Gaa n'Isiokwu

Gaa na menu nke abụọ

Ndịàmà Jehova

Igbo

Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

Gịnị Bụ Mbilite n’Ọnwụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Na Baịbụl, okwu Grik a sụgharịrị “mbilite n’ọnwụ” bụ a·naʹsta·sis. Okwu Grik a pụtara “ibili” ma ọ bụ “iguzoro ọtọ ọzọ.” N’ihi ya, mbilite n’ọnwụ pụtara ime ka mmadụ si n’ọnwụ bilie ma ọ bụ isi n’ọnwụ kpọlite mmadụ, ya amalitekwa ịdị ndụ otú ọ dịbu.1 Ndị Kọrịnt 15:12, 13.

N’agbanyeghị na okwu bụ́ “mbilite n’ọnwụ” adịghị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ọtụtụ ndị na-akpọ Agba Ochie, ihe ndị ọzọ e kwuru na ya gosiri na a ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Dị ka ihe atụ, Chineke si n’ọnụ Hosia onye amụma kwe nkwa, sị: “M ga-agbapụta ha n’aka Shiol [ya bụ, Ili]; m ga-agbapụta ha n’aka ọnwụ.”Hosia 13:14; Job 14:13-15; Aịzaya 26:19; Daniel 12:2, 13.

Ebee ka ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-anọ? Ụfọdụ n’ime ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-aga eluigwe soro Kraịst chịwa. (2 Ndị Kọrịnt 5:1; Mkpughe 5:9, 10) Baịbụl kwuru na mbilite n’ọnwụ nke a bụ “mbilite n’ọnwụ mbụ” ma ọ bụ “mbilite n’ọnwụ bu ụzọ.” Okwu abụọ a gosiri na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ ọzọ. (Mkpughe 20:6; Ndị Filipaị 3:11) Mbilite n’ọnwụ ọzọ a ga-abụ maka ndị ga-ebi n’ụwa. Ọ bụ n’ụwa a ka ọtụtụ ndị nwụrụ anwụ a ga-akpọlite ga-anọ.Abụ Ọma 37:29.

Olee otú a ga-esi akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Chineke nyere Jizọs ike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. (Jọn 11:25) Jizọs ga-eme ka “ndị niile nọ n’ili ncheta” sí n’ọnwụ bilie. Onye nke ọ bụla n’ime ha ga-abụ onye ọ bụbu tupu ya anwụọ, nwee àgwà ndị e ji mara ya, marakwa ihe niile ọ mabụ. (Jọn 5:28, 29) Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe ga-enwe ahụ́ mmụọ, ma ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa ga-enwe ahụ́ mmadụ, ahụ́ ga-agbasikwa ha ike.Aịzaya 33:24; 35:5, 6; 1 Ndị Kọrịnt 15:42-44, 50.

Ole ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ? Baịbụl kwuru na a “gaje inwe mbilite n’ọnwụ nke ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume.” (Ọrụ Ndịozi 24:15) Ndị ezi omume a bụ ndị ji obi ha niile fee Chineke, dị ka Noa, Sera, na Ebreham. (Jenesis 6:9; Ndị Hibru 11:11; Jems 2:21) Ndị ajọ omume bụ ndị na-emeghị uche Chineke maka na a kụzighịrị ha ihe Chineke chọrọ ka ha mee.

Ma, a gaghị akpọlite ndị ime ihe ọjọọ riri ahụ́ nke na ha agaghị echegharili. Ọ bụrụ na ndị ajọ omume dị́ otú a anwụọ, ha anwụọla ọnwụ ebighị ebi. Olileanya mbilite n’ọnwụ adịkwaraghị ha.Matiu 23:33; Ndị Hibru 10:26, 27.

Olee mgbe a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Baịbụl buru amụma na ọ bụ n’oge ọnụnọ Kraịst, nke malitere n’afọ 1914, ka a ga-amalite ịkpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’eluigwe. (1 Ndị Kọrịnt 15:21-23) Ọ bụ mgbe Jizọs Kraịst ga-achị ụwa otu puku afọ, ya bụ, mgbe a ga-eme ka ụwa ghọọ paradaịs, ka a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ ka ha dịrị ndụ n’ụwa.Luk 23:43; Mkpughe 20:6, 12, 13.

