Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?

Gịnị Bụ Mkpụrụ Obi?

Ihe Baịbụl kwuru

Ọ bụ okwu Hibru bụ́ neʹphesh nakwa nke Grik bụ́ psy·kheʹ ka a sụgharịrị mkpụrụ obi na Baịbụl. A sụgharịa neʹphesh otú e si dee ya n’asụsụ Hibru, ihe ọ pụtara bụ “ihe e kere eke na-eku ume,” psy·kheʹ apụta “onye dị ndụ.” * N’ihi ya, mkpụrụ obi bụ mmadụ na ihe niile dị ya n’ahụ́, ọ bụghị ihe na-esi mmadụ n’ahụ́ pụọ gaa dịrị ndụ ebe ọzọ ma onye ahụ nwụọ. Ka anyị leba anya n’ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru gosiri na mkpụrụ obi mmadụ bụ onye ahụ na ihe niile dị ya n’ahụ́:

E tinyeghị mkpụrụ obi n’ime Adam, kama “ọ ghọrọ mkpụrụ obi dị́ ndụ”

  • Baịbụl kwuru na mgbe Jehova kechara nwoke mbụ bụ́ Adam, Adam ghọrọ “mkpụrụ obi dị ndụ.” (Jenesis 2:7, Bible Nsọ nke Union Version) E tinyeghị mkpụrụ obi n’ime Adam, kama ọ ghọrọ mkpụrụ obi dị́ ndụ, ma ọ bụ mmadụ dị́ ndụ.

  • Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi nwere ike ịrụ ọrụ, o nwere ike imetụ ozu aka, agụụ nwere ike ịgụ ya. O kwukwara na mkpụrụ obi na-eri nri, na-erubekwa isi n’iwu. (Levitikọs 5:2; 7:20; 23:30; Diuterọnọmi 12:20; Ndị Rom 13:1) Ọ bụ mmadụ nwere ike ime ihe ndị a, ọ bụghị ihe dị́ n’ime mmadụ.

Ọ̀ bụ eziokwu na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ?

Mba, mkpurụ obi na-anwụ anwụ. E nwere ọtụtụ ebe na Baịbụl kwuru na mkpụrụ obi na-anwụ anwụ. Lekwa ụfọdụ n’ime ha:

  • “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.”Ezikiel 18:4, 20, Bible Nsọ nke Union Version.

  • N’Izrel oge ochie, ahụhụ kacha njọ a na-ata onye mere mmehie dị oké njọ bụ na ‘a ga-ebipụ mkpụrụ obi ahụ.’ (Levitikọs 19:8, Bible Nsọ nke Union Version) “A ga-egbu” onye ahụ.Ọpụpụ 31:14, Bible Nsọ Ọhụụ.

  • N’amaokwu ụfọdụ na Baịbụl, a kpọrọ ozu “mkpụrụ obi nwụrụ anwụ.” (Levitikọs 21:11; Ọnụ Ọgụgụ 6:6) Ọ bụ eziokwu na ihe e dere n’ọtụtụ Baịbụl n’amaokwu ndị ahụ bụ “ozu” ma ọ bụ “mmadụ nwụrụ anwụ,” ọ bụ neʹphesh ma ọ bụ “mkpụrụ obi” ka e dere na ha mgbe a na-ede Baịbụl n’asụsụ Hibru.

“Mkpụrụ obi” pụtakwara “ndụ”

Na Baịbụl, ihe ọzọ a na-akpọ “mkpụrụ obi” bụ “ndụ.” Dị ka ihe atụ, na Job 33:22, a sụgharịrị okwu Hibru ahụ bụ́ neʹphesh “mkpụrụ obi,” sụgharịakwa okwu ya na ya yiri “ndụ.” Baịbụl gosikwara na mmadụ nwere ike itufu mkpụrụ obi ya ma ọ bụ ndụ ya, ma ọ bụ tinye ya n’ihe ize ndụ.Ọpụpụ 4:19; Ndị Ikpe 9:17; Ndị Filipaị 2:30.

Ebe ọ bụ na “mkpụrụ obi” pụtara “ndụ,” ọ gaghị esiri anyị ike ịghọta ihe Baịbụl na-ekwu mgbe ọ sịrị na mkpụrụ obi “na-apụ” ma ọ bụ “pụwara.” (Jenesis 35:18; Bible Nsọ nke Union Version) Ihe okwu ahụ pụtara bụ na onye ahụ anwụwala. Otú ụfọdụ Baịbụl si sụgharịa ihe a e dere na Jenesis 35:18 bụ “mgbe ọ na-ekubi ume.”Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik; Bible Nsọ Ọhụu.

Ebee ka nkụzi ahụ bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ si?

Ọ bụghị na Baịbụl ka chọọchị ndị na-akụzi na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ si nweta ihe ha na-akụzi, kama ọ bụ n’ihe ndị ọkà mmụta e nwere n’oge ochie na Gris kụziri. Otu akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru, sị: “Ebe dị iche iche Baịbụl kpọrọ mkpụrụ obi aha bụ ume ndụ ka ọ na-ekwu maka ya. O nweghị mgbe o kwuru na e nwere mkpụrụ obi a na-anaghị ahụ anya nke dị́ iche na mmadụ a na-ahụ anya. Ọ bụ n’ihe ndị Gris oge ochie kụziri ka ndị chọọchị gbakwasịrị ụkwụ na-akụzi na e nwere ihe dị́ iche n’ahụ́ mmadụ na mkpụrụ obi ya.”

Chineke achọghị ka e were echiche mmadụ gwakọta n’ihe e dere n’Okwu ya, bụ́ Baịbụl, dị́ ka nkụzi ahụ bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ. Kama nke ahụ, Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị, sị: “Nọrọnụ na nche: ma eleghị anya, a pụrụ inwe onye ga-eburu unu dị ka anụ oriri ya site na nkà ihe ọmụma na aghụghọ efu, dị ka ọdịnala mmadụ si dị.”Ndị Kọlọsi 2:8.

^ para. 3 Gụọ akwụkwọ aha ya bụ The New Brown, Driver, and Briggs Hebrew and English Lexicon of the Old Testament, peeji nke 659, nakwa nke aha ya bụ Lexicon in Veteris Testamenti Libros, peeji nke 627. Ọtụtụ Baịbụl sụgharịrị okwu bụ́ neʹphesh na psy·kheʹ “mkpụrụ obi,” “ndụ,” “mmadụ,” “ihe e kere eke,” ma ọ bụ “ahụ́” n’ebe dị iche iche n’adabere n’ihe a na-ekwu.