Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Nọmba Dị Iche Iche Pụtara na Baịbụl? Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Iji Anwansi Akọwa Nọmba?

Gịnị Ka Nọmba Dị Iche Iche Pụtara na Baịbụl? Baịbụl Ọ̀ Kwadoro Iji Anwansi Akọwa Nọmba?

Ihe Baịbụl kwuru

Nọmba ndị dị na Baịbụl na-abụkarị nọmba nkịtị. Ma, mgbe ụfọdụ, e nwere ihe ha na-anọchi anya ya. Ihe a na-ekwu okwu ya na-enyekarị aka eme ka a mata mgbe nọmba nwere ihe ọ na-anọchi anya ya. Leba anya n’ihe atụ ndị a banyere ebe nọmba nwere ihe ha nọchiri anya ha:

  • 1 Ịdị n’otu. Dị ka ihe atụ, Jizọs gwara Chineke n’ekpere gbasara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ka ha niile wee bụrụ otu, dị ka gị onwe gị, Nna, na mụ onwe m dị n’otu.”Jọn 17:21; Matiu 19:6.

  • 2 E kpewe ikpe, ndị akaebe abụọ ga-egosi na ihe a na-ekwu bụ eziokwu. (Diuterọnọmi 17:6) Otú ahụ ka ọ dị n’ịhụ ọhụụ. Ọ bụrụ na e mee ka mmadụ hụ otu ọhụụ ugboro abụọ ma ọ bụ gwaghachi mmadụ ihe a gwaburu ya, o gosiri na ihe ahụ bụ eziokwu bụrụkwa ihe e ji n’aka. Dị ka ihe atụ, mgbe Josef na-akọwara Fero eze Ijipt nrọ ya, ọ gwara ya, sị: “Na e mere ka Fero rọọ nrọ ahụ ugboro abụọ pụtara na ezi Chineke emewo ka ihe ahụ guzosie ike.” (Jenesis 41:32) N’amụma, “mpi abụọ” pụtara ọchịchị a gbakọrọ aka chịa. Daniel kwuru otú ahụ banyere Alaeze Ukwu Midia na Peshia.Daniel 8:20, 21; Mkpughe 13:11.

  • 3 Otú ahụ àmà mmadụ atọ gbara bụ eziokwu ka ihe e gosiri ugboro atọ ma ọ bụ kwuo ugboro atọ bụkwa eziokwu na ihe na-enweghị mgbagha.Ezikiel 21:27; Ọrụ Ndịozi 10:9-16; Mkpughe 4:8; 8:13.

  • 4 Nwere ike ịpụta ihe akụkụ ya niile zuru ezu ma ọ bụ ihe mezuru ihe niile e kwo mee ya. Dị ka ihe atụ, “ifufe anọ nke ụwa” pụtara mbibi nke ga-esi n’akụkụ niile nke ụwa bịa ma zuo ebe niile n’ụwa.Mkpughe 7:1; 21:16; Aịzaya 11:12.

  • 6 Ọ bụ otu mere ka isii ghara ịbụ asaa. Asaa kwanụ na-apụtakarị ihe zuru ezu. N’ihi ya, isii nwere ike ịpụta ihe na-ezughị ezu ma ọ bụ ihe na-ezughị okè, ma ọ bụkwanụ ihe gbasara ndị iro Chineke.1 Ihe E Mere 20:6; Daniel 3:1; Mkpughe 13:18.

  • 7 Nọmba a na-apụtakarị ihe zuru ezu. Dị ka ihe atụ, Chineke gwara ndị Izrel ka ha gaa Jeriko gburugburu ụbọchị asaa ma gaa ya gburugburu ugboro asaa n’ụbọchị nke asaa. (Jọshụa 6:15) E nwekwara ebe ndị ọzọ asaa pụtara ihe zuru ezu na Baịbụl. (Levitikọs 4:6; 25:8; 26:18; Abụ Ọma 119:164; Mkpughe 1:20; 13:1; 17:10) Mgbe Jizọs gwara Pita na ọ ga-agbaghara nwanna ya “ọ bụghị, ruo ugboro asaa, kama, ruo ugboro iri asaa na asaa,” ihe ọ pụtara bụ na e nweghị mgbe ọ ga-akwụsị ịgbaghara ndị ọzọ.Matiu 18:21, 22.

  • 10 Nọmba a nwere ike ịpụta ozuzu nke ihe ọ bụla a na-ekwu ma ọ bụ ngụkọta nke ihe niile a na-ekwu.Ọpụpụ 34:28; Luk 19:13; Mkpughe 2:10.

  • 12 Nọmba a nwere ike ịpụta ozuzu nke ihe Chineke haziri. Dị ka ihe atụ, mgbe e gosiri Jọn onyeozi otú eluigwe dị n’ọhụụ, otu n’ime ihe ndị ọ hụrụ bụ obodo ‘nwere nkume ntọala iri na abụọ, na aha iri na abụọ nke ndịozi iri na abụọ.” (Mkpughe 21:14; Jenesis 49:28) Nọmba ọ bụla e nwere ike iji iri na abụọ kee nwekwara ike ịpụta otu ihe ahụ.Mkpughe 4:4; 7:4-8.

  • 40 Ọtụtụ ikpe Chineke kpere na ntaramahụhụ o nyere were ụbọchị iri anọ ma ọ bụ afọ iri anọ.Jenesis 7:4; Ezikiel 29:11, 12.

Iji Anwansi Akọwa Nọmba

Ihe ndị a anyị kwuru na nọmba dị iche iche pụtara na Baịbụl dị iche n’iji anwansi achọ ịmata ihe ha pụtara, ma ọ bụ iji ya achọ ịma ihe nọmba ndị ya na ibe ya gakọrọ pụtara, nakwa ihe nọmba dị iche iche pụtara ma a gbakọta ha. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị Juu nyochara akwụkwọ Jenesis ruo Malakaị iji chọpụta ihe nọmba nke mkpụrụ akwụkwọ ndị dị na ha pụtara. Iji anwansi akọwa nọmba bụ otu ụzọ e si agba afa. Chineke kpọkwara ya asị.Diuterọnọmi 18:10-12.