Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Nzọpụta?

Gịnị Bụ Nzọpụta?

Ihe Baịbụl kwuru

Na Baịbụl, “zopụta” na “nzọpụta” pụtara inyere mmadụ aka ịpụta ná nsogbu ma ọ bụ n’ihe nwere ike ịla onye ahụ n’iyi. (Ọpụpụ 14:13, 14; Ọrụ Ndịozi 27:20) Ma ọtụtụ mgbe, ọ na-apụtakarị ịnapụta mmadụ ná mmehie. (Matiu 1:21) Ebe ọ bụ mmehie na-akpata ọnwụ, ndị a zọpụtara ná mmehie nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi.Jọn 3:16, 17. *

Gịnị ka ị ga-eme ka a zọpụta gị?

Ihe ị ga-eme ka a zọpụta gị bụ inwe okwukwe na Jizọs na ịna-erube isi n’iwu ya.Ọrụ Ndịozi 4:10, 12; Ndị Rom 10:9, 10; Ndị Hibru 5:9.

Baịbụl gosiri na okwukwe gị kwesịrị inwe ọrụ, ya bụ, na i kwesịrị ịna-eme ihe ga-egosi na i nwere okwukwe. (Jems 2:24, 26) Ma, ọ pụtaghị na nzọpụta bụ ihe ị ga-ejili aka gị rụta. Kama, nzọpụta bụ “onyinye Chineke” nke si ‘n’obiọma na-erughịrị mmadụ,’ ma ọ bụ “amara” Chineke.Ndị Efesọs 2:8, 9; Bible Nsọ nke Union Version.

È nwere ike imecha ghara ịzọpụta Onye Kraịst?

Ee. A gụpụta onye mmiri na-eri, o nwere ike ịdabakwa ná mmiri. Otú ahụ ka ọ dịkwa ma a zọpụta mmadụ ná mmehie. Ọ bụrụ na onye ahụ akwụsị ime ihe gosiri na o nwere okwukwe, e nwere ike imecha ghara ịzọpụta ya. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji gbaa Ndị Kraịst a zọpụtarala ume ka ‘ha lụsie ọgụ ike maka okwukwe ahụ.’ (Jud 3) Ọ dọkwara ndị a zọpụtarala aka ná ntị, sị: “Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.”Ndị Filipaị 2:12.

Ọ̀ bụ Chineke bụ Onye Nzọpụta ka ọ̀ bụ Jizọs?

Baịbụl kpọrọ Chineke “Onye Nzọpụta” ọtụtụ ugboro iji gosi na ọ bụ ya ka nzọpụta si n’aka. (1 Samuel 10:19; Aịzaya 43:11; Taịtọs 2:10; Jud 25) Chineke jikwa ụfọdụ ụmụ nwoke zọpụta ndị Izrel n’oge ochie. Baịbụl kpọkwara ndị ahụ “ndị nzọpụta.” (Nehemaya 9:27; Ndị Ikpe 3:9, 15; 2 Ndị Eze 13:5) * Baịbụl kpọkwara Jizọs Kraịst “Onye Nzọpụta” n’ihi na Chineke ji àjà Jizọs chụrụ napụta anyị n’aka mmehie.Ọrụ Ndịozi 5:31; Taịtọs 1:4. *

Ọ̀ bụ onye ọ bụla ka a ga-azọpụta?

Mba, a gaghị azọpụta ụfọdụ ndị. (2 Ndị Tesalonaịka 1:9) Mgbe otu nwoke jụrụ Jizọs, sị, “Ndị a ga-azọpụta hà dị ole na ole?” Ọ zara, sị: “Gbalịsienụ ike ka unu si n’ọnụ ụzọ dị warara banye, n’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị ga-achọ ịbanye ma ha agaghị enwe ike.”Luk 13:23, 24.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ụfọdụ chere banyere nzọpụta

Ụgha: Ndị Kọrịnt nke Mbụ 15:22 kwuru na a ga-azọpụta mmadụ niile mgbe ọ sịrị na “a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst.”

Eziokwu: Ọ bụ mbilite n’ọnwụ ka a na-ekwu gbasara ya n’ebe a. (1 Ndị Kọrịnt 15:12, 13, 20, 21, 35) N’ihi ya, mgbe e kwuru na “a ga-eme ka mmadụ niile dị ndụ n’ime Kraịst,” ihe ọ pụtara bụ na ọ bụ àjà Jizọs Kraịst chụrụ ga-eme ka a kpọlite ha n’ọnwụ.Jọn 11:25.

Ụgha: Taịtọs 2:11 kwuru na a ga-azọpụta mmadụ niile n’ihi na ọ sịrị na Chineke “na-ewetara mmadụ niile nzọpụta.”Bible Nsọ nke Union Version.

Eziokwu: Okwu Grik e si sụgharịta “niile” n’amaokwu a nwekwara ike ịpụta “ụdị dị iche iche.” * N’ihi ya, otú e kwesịrị isi ghọta ihe Taịtọs 2:11 kwuru bụ na Chineke na-eme ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ma ndị “si ná mba niile na ebo niile na ndị niile na asụsụ niile.”Mkpughe 7:9, 10.

Ụgha: Pita nke Abụọ 3:9 na-akụzi na a ga-azọpụta mmadụ niile maka na ọ siri na Chineke ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla.’

Eziokwu: Chineke chọrọ ka a zọpụta ndị mmadụ, ma ọ naghị amanye ha amanye ka a zọpụta ha. ‘N’ụbọchị ikpe’ ya, ọ ga-ebibi “ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”2 Pita 3:7.

^ para. 3 Baịbụl na-ekwu na azọpụtala mmadụ n’agbanyeghị na mgbe a ga-anapụta onye ahụ kpamkpam n’aka mmehie na ọnwụ ka bụ n’ọdịnihu.Ndị Efesọs 2:5; Ndị Rom 13:11.

^ para. 10 N’ụfọdụ nsụgharị Baịbụl Bekee, kama ide “onye nzọpụta” n’amaokwu ndị ahụ, ha dere “onye mmeri,” “dike,” “onye ndú,” ma ọ bụdị “otu onye.” Ma n’asụsụ Hibru e ji dee Baịbụl, ọ bụ otu okwu ahụ ka e dere mgbe a na-ekwu maka ụmụ mmadụ ndị zọpụtara ndị ọzọ nakwa mgbe a na-ekwu na Jehova Chineke bụ Onye nzọpụta.Abụ Ọma 7:10.

^ para. 10 Ebe e si nweta aha ahụ bụ́ Jizọs bụ n’okwu Hibru bụ́ Yehoh·shuʹaʽ, nke pụtara “Jehova Bụ Nzọpụta.”

^ para. 17 Gụọ akwụkwọ bụ́ Vine’s Complete Expository Dictionary of Old and New Testament Words. Otu okwu Grik ahụ dị na Matiu 5:11, bụ́ ebe Jizọs kwuru na ndị mmadụ ga-ekwu “ụdị ihe” ọjọọ niile megide ndị na-eso ụzọ ya.International Standard Version.

GỤKWUO GBASARA YA

Ihe Mere Mgbapụta Ji Dị Anyị Mkpa

Ebe ọ bụ na Chineke hụrụ anyị n’anya, ọ̀ ga-eke anyị otú ọ ga na-agụ anyị agụụ ịdị ndụ ebighị ebi ma meekwa ka anyị ghara ịdị ndụ ebighị?