Gịnị mere anyị ji kwesị ikweta na a ga-akpọlite ndị mmadụ n’ọnwụ? Baịbụl kọrọ banyere mmadụ itoolu a kpọlitere n’ọnwụ. Ndị mmadụ hụkwara mgbe a kpọlitere ha. (1 Ndị Eze 17:17-24; 2 Ndị Eze 4:32-37; 13:20, 21; Luk 7:11-17; 8:40-56; Jọn 11:38-44; Ọrụ Ndịozi 9:36-42; Ọrụ Ndịozi 20:7-12; 1 Ndị Kọrịnt 15:3-6) Mbilite n’ọnwụ kacha pụọ iche bụ nke Lazarọs. O ruola ụbọchị anọ ọ nwụrụ tupu Jizọs akpọlite ya. Ìgwè mmadụ nọkwa ya mgbe Jizọs kpọlitere ya n’ọnwụ. (Jọn 11:39, 42) Ndị iro Jizọs enwedịghị ọnụ ha ga-eji ekwu na a kpọliteghị Lazarọs n’ọnwụ. Ọ bụ ya mere ha ji kpaa nkata otú ha ga-esi egbu ma Jizọs ma Lazarọs.Jọn 11:47, 53; 12:9-11.

Baịbụl kwuru na Chineke nwere ikike ọ ga-eji akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ọ chọkwara ịkpọlite ha. Ọ na-echeta ihe niile gbasara onye ọ bụla ọ ga-akpọlite n’ọnwụ, o nweghịkwa ihe ọ na-enweghị ike ime. (Job 37:23; Matiu 10:30; Luk 20:37, 38) Chineke ga-akpọliteli ndị nwụrụ anwụ, ọ chọkwara ịkpọlite ha. Mgbe Baịbụl na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ, o kwuru na ‘agụụ ọrụ aka Chineke ga-agụsi ya ike.’Job 14:15.

Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere mbilite n’ọnwụ

Ụgha: Mbilite n’ọnwụ bụ mkpụrụ obi na anụ ahụ́ ịbịakọta ọnụ.

Eziokwu: Baịbụl na-akụzi na mkpụrụ obi bụ mmadụ n’onwe ya, ọ bụghị ihe na-esi n’ahụ́ mmadụ pụọ mgbe onye ahụ nwụrụ. (Jenesis 2:7; Ezikiel 18:4) A kpọlite mmadụ n’ọnwụ, a naghị eweta mkpụrụ obi ya tinyeghachi ya n’ahụ́ ya; kama a na-ekegharị onye ahụ, ya abụrụ mkpụrụ obi dị́ ndụ.

Ụgha: A ga-akpọlite ụfọdụ ndị n’ọnwụ, bibiekwa ha ozugbo a kpọlitechara ha.

Eziokwu: Baịbụl kwuru na “ndị mere ajọ omume ga-enweta mbilite n’ọnwụ nke ikpe.” (Jọn 5:29) Ma, ọ bụ ihe ha mere mgbe a kpọlitechara ha ka a ga-eji kpee ha ikpe, ọ bụghị ihe ha mere tupu ha anwụọ. Jizọs kwuru, sị: “Ndị nwụrụ anwụ ga-anụ olu Ọkpara Chineke, ndị ṅakwara ntị ga-adị ndụ.” (Jọn 5:25) A ga-ede aha ndị ‘ṅara ntị’ ma ọ bụ ndị rubere isi n’ihe ha mụtara mgbe a kpọlitechara ha n’ọnwụ ‘n’akwụkwọ mpịakọta nke ndụ.’Mkpughe 20:12, 13.

Ugha: Ọ bu ahụ́ mmadụ nwe tupu ya anwụọ ka ọ ga-enwekwa ma a kpọlite ya n’ọnwụ.

Eziokwu: Mmadụ nwụọ, ahụ́ ya ga-ere, gbarie ma ghọọ ájá.—Ekliziastis 3:19, 20.

GỤKWUO GBASARA YA