Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl Ò Kwuru na Ite Ime Dị Njọ?

Baịbụl Ò Kwuru na Ite Ime Dị Njọ?

Ihe Baịbụl kwuru

Chineke ejighị ndụ mmadụ egwu egwu. Otú o si were ndụ dimkpa ka o si were nke nwa e bu n’afọ. Chineke nyere Devid ike mmụọ nsọ ya, ya ekwuo sị: “Anya [Chineke] hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ.” (Abụ Ọma 139:16) Chineke kwuru na onye ọ bụla merụrụ nwa e bu n’afọ ahụ́ ga-aza ajụjụ maka ihe o mere. O wekwaara ya na onye gburu nwa e bu n’afọ egbuola ọchụ.—Ọpụpụ 20:13; 21:22, 23.

Ma, ọ bụrụ na nwaanyị enwee nsogbu mgbe ọ na-amụ nwa, ọ bụ nwaanyị ahụ na di ya ga-ekpebi ma à ga-azọwa ndụ nke ya ka à ga-azọwa nke nwa ha.