Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Ka Ịmụ Mmadụ Ọzọ Pụtara?

Gịnị Ka Ịmụ Mmadụ Ọzọ Pụtara?

Ihe Baịbụl kwuru

Okwu bú “ịmụ ọzọ” pụtara na onye a mụrụ ọzọ na Chineke ga-amalite inwe mmekọrịta ọhụrụ. (Jọn 3:3, 7) Chineke weere ndị a mụrụ ọzọ ka ụmụ ya. (Ndị Rom 8:15, 16; Ndị Galeshia 4:5; 1 Jọn 3:1) Ọ bụrụ na mmadụ kpọta nwa na-abụghị nke ya ma were ya mere nwa, nwa ahụ na-esozi ná ndị ezinụlọ ya. Ọ bụ otú ahụ ka ndị a mụrụ ọzọ si soro ná ndị ezinụlọ Chineke.2 Ndị Kọrịnt 6:18.

Gịnị mere e ji amụ mmadụ ọzọ?

Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke.” (Jọn 3:3) Ihe a pụtara na ịmụ mmadụ ọzọ ga-eme ka onye ahụ soro ná ndị ga-eso Kraịst chịa n’Alaeze Chineke. Alaeze ahụ ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo na ndị a ‘mụrụ ọzọ’ nwere ihe nketa ‘e debeere ha n’eluigwe.’ (1 Pita 1:3, 4) A na-emekwa ka o doo ha anya na ha na Kraịst ‘ga-achị achị dị ka ndị eze.’2 Timoti 2:12; 2 Ndị Kọrịnt 1:21, 22.

Olee otú e si amụ mmadụ ọzọ?

Mgbe Jizọs na-ekwu banyere ịmụ mmadụ ọzọ, o kwuru na ọ bụ “mmiri na mmụọ nsọ” ka a ga-eji mmụọ mmadụ ọzọ. (Jọn 3:5) Ihe okwu ya pụtara bụ na e jiri mmiri mechaa onye ahụ baptizim, e jirikwa mmụọ nsọ mee ya baptizim.Ọrụ Ndịozi 1:5; 2:1-4.

Ọ bụ Jizọs bụ onye mbụ a mụrụ ọzọ. Mgbe e mechara ya baptizim n’Osimiri Jọdan, Chineke ji mmụọ nsọ tee ya mmanụ (ma ọ bụ mee ya baptizim). A mụziri Jizọs ọzọ, ya enweekwa olileanya ịlaghachi n’eluigwe. (Mak 1:9-11) Chineke mere ka ọ laghachi n’eluigwe mgbe ọ kpọlitere ya n’ọnwụ, ya abụrụzie mmụọ n’eluigwe.Ọrụ Ndịozi 13:33.

E jikwa mmiri mee ndị ọzọ a mụrụ ọzọ baptizim tupu ha anata mmụọ nsọ. * (Ọrụ Ndịozi 2:38, 41) O meziri ka ha nwee olileanya siri ike na ha ga-aga eluigwe mgbe Chineke ga-akpọlite ha n’ọnwụ.1 Ndị Kọrịnt 15:42-49.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ụfọdụ chere banyere ịmụ mmadụ ọzọ

Ụgha: A ga-amụrịrị mmadụ ọzọ ka e wee zọpụta onye ahụ ma ọ bụ tupu onye ahụ abụrụ Onye Kraịst.

Eziokwu: Àjà Kraịst chụrụ bụ maka ịzọpụta ndị a mụrụ ọzọ ka ha soro Kraịst chịa n’eluigwe nakwa ịzọpụta ndị Alaeze Chineke ga-achị n’ụwa. (1 Jọn 2:1, 2; Mkpughe 5:9, 10) Ndị ahụ Alaeze Chineke ga-achị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-abụ Paradaịs.Abụ Ọma 37:29; Matiu 6:9, 10; Mkpughe 21:1-5.

Ụgha: Mmadụ nwere ike iji aka ya họpụta onwe ya ka a mụọ ya ọzọ.

Eziokwu: Chineke na-enye mmadụ niile ohere ka ha na ya dị ná mma, ka e wee zọpụta ha. (1 Timoti 2:3, 4; Jems 4:8) Ma, ọ bụ Chineke ji aka ya ahọrọ ndị a ga-amụ ọzọ, ya bụ, ndị ọ ga-eji mmụọ nsọ tee mmanụ. Baịbụl kwuru na ịmụ mmadụ ọzọ adabereghị “n’onye na-achọ ma ọ bụ n’onye na-agba ọsọ,” kama ọ dabeere na Chineke. (Ndị Rom 9:16) Okwu bụ́ “ịmụ ọzọ” nwekwara ike ịpụta “isi n’elu mụọ mmadụ.” Nke a gosiri na ọ bụ Chineke na-ahọrọ ndị a ga-amụ ọzọ.

^ para. 9 Ọ bụ naanị Kọnịliọs na ndị gbakọtara n’ụlọ ya ka e bu ụzọ jiri mmụọ nsọ tee mmanụ tupu e jiri mmiri mee ha baptizim.Ọrụ Ndịozi 10:44-48.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Baptizim na Mmekọrịta Gị na Chineke

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Ihe Mgbapụta Ahụ—Onyinye Kasịnụ Chineke Nyere

Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?