile? Baịbụl sịrị na Chineke “kere ihe niile.” (Mkpughe 4:11) Ebe ọ bụ ya kere anyị, ọ maara ihe anyị ga-eme ka obi na-atọ anyị ụtọ, nakwa ka ndụ anyị dị ghara ịgwụ anyị ike.

  2. Ihe banyere m ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi? Kama ịsị na Chineke agbahapụla ụmụ mmadụ, Baịbụl sịrị na “ọ nọghị n’ebe dị anya n’ebe onye ọ bụla n’ime anyị nọ.” (Ọrụ Ndịozi 17:27) Otú ihe si dịrị gị na-emetụ ya n’obi, ọ chọkwara ka ihe gaziere gị ná ndụ.—Aịzaya 48:17, 18; 1 Pita 5:7.

  3. Olee otú ịmara Chineke ga-esi eme ka m na-enwe obi ụtọ? Chineke kere anyị ka ọ na-agụ anyị agụụ ịmata “mkpa ime mmụọ” anyị, ya bụ, ka ọ na-agụ anyị agụụ ịmata ihe mere o ji kee anyị na ihe anyị kwesịrị iji ndụ anyị mee. (Matiu 5:3) Ihe ọzọ so n’ịmara mkpa ime mmụọ anyị bụ ịmata Onye kere anyị na ime ka anyị na ya dịrị ná mma. Chineke ga-anabata anyị ma anyị gbalịa mata onye ọ bụ n’ihi na Baịbụl sịrị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso.”—Jems 4:8.

Ọtụtụ ndị achọpụtala na ha na Chineke ịdị ná mma emeela ka ndụ ha ka mma, meekwa ka ha mata ihe ha ga-eme ka ndụ ha ghara ịgwụ ha ike. Ọ bụ eziokwu na ịmara Chineke agaghị eme ka nsogbu gị niile bie, ma ihe Chineke na-agwa anyị na Baịbụl ga-enyere gị aka

  • Ka gị na ezinụlọ gị na-enwekwu obi ụtọ.

  • Ka gị na ndị ọzọ na-adị n’udo.

  • Ịma ihe ị ga-eme ma ike ụwa gwụ gị, ma ị na-enwe nsogbu ego, nakwa ma ị na-arịa ọrịa na-anaghị ala ala..

Ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị na-agụ Baịbụl anaghị eme ihe Baịbụl kwuru. Ma, ndị na-ekpe ezi okpukpe na-eme ihe Baịbụl kwuru. Ha ga-enyekwara gị aka ịmata Chineke.

 

 

GỤKWUO GBASARA YA

Oleedị Ihe Chineke Bu n’Obi Kee Anyị?

Ò nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ihe Chineke kere anyị ka anyị jiri ndụ anyị mee? Lee ihe Baịbụl zara.

Ijizi Ego Ejizi

Ọ bụ ego na-akpatakarị esemokwu n’ezinụlọ. Lee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere unu aka.