Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Mmehie?

Gịnị Bụ Mmehie?

Ihe Baịbụl kwuru

Mmehie bụ ihe ọ bụla mmadụ mere ma ọ bụ ihe ọ bụla mmadụ chere n’obi ya nke megidere iwu Chineke. Ọ pụtara mmadụ imebi iwu Chineke ma ọ bụ ime ihe na-adịghị mma n’anya Chineke. (1 Jọn 3:4; 5:17) Baịbụl kwukwara na ọ bụrụ na mmadụ ahapụ ime ihe ọ ma na ọ dị mma, ọ bụụrụ onye ahụ mmehie.Jems 4:17.

N’asụsụ ndị mbụ e ji dee Baịbụl, okwu e si sụgharịta mmehie pụtara mmadụ ịgbajọ akụ́ ma ọ bụ ụta. Dị ka ihe atụ, n’oge ụmụ Izrel, e nwere ndị agha ma otú e si eji nkume agba ihe, “ha adịghị agbajọ” ya. A sị ka e kwuo ya otú ndị Hibru si ekwu ya, ọ ga-abụ “ha adịghị eme mmehie.” (Ndị Ikpe 20:16) N’ihi ya, ime mmehie pụtara mmadụ ịhapụ ime ihe Chineke chọrọ.

Ebe ọ bụ Chineke kere anyị, o bụ ya kwesịrị ịna-agwa anyị ihe anyị ga na-eme. (Mkpughe 4:11) Anyị ga-azakwa ya ajụjụ banyere ihe ndị anyị mere.Ndị Rom 14:12.

È nwere otú anyị ga-esi zere ime mmehie kpamkpam?

Mba. Baịbụl kwuru na “mmadụ niile emehiewo, ha adịghịkwa eru ebube Chineke.” (Ndị Rom 3:23; 1 Ndị Eze 8:46; Ekliziastis 7:20; 1 Jọn 1:8) Gịnị mere o ji dị́ otú ahụ?

Adam na Iv, bụ́ ndị mbụ Chineke kere, abụghị ndị mmehie ná mmalite. Ọ bụ n’ihi na ha zuru oké. Chineke kere ha n’onyinyo ya. (Jenesis 1:27) Ma, ha nupụụrụ Chineke isi, gharazie izu okè. (Jenesis 3:5, 6, 17-19) Mgbe ha mụrụ ụmụ, ha bufere ha ezughị okè na mmehie. (Ndị Rom 5:12) Eze Devid kwuru, sị: “Ebu m njehie pụta mgbe a mụpụtara m site n’ihe mgbu.”Abụ Ọma 51:5.

È nwere mmehie ndị ka ibe ha njọ?

Ee. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ndị Sọdọm ‘dị njọ na-emekwa mmehie dị́ oké njọ.’ (Jenesis 13:13; 18:20) Lee ihe atọ na-ekpebi otú mmehie dịruru ná njọ.

  1. Otú ọ jọruru njọ. Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị ka anyị zere mmehie ndị dị́ oké njọ dị ka mmekọahụ rụrụ arụ, ikpere arụsị, izu ohi, ịnụbiga mmanya óké, ịnara mmadụ ihe n’ike, igbu ọchụ na ime mgbaasị. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11; Mkpughe 21:8) Baịbụl gosiri na mmehie ndị a dị iche ná mmehie ndị mmadụ na-echeghị echiche ma ọ bụ na-akpacharaghị anya mee, dị ka, ime ma ọ bụ ikwu ihe ga-ewute ndị ọzọ. (Ilu 12:18; Ndị Efesọs 4:31, 32) Ma, Baịbụl gbara anyị ume ka anyị ghara iwere mmehie ọ bụla ka ihe na-enweghị ihe ọ bụ n’ihi na o nwere ike ime ka anyị mee nke dị́ oké njọ.Matiu 5:27, 28.

  2. Ihe e bu n’obi mee ya. Ụfọdụ ndị na-eme mmehie n’ihi na ha amaghị ihe iwu Chineke kwuru. (Ọrụ Ndịozi 17:30; 1 Timoti 1:13) Ọ bụ eziokwu na Baịbụl anaghị ekwu na mmehie ndị ahụ dị mma, kama o gosiri na ọ dị iche ná mmehie ndị nke mmadụ kpachaara anya mee. (Ọnụ Ọgụgụ 15:30, 31) Ọ bụ ndị nwere ‘ajọ obi’ na-akpachara anya eme mmehie.Jeremaya 16:12.

  3. Ugboro ole e mere ya. Baịbụl gosikwara na e nwere ihe dị iche ná mmehie mmadụ mere otu ugbo na mmehie mmadụ na-eme ugboro ugboro. (1 Jọn 3:4-8) Chineke ga-ebibi ndị kpachaara anya na-eme mmehie n’agbanyeghị na ha amụtala otú ha ga-esi na-eme ihe dị́ mma.Ndị Hibru 10:26, 27.

Mmehie dị oké njọ mmadụ mere nwere ike ịna-ewute onye ahụ, obi ya ana-ama ya ikpe. Dị ka ihe atụ, Eze Devid dere, sị: “Njehie m erikpuwo isi m; dị ka ibu dị arọ, ọ dị arọ nke na agaghị m ebuli ya.” (Abụ Ọma 38:4) Ma, Baịbụl gosiri na olileanya dị. Ọ sịrị: “Ka onye ajọ omume hapụ ụzọ ya, ka onye ọjọọ kwụsị iche echiche ọjọọ ya. Ya laghachikwuru Jehova, bụ́ onye ga-emere ya ebere, ya laghachikwuru Chineke anyị, n’ihi na ọ ga-agbaghara ya mmehie ya n’ụzọ dị ukwuu.”Aịzaya 55:7.

GỤKWUO GBASARA YA

I Nwere Ike Imeri Ọnwụnwa

Ihe atọ ga-enyere gị aka imeri ọnwụnwa.

Chineke Ọ̀ Ga-enyere M Aka Ma M Kpee Ekpere?

Nsogbu anyị hà na-emetụ Chineke n’obi?

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.